Ihe ga-agbanwe ugbua NNPC bụrụla ụlọọrụ nọọrọ onwe ya (NNPC LTD)

Mkpughe NNPC Limited

Ebe foto si, nnpclimited/Twitter

Gọọmentị Naijirịa agbanweela ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Nigerian National Petroluem Corporation nke eji NNPC mara n’ịchafụ ka ọ bụrụ ụlọọrụ nke nọrọ onwe ya site n’atụmatụ bekee na-akpọ “Privatization”.

BBC Igbo kpọtụrụ ọkaibe n’ihe gbasara akụnụba na mmepe obodo bụ ọkankuzi Bongo Adi bụ onye nkuzi na Lagos Business School ka ọ kọwaa ihe ọ pụtara.

Aha onyonyo, Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọnụ mmanụ ụgbọala riri elu

Ihe isii ga-agbanwe ụgbụa NNPC bụzị ụlọọrụ nọọrọ onwe ya

mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Reuters

Nke mbụ ga-agbanwe bụ -

1) Bongo kwuru na otu ihe nke a pụtara bụ na gọọmentị kwesịrị ịsepụ aka n’etu ya bụ ụlọọrụ sị arụ ọrụ ma ugbua NNPC ga-abụzị ụlọọrụ nọrọ onwe ya ma na-achọ kwa uru nke ya.

2) Ọzọ bụ na gọọmentị ga-ewepụ ego ha kpọrọ ‘Equalization Fund’.

Gịnị bụ 'Equalization Fund'?

Equalizatoin Fund a bụ ego gọọmentị na-akwụ iji kwado orire mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ esi na mmanụ agbidi emepụta na Naijirịa.

Iji maa atụ; ọ na-abụkarị n’ọdọ mmiri nke Legọs ga-esi ebubata mmanụ ụgbọala tupu ọ gawa steeti ndị ọzọ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Kama mata na-ego ọ ga-efu ụgbọala gwongworo ịbụga mmanụ ụgbọala a na station ebe a na-ere ya na Legọs na nke dị na Abakiliki, Ebonyi Steti agaghị abụ otu ihe.

Ego nke Abakaliki ga-aka, n'ihi na ọtere aka karịa site n'ọdọ mmiri rụọ ebe a na-ere ya n'Ebonyi Steeti.

Equalization Fund bụ ego ahụ gọọmentị na-eji akwado ire mmanụ ụgbọala nke mere na ọ bụ otu ihe ka a na-ere ya na Naijirịa niile kama ọ ga-agbanwe ugbua.

3) Nke atọ bụ na a na-atụkwaanya na a ga-ere mmanụ ụgbọala na steeti ndị ọzọ ego dị iche iche.

4) Ugbua, a na-erezi mmanụ ụgbọala site na naịra otu narị na iri isii na ise gbagoo elu bụrụ otu narị naịra iri asatọ, nke a bụ maka atụmatụ a dịka gọọmentị wepụru ego Equalization Fund a.

5) Ọzọ bụ kwa na a na-atụanya na ọgaghị abụzị ndị ndọrondọrọ ọchịchị ga-arụzị ọrụ na NNPC kama ọ bụ ndị tozuru ma mara ihe ekwe na-akụ maka ụdịrị ụlọọrụ ahụ ga-arụzị ebe ahụ iji ritere ya uru.

Bongo kọwara sị "oteela aka a na-akwụ ndị ọrụ NNPC ụgwọ agbanyeghị na-enweghị ihe ọtụtụ n’ime ha na-arụ, n’ihi na igwe Refinary Naijirịa arụbeghị ọrụ kamgbe, ma na ugbua a na-eche na ha ga achụpụ ndị a".

6) Nke ọzọ abụrụ na NNPC ugbua ga-enwe ike ire oke nke bụ Shares na Bekee iji kpata ego ha ga-eji arụ ọrụ.

Lekwa ego NNPC kwuru na a ga-erzị mmanụ ụgbọala na Steeti dị iche iche
Nkọwa foto, Lekwa ego NNPC kwuru na a ga-erzị mmanụ ụgbọala na Steeti dị iche iche

Kama enwere ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ

Ebe a na-ere mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ebe a na-ere mmanụ ụgbọala

Dịka Bongo na-akọwa maka atụmatụ ọhụrụa, ọ nwee ụfọdụ ajụjụ ọ na-ajụ

Nke mbụ ọjụrụ bụ sị, “Ugbua a ọ bụrụ na gọọmentị agaghịzị akwụ Equalization Fund a, kedụ ihe ha ga-eji ya bụ ego a mee” E nwebeghị ihe ha gwra anyị maka ya.

Ọzọ abụrụ na ụlọọrụ ọbụla nọrọ onwe ya na-azụ ahịa n’ọdọ ahịa ebe ụlọọrụ ndị ọzọ yiri ya nọ, Kedụ ụlọọrụ ndị ọzọ ha na NNPC ga-ama aka n’ọdọ ahịa mmanụ agbidi?

Adị kọwara na ọ bụ ịma aka a nke bekee na-akpọ Competition na-eme ka ọnụ ego ihe ha na-ere dị ala ma gụnye kwa elele ndị ọzọ ọha mmadụ ga-erite n’aka ụlọrụ ndị a.

Ajụju ọzọ Adi jụrụ bụ sị, “ Onye ga-azụta oke NNPC ma ha rewa ya”.

O kwuru sị, ‘Enweghị ihe ọbụla NNPC na-arụpụta nke pụtara na oke ha agaghị amasị ọtụtụ ndị mmadụ ịzụta’.

ọ kọwakwara na enwekwaraike ọbụrụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ga-azụkọrọ oke NNPC ma erewa ya.