Etu otu nwoke, nwunye ya na ụmụ ha anọ si laa mmụọ n'otu ụbọchị n'Anambra Steeti

N'ọdị nso a ka akụkọ pụtara maka otu ezinaụlọ kpochapụrụ n'otu ụbọchị n'obodo Ozubulu nke dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo n'Anambra Steeti.

Ezinụlọ a gụnyere Nwoke aha ya bụ Augustine Tochukwu Nwokedi (dị afọ 41); nwunye ya bụ Josephine (dị afọ 39); na ụmụ ha anọ Chinaemerem (afọ 12), Chigozie (afọ 9), Chinazaekpere (afọ isii) na Chinaedum (afọ atọ).

Dịka akụkọ a pụtara, BBC Igbo gara Ozubulu iji mata etu mkpamkpa dị otu a jiri kpaa, nakwa ihe butere ọnwụ ha.

Otu onye ezinaụlọ nwoke ahụ ya na nwunye ya na ụmụ ya niile nwụrụ, gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2021.

Gịnị gburu ezinaụlọ a?

Nwoke ahụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru na ndị ụlọọgwụ chọpụtara na ọ bụ nsị ọnụ, bekee kpọrọ 'food poisoning', gburu Augustine na ndị ezinaụlọ ya.

Mana o kwuru na nnyocha ahụ ekwughị kpọmkwem ụdị nri ha riri nke kpatara ya bụ 'food poisoning'.

O kwuru na ọ bụ nri ọka, nke a na-akpọkwa 'Arịbọ', ka ezinaụlọ a riri tupu ha alabaa ụra.

Mana ka chi foro, a hụrụ ha ka ha na-agbọ agbọ na-anyụkwa anyụ.

Ndị agbataobi bugara ha n'otu ụlọọgwụ ebe a nọrọ nye ha ọgwụgwọ nwa mgbe nta tupu nwunye Augustine bụ Josephine, na ụmụ ha ndị nwoke atọ anwụọ.

E mechara buru Augustine na nwa ya nwaanyị gawa n'ụlọọgwụ 'Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital' dị na Nnewi, mana ha nwụrụ n'ụbọchị 12 nke Ọktoba, 2021.

BBC Igbo hụrụ akwụkwọ mpụtara nnyocha gbasara ọnwụ ndị a, nke bekee na-akpọ 'autopsy', nke kwuru na a chọpụtara akụrụngwa a na-akpọ 'dichlorvos' n'ọbara ha.

Oge anyị chọrọ na 'google' iji mata ihe bụ 'dichlorvos', o gosiri na ọ bụ akụrụngwa e ji emepụta ọgwụ e ji egbu ụmụ kịrịkịrị anụmanụ dịka ọchịcha, oke, na arụrụ ndị ọzọ.

Onye ezinụlọ Nwokedi ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka e mechaa nnyocha kpatara na elibeghị Augustine na nwunye ya bụ Josephine na otu nwa ha nwaanyị bụ Blessing, mana eliela ụmụ ha atọ bụ Chinaemelem, Chigozie na Chinaedum.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na a ga-eli Augustine na nwunye ya na nwa ha nwaanyị n'ụbọchị Tuzde, Nọvemba 29, 2022.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị ezinaụlọ Nwokedi kwuru na ndị uweojii mere nnyocha gbasara ọnwụ ndị a, mana ha enweghị ike ịchọpụta kpọmkwem etu nsi (poison) jiri banye na nri ahụ Augustine na ezinaụlọ ya riri nke butere ọnwụ ha.

N'ihi nke a, enweghị onye ndị uweojii jidere maka ọnwụ ndị ahụ.

Onye ọzọ bụkwa onye si n'ezinụlọ Nwokedi, aha ya bụ Pius Nwokedi, gwara onye ntaakụkọ anyị na ha anabatala ọdachi ahụ dakwasara ezinaụlọ ha dịka etu Chukwu si chọọ ya.

Mana o kwuru na ọ bụ ihe mwute na ndị ọchịchị obodo ha egosighi nnukwu mmasị ịchọpụta ihe kpatara ọnwụ Augustine, nwunye ya na ụmụ ha.