Ibu m buru egbochighị m ịbụ 'Model' - Jennifer Enujiugha
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka, Chukwuname Obiejesi & Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist & Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos, Nigeria
Oge ọbụla e kwuru okwu ụmụnwaanyị na-arụ ọrụ igosipụta mma nke bekee na-akpọ 'modelling', ihe mbụ ga-agbata mmadụ n'obi bụ nwaanyị tara ahụ, mana Jennifer Enujiugha egosila na nke a abụghị eziokwu oge niile.
Nwaada Enujiugha buru ibu, mana ọ na-emekwa 'modelling' nke bekee na-akpọ 'plus size modelling'.
Na mkparịtaụka ya na BBC, ọ kọrọ akụkọ etu o si gabiga ọtụtụ mkparị nakwa nkatọ oge ọ na-eto eto n'ihi na o buru ibu.

Ebe foto si, Jenyzest
"Ndị mmadụ na-akpọ m iburu ibu, maọbụ akpa akpụ. Enweghị m ndị enyi n'ụlọakwụkwọ n'ihi mkparị, nke a mere ka obi na-ada m mba oge niile," ka o kwuru.
Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ na-amasị ya ịpụta n'onyonyo oge niile, ọ na-amasị ya ise foto ma na-egosi ndị mmadụ, mana ibu o buru mere o ji chee na ebumnobi ya ịbụ 'model' nwereike ọ gaghị emezu.
"Otu ụbọchị, esonyere m n'otu asọmpi igosi mma, m wee gbaa onye nke atọ. Ha gwara m na m gaara enweta onye nke mbụ ma ọ bụrụ na mụ ebughi ibu."
"Nke a mere m ji chọwa etu m ga-esi taa ahụ. Ebidoro m ibu ọnụ na ime ihe ndị ọzọ dị icheiche, mana kama m ga-ata ahụ, ebutere m ọrịa ọnya afọ (ulcer)."
"M wee kwụsị ibu ọnụ ma kpebie iwere onwe m etu m dị ma na-enwekwa aṅụrị n'ahụ m," Jennifer Enujiugha kwuru.
'Ashley Graham bụ onye m kacha elegara anya'

Ebe foto si, Getty Images/Jenyzest
Nwaada a gara n'ihu kwuo na otu onye na-enye ya njalite mmụọ n'ọrụ a bụ 'plus size modelling' bụ nwaada mba UK aha ya bụ Ashley Grahams.
O kwuru na Grahams eruola n'ogogo niile mmadụ nwereike iru n'ọrụ 'modelling' n'agbanyeghị na o buru ibu.
"Ebe ọ bụ na o nwereike imenwu ya, mụ onwe m nwekwara ike imenwu ya," Enujiugha kwuru.
Gbasara ọrụ ndị ọ rụrụla nke o ji eme ọnụ, nwaada Enujiugha kwuru na ya esonyela n'emume 'Lagos Fashion Week', 'Accra Fashion Week', nakwa onyonyo egwu nke ụfọdụ ndị otiegwu a ma ama dịka Simi, Mayorkun, nakwa onyonyo azụmahịa nke ọtụtụ ụlọọrụ dị icheiche.
O kwukwara na ọ malitere emume a na-akpọ 'Plus Uncensored Fashion Show' iji kwalite ndị dịka ya buru ibu bụ ndị chọkwara ịrụ ọrụ ịchọ mma.
"Maka onye ọbụla na-agabiga mkparị maka etu ahụ ha dị, maka na ha buru ibu, ihe m ga-agwa gị bụ, obi adala gị mba, ọ bụghị gị kere onwe gị, itinye uchu n'ihe ị na-achụ, otu ụbọchị, ndị a kparịrị gị ga-abịa chọwa ọdịmma gị na ha."



