BudgIT ekwuola na Enugwu, Abịa na Anambra nwereike ịkwụrụ onwe ha ma e wezuga enyemaka Gọọmenti Etiti

Ebe foto si, Screenshot
A họpụtala steeti atọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke gụnyere Enugwu, Anambra na Abịa dịka steeti ndị nwereike ịkwụrụ onwe ma e wezuga ego ụlọọrụ Federation Account Allocation Committee (FAAC) na-amawapụtara steeti niile kwa ọnwa.
Ndekọ ụlọọrụ BudgIT wepụtara banyere steeti niile dị na Naịjirịa kwuru na Enugwu steeti pụtara dịka steeti kachasị nweeike ịkwụrụ onwe ha ma ghara ịtụkwasị obi n'ego Gọọmenti Etiti Naịjirịa.
Steeti ndị ọzọ ụlọọrụ ahụ kwukwara nwereike ịkwụrụ onwe ha na mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa gụnyere Legọs steeti na Kwara steeti bụ ndị mezuru ya steeti ise ndị ga-akachasị akwụrụ onwe ha n'agbanyeghị enyemaka FAAC.
Cheta na BudgIT bụ ụlọọrụ na-akwalite nkwụwaakaọtọ na inye ezi ngụkọ n'ụzọ gọọmenti si emefu ego, site n'iji teknụzụ apịakọta ozi ma mee ka o ruo n'aka ndị a na-achị achị.
Ihe ndekọ ahụ gosikwara steeti ndị nwereike ịnwụnyụ anya, ma ọ bụrụ na e wezuga ego ụlọọrụ FAAC na-amawapụtara steeti niile kwa ọnwa.
N'otu aka ahụ, steeti ndị a tụrụ anya nwereike ịtọgbọrọ ka ozu ma e wezuga enyemaka FAAC gụnyere Yobe steeti, Benue steeti, Jigawa steeti, Kogi steeti na Imo steeti.
BudgIT kwuru na nnyocha ha dabere n'ikike steeti dị iche iche nwere izute nsogbu ego ndị ha na-emefu kwa mgbe kwa mgbe site n'iji naanị ego ha na-akpatara onwe ha.
Ihe mere Enugwu, Abịa na Anambra Steeti sonye n'ọkwa a
Dịka nnyocha ụlọọrụ BudgIT siri kwuo Enugwu steeti gbara ndị nke mbụ site n'inweta akara 0.68, nke pụtara na pasenti iri isii na asatọ (68%) nke ego steeti ahụ kpataara onwe ya ga-ezu iji gboo mkpa ego ndị ha na-emefu kwa mgbe kwa mgbe.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Legọs steeti nwetara akara 0.83, Abịa steeti enweta 1.56, Anambra steeti enweta 1.66, ebe Kwara steeti nwetara akara 1.73.
N'afọ 2024, ego Enugwu steeti kpataara onwe ya sitere na ijeri naịra iri atọ ọ bụ n'ọnwa Mee wee ruo ihe karịrị otu narị ijeri naịra na iri asatọ na ngwụcha afọ ahụ.
E kwuru na nke a bụ n'ihi iji usoro tenkụzụ akwụ ụgwọ, mbọ ndị a na-agba igbochi ụzọ ego gọọmenti si apụ n'ụzọ na-ezighị ezi nakwa mbuli ụtụisi n'Enugwu steeti.
Nke a pụtara na steeti ndị a nwere ikike gụnyere:
* Ikike imezu ọrụ mmefu ego ugboro ugboro site na iji naanị ego ha kpatara n'onwa bụ IGR n'olu bekee.
*Steeti ndị a gosipụtakwara nwere onwe n'ego nke ukwuu pụtara na ha ga-enwe ndụ ogologo oge n'onwe ha.
*Ha anaghị adabere nnukwu n'ego nke ụlọọrụ Gọọmenti Etiti bụ FAAC na-enye steeti ọbụla ọnwa niile.
Cheta na ọ bụ Riva, Legos, Ogun, Anambra, na Krọss Riva bụ steeti ndị so n'ọkwa ise kachasị elu n'afọ 2024.
Yabụ na akụkọ nke afọ 2025 na-egosipụta mmụba ọnụọgụgụ maka steeti Enugwu n'ihe banyere nchịkọta ego na njikwa mmefu nke ọma.









