You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naira Scarcity: Ego naịra ochie abụrụkwala 'Legal tender' - CBN
Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa ekwuola na ha erubela isi na mkpebi ụlọikpe kachasị gbasara iweghachite ego naịra ochie ndị ha gbanweburu ka ọ bụrụkwa ihe e nwereike iji na-azụ ahịa na Naịjirịa.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru CBN bụ Isa Abdulmumin n'ụbọchị Mọnde, bụ abalị iri na atọ nke ọnwa Maachị 2023, o kwuru na "Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa enyela ụlọakụ niile na Naịjirịa iwu ka ha rube isi na mkpebi nke Ụlọikpe Kachasị nyere n'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị 2023".
"N'ihi nke a, CBN na ndị 'Bankers' Committee' nere ọgbakọ ebe ha nọrọ kpebie ma nye ntuziaka na akwụkwọ ego naịra ochie N200, N500, N1000 ka bụkwa 'legal tender' ha ndị ndị nke ọhụrụ ebipụtara ruo ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba 2023."
New Naira crisis: Enweghi mgbe m ji sị CBN esola mkpebi ụlọikpe kachasị - Gọọmentị etiti
Gọọmentị etiti zipụtara ozi n’ụbọchị Mọnde abalị 13 nke ọnwa Maachị na-ekwu na enweghi mgbe Onyeisiala Muhammadu Buhari jiri sị onyeisi ụlọakụ etiti maọbụ ọkaikpe gọọmentị etiti ka ha ghara ịrubere mkpebi ụlọikpe kachasị isi.
Dịka akwụkwọ ozi si gọọmentị etiti siri kwuo, nke a bụ iji taa ụkwa jara ọha eze dịka ndị mmadụ na-ajụ ihe onyeisiala nwere ikwu maka mkpebi ụlọikpe kachasị mere na nso nso a nke sị ka amalite jiri ego ọchịe N500 na N1000 na-azụ ahịa ọzọ na Naịjirịa.
Ozi a gara n’ihu na-ekwu na nwebeghi mgbe ọbụla onyeisiala Buhari kriri kpaa agwa na-egbochi mkpebi ụlọikpe ọbụla usoro ikpe ọbụla.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
N’ozi a ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari bụ Garba Shehu zipụtara, o sị
“Naanị ihe onyeisiala kwuru dịka e mechara ọgbakọ ime ụlọ bụ ka ụlọakụ etiti hụ na ego niile e kwesịrị iji na-azụ ahịa dị gbanyụụ ebe niile – Enweghi mgbe o jiri kwụgharịa nke a.”
Cheta na tupu e mee ntuliaka dịka nsogbu ụkọ ego Naịra nọ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ, onyeisi Buhari pụtara n’ihe onyonyo kwụgharị iwu si n’aka ụlọakụ etiti ma sị ka amalite jiri ego ọchịe N200 na-azụ ahịa ọzọ na Naịjirịa.
Nke a so ozi sibụ n’aka ụlọakụ etiti nke kwuru na aga akwụsị iji ego ochie naịra N200, N500 nakwa N1000 na-azụ ahịa na Naịjirịa n’ụbọchị 31 nke ọkwa Jenụwarị 2022. E mechara dọtịaoge ha ha tinyere maka ịkwụsị iji ego naịra ochie atụ mgbere ahịa ruo ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị.
Ngọteghị na nsogbu ndị so iwu a ga-eso n'okwu egọ ọhụrụ akparatala ndị mmadụ gbagharị dịka gọọmentị steeti ụfọdụ malitere imanye ndị mmadụ iji ego ọchịe a dịka ụlọikpe kachasị siri kwuo ebe steeti ndị ọzọ ekwụghi ihe ọbụla.
N'ọdị nso a, gọọmentị Anambra bụ Gọvọna Chukwuma Soludo kwuru okwu dara ụda maka iji ego ọchịe azụ ahịa na steeti ya
Ụlọakụ ọbụla jụrụ ịna ego naịra ochie, anyị ga-emechi ya - Chukwuma Soludo
Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo akpọkuola ndị steeti ahụ ka ha bido iji ego naịra (N200, N500, N1,000) n'azụmahịa ha n'ihi na ụlọakụ etiti enyela iwu ka ego ochie bụrụkwa ego eji azụ ahịa na Naịjirịa.
