Ihe anyị ma maka alụmdi nwatakịrị nwaanyị Gọọmentị Enugwu kagburu

Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook na Screengrab
Onyonyo alụmdi na nwunye otu nwoke aha ya bụ Sopuluchukwu Odoh dị afọ iri atọ na atọ na nwata nwaanyị dị afọ iri na ise fegharịrị n'ịntaneti.
Ka akụkọ si kọọ, ebe ihe ahụ mere bu n'Amufe dị n'Enugwu-Ezike n'Ọkpuru Ọchịchị Igboeze-North dị n'Enugwu steeti.
O dobeghi anya mgbe alụmdi a mere mana kemgbe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya ma na-akpọ oku ka a kwụsị ime ka Tonawanda nta na-alụ di.
BBC Igbo chọpụtara na gọọmentị Enugwu steeti tinyere anya n'ihe mere.
Kedụ ihe Gọọmenti Enugwu steeti mere?

Ebe foto si, Government House Enugu
Gọọmenti Enugwu steeti sitere n'ụlọọrụ Kọmịshọna na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na ụmụaka n'Enugwu steeti bụ Ngozi Eni bụ onye mere ka a nwuchie nwoke ahụ lụrụ nwatakịrị, nwata ahụ nakwa ezinaụlọ nwata nwaanyị ahụ.
Ọ gara n'ihu gwa anyị na ha akagbuola alụmdinanwunye ahụ maka na nwa ahụ erubeghi ihe e ji nwaanyị eme.
Ngozi Eni kwuru nke a ka ụlọọrụ ya na ezinaụlọ ndị o metụtara nwechara ọgbakọ ma kọwara ha iwu ha dara dịka o si metụta ikike dịrị ụmụ ntakịrị.
Ọ sị na nwata nwaanyị ahụ gwara ha na ezinụlọ ya enweghị ego e ji ezigbo ya n'ụlọ akwụkwọ mere ha jiri chọọ ka ọ lụọ di ahụ.
Ka Gọọmenti Enugwu kagbuchara alụm di na nwunye ahụ, ha kwere nkwa na a ga-azụ nwata nwaanyị a n'ogoogo ọbụla ọ chọrọ ịgụ dịka nwata akwụkwọ.
Ihe mere nwa m nwoke ji lụọ Amarachi
Nne na nna nwoke lụrụ nwa afọ irí na atọ ahụ kọwara na ihe ha jiri chọọ ka ọ lụọ nwata nwaanyị ahụ bụ maka na ọ bụ otu nwa naanị ha mụrụ.
O nwere ọghọm dị n'ịlụ di na nwatakịrị?
Kọmịshọna na-ahụ maka odinamma ụmụnwaanyị na ụmụaka bụ Ngozi Eni, kwuru na ụlọ ọrụ ha ji ohere a kọwaa ọghọm dị na nwatakịrị dị na-erubeghị afọ iri na asatọ ịlụ dị mgbe ọ rubeghi.
Ọ sị na ọghọm dị na ya gunyere nwata ahụ ịnọ n'ụzọ ize ndụ ibute ọrịa a na-akpọ as VVF nakwa ọrị ure ime ukwu bụ 'cervical cancer' n'olu bekee.
Ọghọm ndị ọzọ gunyere nwatakịrị imeche na-ebi ndụ ịta onwe ya ụta nakwa ahụike akọ nụ uche ya na ihe ndị ọzọ.
Kedụ ka ọnọdụ si dị ugbua?
BBC Igbo kpokuru ndị uweojii, ma chọpụta na ọ bụghị ndị uweojii wuchiri ya bụ dị ọhụrụ a.
Kama ọ bụ na ministri na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyi na ụmụaka nyere ha mkpoku pụrụiche ka ezinaụlọ abụọ ahụ zara ọnụ ha, nke bụ ezịnaụlọ nke nwoke nakwa ezinaụlọ nke nwaanyị na ndị nyereaka hazie alụm di na nwunye ahụ.
Ha ka nọ n'ụlọọrụ mịnịstrị na-ahụ maka ihe gbasara ọdịmma ụmụnwaanyị, na ụmụaka b'Enugwu steeti.
Mana o dobeghị anya ihe gọọmenti Enugwu steetị ga-eme.
Ọtụtụ na-atụ egwu na gọọmenti nwere ịkpụpụ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ụlọikpe.
Ihe ọbụla mere, BBC Igbo ga-ewetere unu ka ọ si adị ọkụ.









