2024 World Tuberculosis Day: Ihe ị kwesịrị ịma maka ụkwara nta

Ebe foto si, Getty Images
Ka ụwa nile na-eme mmemme ịcheta ọrịa n'egbuegbu a kpọrọ ụkwara nta (ya bụ Tuberculosis na ọnụ bekee), ndị dọkịta mara ịhe ekwe na akụ kọwara ihe anyị kwesịrị ịmara banyere ya.
BBC Igbo gbara dọkinta na ahụ maka ahụ ike, ọkachasị ọrịa na efe-efe bụ dọkịta Jeff Okorie ajụjụ maka nkọwa ọrịa ụkwara nta. Ihe dokịnta kowara gụnyere ịhe na ebute ụkwara nta, ebe e si ebute ya, etu ndị mmadụ ga-esị zere ibute ya, na ihe mere o jịrị buru ọrịa na-egbuegbu.
Gịnị bụ Ụkwara nta?
Dọkịta Jeff Okorie kọwara ụbọchị nchete ụkwara nta bụ ụbọchị nke ịrị abụọ na anọ na ọnwa maachị dịka oge mba uwa nịle jịrị akọwa ma na ekụzịrị ndị mmadụ ịhe gbasara ọrịa ahụ.
Okerie gara nịrụ ma yekwa ndụmọdụ pụrụ iche ma kọwa ịhe mgbagwoju anya ndi mmadu nma enwe maka ya.
Tuberculosis ka ndị Igbo na akpọ ụkwara nta. Ndị ọkacha mara na ahụ ịke kwụrụ na ọ bụ ọrị na egbuegbu na ọ bụrụ na onye ọ na eme enweteghị ọgwụgwọ ọsịsọ.
Na okwu dọkịnta Jeff Okerịe “ụkwaranta bụ ọrịa na egbuegbu na agbanyịghị na ana agwọta ọnye ọ na arịa

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ka ụkwara nta sịrị egbu mmadu?
Dọkinta Okerịe kwurụ na “Ụkwara nta bụ ọrị kacha emetụta ngụgụ mmadụ. O nwere ịke ịmetụta ịhe ndị ọzọ na ahụ mmadụ dịka ụbụrụ, erịrị afọ nakwa akụkụ ọmụmụ ụmụ nwanyị”.
“ịhe ọ na eme bụ ịmebị akụkụ ahụ ndị ahụ dị ngụgụ na ndị ọzọ ma mee ka ha bịdọ bụnwe ịbụ na udu ha na ekwesịghị”.
“Ọ bụrụ na onye ahụ enweteghị ọgwọgwọ, ọnye ahụ nwere ịke ịwụ”
Ebee ka esiri ebute ụkwara nta?
Dọkinta Okorie kọwara na etu esịrị ebụta ukwara nta bụ na o nwee ka mmadu sịrị metu onye na arịa ọrịa ahụ ma ọ bụ ịhe sịrị na ahụ ya.
“ọ bụrụ na onye na arịa ụkwara nta see ụkwura, ọ na etịnye ịhe na ebunye ọrịa ahụ na ịkụku nke dị nọ ya nsọ ga ekụrụ na ịku ụme”
“e sị na ụkụ ume nwere ekụte ụkwara nta. Ọ bụ ọrịa na efe-efe nke mmadu na ebụnye ịbe ya”.
“Ọ bụrụ na ịnọrọ nsọ na onye nwere ụkwara nta, ị ga ebụte ngwangwa”.
Kedụ ihe mgbagwoju anya ndị mmadụ na enwe maka ụkwara nta?
Dọkịnta Okorie kwuru na “ịhe ọtụtụ mmadụ na eche mgbe ọbụla ha bụtere ụkwara nta bu na enyere ha nsị ma ọ bụ na a kọrọ ha ọgwụ”.
Mgbe ọ bụla ndị mmadụ bịdọrọ na akwapụta ọbala na ụkwara ha, ha na eche na ọ bụ ọgwụ ka a kọrọ ha.
Nke na eme ha kama ha ga aga na ụlọ ọgwụ, ha agawa na ụzọ omenaala.
“Ma na ịhe ndịa adaghị mma, ndị mmadu kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ”.
Kedụ ka e si amara onye butere Tuberculosis?
