Workers Salary: Abia, Imo na Enugwu so steeti ebe e ji ndị ọrụ ha ụgwọ

Workers Salary: Abia, Imo na Enugwu so steeti ebe e ji ndị ọrụ ha ụgwọ
Nkọwa foto, Workers Salary: Abia, Imo na Enugwu so steeti ebe e ji ndị ọrụ ha ụgwọ
Lee ọnụọgụgụ steeti ndị ji ndị ọrụ ha ụgwọ ọnwa

N'ụbọchi olemaole gara aga ka ihe onyonyo nke ndị mmadụ sị na ọ bụ Bishọp ụka katolik bụ John Ebebe Ayah na-agwa gọvanọ Cross River steeti bụ Ben Ayade ka o were onyinye nde naịra iri abụọ na ise ọ chọrọ ịnye ụloụka were kwụọ ndị ọrụ eji ụgwọ ọnwa ha.

Lee ọnụọgụgụ steeti ndị ji ndị ọrụ ha ụgwọ ezumike nka
Nkọwa foto, Lee ọnụọgụgụ steeti ndị ji ndị ọrụ ha ụgwọ ezumike nka

Nke a mere ka ọtụtụ ndị eji ụgwọ ọnwa maọbụ ndị mara ndị e ji ha ụgwọ ọnwa bido kwusịwa okwu ike.

Sitere anyị ozi maọbụrụ na anyị edeghị aha steeti gị ebe a
Nkọwa foto, Sitere anyị ozi maọbụrụ na anyị edeghị aha steeti gị ebe a

Steeti ndị ji ndị ọrụ ha ụgwọ ọnwa karịa ọnwa isii

  • Abia
  • Edo
  • Enugu
  • Imo
  • Nasarawa
  • Ondo
  • Plateau
  • Taraba

Steeti ndị ji ndị ọrụ ha ụgwọ otu ọnwa ruo ise

  • Cross River
  • Delta
  • Benue
  • Adamawa
  • Kogi
Ndị ọrụ bekee e ji ụgwọ ọnwa

Ebe foto si, Nigeria Labour Congress

Ihe ndị NLC na-ekwu maka ụgwọ e ji ndị ọrụ

Ndị otu NLC

Ebe foto si, NLC Website

Benson Upah bụ ọnụ na-ekwuru otu Jịkọrọ ndị ọrụị Naijirịa bụ Nigeria Labour Confress (NLC) sị na ihe Bishọp Ebebe gwara Ayade maka onyinye ya juru ha afọ.

O kwuru sị, "Ya bụ okwu sitere n'obi ọcha pụta dị mma".

O kwuru na ọ dịghị mfe ịtụhapụ onyinye dị etu a ma sịkwa na ọ bụ ihe gosiri ezigbo nwafọ Naijirịa.

Upah kwuru sị, "Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ steeti ji ndị ọrụ ha ụgwọ ma kọwaa ihe mere o jiri dị etu a, Kama enweghị nkọwa ọbụla nwereisi kpatara ha jiri jide ego ndị ọrụ".

O kwuru na ọ bụ agwa ngalaba NLC akwadoghị n'ụzọ ọbụla.

O kwuru sị, " Mgbe onye ọrụ rụrụ ọrụ ya, ekwesịrị ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya, ọ dị n'akwụkwọ nsọ".

Upah kọwara sị, "Onye ọbụla bụ onye ọrụ nwere opekatampe mmadụ anọ na-elekwasị ya anya, ma ịkwụghị onye dị etu a ụgwọ ị na-emegide iwu ma na-emekpa kwa ndị ahụ ahụ".

O kwukwara na onye na-eji ndị ọrụ ya ụgwọ na-akwado ụbịam ma na-akwalite mpụ n'obodo.

O kwuo sị," Enweghị onye họpụtara mmadụ na ntuliaka ka ọ taa ya ahụhụ".

Upah kwuru na ha ndị Gọvanọ ndị a ji ụgwọ enweela mkparịtaụka kwamgbe kwamgbe ma ụfọdụ mgbe ha na ndị otu ha nọ na steeti ndị a emekwaala ngagharịiwe.