Ukwara nta na emetuta ngụgụ bụ nke na eme ka mmadu na ese ụkwara karịa abalị ịrị na asaa. Nke a na eme ka mmadụ kwapụta ọbala.
Enwere ịha aga a bụ ndị mmadu hụ ọ bụlụ na ha nwere ịke ịwe ọrịa ụkwara nta.
Okorie kwuru na “ịhe ndị ahụ abụghị ịhe emere nyọcha nwere hụ, ma na ọ bụ ịhe ọ ga abụ mmadu hụrụ na eme onye nwere ọrịa ahụ”.
“Onye ọbụla na ese ụkwara karịa abalị ịrị na asaa, na ata ahụ na amaghị-ama, ọkeghị ya erị nrị, ịme ahụ ịkpọ-ọkụ ọkachasị na abalị nakwa onye oke ọsụsọ na-agba; anyị na akpọ dịka ịhe na egọsị na mmadụ nwere ịke ịna arịa ọrịa ”
Ọrịa ụkwara nta ọ na agbasa efe ụtọtụ mmadụ?
Ụkwara nta ka na aganịrụ na agbasa ma na efe ndị mmadụ na ụwa nịle.
Naịjirịa sọ na mba atọ na ụwa bụ ebe ụkwara nta na egbụ ndị mmadụ.
Ndị nọ n´ ịme obodo na efe ndị agbataobi ha ụkwara nta maka na ha chere na ọ bụ ọgwụ ka a kọrọ ha maka na ha amaghị orịa na arịa ha.
Kedu ka ndị mmadụ ga esị gbọchịe ịbụte ụkwara nta?
E tụ ndị mmadụ ga esị gbọchịe ịbụte ụkwara nta bụ na ọbụrụ na ha gbọchịe ịhe nịle na akpata ya.
“onwere ihe gbasara gburugburu ebe obibi anyị sọ na eme ka mmadu bụte ụkwara nta. ịhe dịka ịbị na ebe mmadu karịrị.”
“Ekwesịrị ịnye ndị ọrụ ahụ ịke na agwọ ndị na arịa ụkwara nta akụrụ ngwa zụrụoke ka ha hara ịbụte ma ịkese ọrịa ahụ”
“ịme ka gburugburu dị ọcha sọ enyere aka. Onye na akwa ụkwara kwesịrị dịkpụchị ọnụ”.
Kedụ ndụmọdụ pụrụ iche ịga enye ndị mmadu
Dọkịnta Okerie gara nị ịrụ kwụọ na mmdụ bụtere ọrịa ụkwatra nta abụghị na onye ahụ anwụọla. Ọ kọwara dna ọ bụ ọrịa a ga agwọta ọkachasị na ọ bụlụ na ọnye ahụ ga na ụlọ ọgwụ na oge.
“A na agwọta ụkwara nta. Gọọmentị etịtị Naịjịrịa na enye ọgwụ ejị agwọ ụkwara nta na efụ. Ndị ụlọ ọgwụ adịghị ana ego nwere na agwọ onye nwere ụkwara nta na Naịjiria”
“Ọdịghị mma na anyị mara na ọgwụgwụ ụkwara nta bụ na efu mana ndị mmadụ ka na ebụte ọrịa ụkwara nta ma na anwụ maka ya”.
“ịhe ndị mmadụ kwesịrị ịme bụ na ọ dị ha ka ọrịa ha na arịa bụ ụkwara nta, ha aga a na ụlọ ọgwụ ebe aga eme nyọcha maka ya, ọ bụrụ na ọ bụ ọrịa ahụ a ga agwọ ha na efu”.
“Ọgwụ ejị agwọ ukwara nta dị, mana ọ dị mma na onye ana enyọenyọ na ọ na arịa ụkwara nta gara ụlọ ọgwụ na oge tụpụọ ọdị njọ”.
Kedụ ụlọ ọgwu a na eme nyọcha maka ụkwara nta?
Dọkịnta Okorie kwuru na ụlọ ọgwụ gọọmentị etịtị nakwa nke steeti nịle nwere ngara na ahụ maka ụkwara nta.
Ngaraba ụlọ ọgwụ ahụ na enyọcha ndị na arịa ọrịa ana enyọenyọ na ha na arịa ụkwara nta ma na enye ha ọgwụ.