Abia Steeti na ndị ọrụ ha eji ụgwọ

Ndị ọrụ Abia Steeti na-eme ngagharịiwe
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Abia State Polytechnic nke dị n'Aba, Abia Steeti ejirila anya ha hụ ntị ha dịka gọọmentị akwubeghị ha ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa iti atọ.

N'ọnwa Juun ka Gọọmentị Abia steeti pụtara sị na ha ewepụtala nde N450m a ga-eji kwụọ ha ụgwọ ọnwa atọ eji ha, kama gọọmentịkwuru na ọ bụ onye ọnataego ụlọakwụkwọ ahụ ji ha ikwunye ya bụ ụgwọ n'ihi na ha enweghị ọbaego nke 'TSA" a ga-akwunye ya bụ ụgwọ.

E nyere onye ọnataego ụlọ akwụkwọ a otu abalị ka ọ mepee ya bụ ọbaego.

Onye ntakụkọ BBC nọ na steeti ahụ kwuru na ọnataego emepela ya bụ ọgaego ma ruo tata akụkọ na-apụta, enwebeghị onye ụlọọrụ ụloakwụkwọ a nweterela ụgwọ ọnwa ya.

Onye ntakụkọ a gụpụtara ụfodụ ngalaba ọrụ Abia Steeti eji ha ụgwọ ọnwa nke gụnyere Abia State Polythechnic, Abia State University, ngalaba Hospital Management Board, Abia State College of Education, dgz.

Ọ kọwara na ndị larala ezumike nka na steeti ahụ sokwa na ndị eji ụgwọ ọnwa olemaole.

BBC Igbo kpọtụrụ kọmịshọna mgbasa ozi Abia Steeti bụ Eze Chikamnaayọ kama ọzaghị ekwe ntị ya.

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, NCL website

Enugwu Steeti

N'Enugwu steeti , ndị kachasị ebe akwa arịrị maka ụgwọ eji ha bụ ndị laarala ezumike nka.

Otu onye rụụrụ steeti a ọrụ ma laa ezumike nka siri na ọgafeela otu afọ akwụsorola ha ụgwọ ezumike nka ha.

O kwuru sị, " Ọ bụ n'ọnwa Julai afọ 2022 ka ha kwụrụ anyị ụgwọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021"

Cheta na ndị nkuzi Prịmarị na steeti a gbara abụbọ ọrụ n'ihi na gọọmentị ekweghị ịkwụ ha ụgwọ opekete mpe ekwesịrị ịkwụ ha agbanyeghi na ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ na-anata ya bụ ụgwọ.

Ọ bụ n'ọnwa Mei, ụbọchị isii ya ka ha bidoro ya bụ abụbọ ọrụ ma kwụsị ya n'ụbọchị isii nke ọnwa Jun.

Kama kepu kepu na-ekwu na ha ebidola abụbọ ọrụ ọzo agbanyeghị na ụmụ akwụkwọ nọ ezumike ugbua.

BBC Kpọtụrụ onye ndụmọdụ gọvanọ steeti a maka mgbasa ozi bụ Steve Orurua, kama o kwuru na onweghị ike ikwu okwu ugbua.

Krọs Rịva Steeti

Gọvanọ Rivas Steeti bụ Ben Ayade bụ onye Bishop anabataghị onyinye ya ka ndị ngalaba dịka nke Trade Union Congress nke steeti ahụ na-ekwu na eji ndị ọrụ ha ụgwọ.

BBC kpọtụrụ Christian Ita bụ onye ode akwụkwọ pụrụiche maka mgbasa ozi nke steeti a n'ekwe ntị kama ọzaghị.

Benue Steeti

N'aka nke ọzọ ka Gọvanọ Benue steeti na-ekwu na ọ na-esiri steeti ya ike ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ.

O kwuru mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịta ụka na Benue Steeti n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun 2022 ma sị na ọ bụ dịka ọnụ ego eji arụ ọrụ gọọmentị, NNPC anaghị akwu ego nkwado ha kwesịri ịkwụ ma etu steeti ahụ anaghịzi enwe ike ịkpata ego nke ya.