O kwuru na ụlọakụ ọbụla jụrụ ịnara ndị mmadụ ego ochie n'Anambra steeti, na gọọmentị ga-emechi ụlọakụ ahụ ma kpesakwa ha n'aka ndị CBN.
Soludo kwuru na Ụlọakụ etiti nwere mkpebi ahụ n'ọgbakọ nke otu a kpọrọ 'Banker's Committee' nwere n'ụbọchị Sọnde, Maachị 12.
"Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele n'onwe ya gwara m n'ekewentị n'abalị Sọnde na ha nwere mkpebi ahụ n'eziokwu".
"Ana m agwa ndị Anambra niile ka ha gaa n'ihu malite ịna ego ochie ahụ (N200, N500, na N1,000) n'ụlọahịa ha dị icheiche, nakwa ego nke ọhụrụ."
"Ụlọakụ ọbụla jụrụ ịna ego naịra ochie, kpesanụ ụlọakụ ahụ n'aka gọọmentị Anambra Steeti. Anyị ga-ekpesa ụlọakụ dị otu a n'aka CBN ma mechikwaa ya bụ ụlọakụ n'egbughị oge ọbụla."
N'okwu gbasara nchịkọta akụnụba nakwa nhazi ego na Naịjirịa, Gọvanọ Soludo bụ onye e kwesịrị iji okwu ya kpọrọ ihe n'ihi na ọ rụbuola ọrụ dịka Gọvanọ nke ụlọakụ etiti malite n'afọ 2004 ruo 2009.
Nke a na-abịa dịka mgbanwe ego naịra nke ụlọakụ etiti gbanwere mwere ka e nwee nnukwu ụkọ ego nke tinyere ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa n'ihe nhịahụ ugbua.
BBC Igbo lere anya n'akara soshal midia dị icheiche nke ụlọakụ etiti na-esi agbasara ọha obodo ozi, mana anyị ahụghị ụdị ozi dị otu a.
Anyị lekwara anya n'ọbaozi CBN mana anyị ahụkwaghị ozi dịka nke a.
N'izuụka gara aga, ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ kwuru na ọnụ na-ekwuru CBN bụ Isa Abdulmumin kwuru na ego Naịra ochie na nke ọhụrụ bụcha 'legal tender', nke a pụtara na e nwereike iji ha na-azụ ma na-erekwa ahịa na Naịjirịa.
Mana ọtụtụ mmadụ ka na-atụ ụjọ ịna ego ochie, n'ihi na ha na-eche ka ha nụ n'ọnụ onyeisiala Buhari maọbụ n'ọnụ Godwin Emefiele bụ ndị ọ dị n'aka ikwu ihe gbasara ya.
BBC na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ CBN kpọmkwem ihe bụ ntuziaka ha gbasara ego naịra ochie a.
Cheta na Ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa enyela iwu ka ụlọakụ etiti Naịjirịa weghachite ego naịra ochie ruo ọnwa Disemba afọ 2023.
Ụlọikpe kachasị nyere iwu a dịka ndị gọvanọ steeti 15 na Naịjirịa kpụpụrụ gọọmentị etiti nakwa ụlọakụ etiti ụlọikpe gbasara etu ha si machie ego naịra ochie N200, N500 na N1000.
Ndị gọvanọ a kwuru na oge nakwa ohere CBN nyere a ga-eji kwụsị ego ochie pere mpe, ma kwukwaa na ego ọhụrụ nke CBN bipụtara iji nọchie ego ochie ebughi ibu, nke mere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ji nọrọ na nnukwu nhịahụ n'ihi na ha ahụghị ego ha ji egbo mkpa.
Ụlọikpe kachasị kwenyere n'ihe ndị gọvanọ a kwuru ma nye iwu ka ụlọakụ etiti gbatịkwuo oge ha tinyere a ga-eji kwụsị ego ochie, ka ọ bụrụzie n'ọnwa Disemba afọ a.
Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye nyere ụlọakụ etiti ikike ịgbanwe ego naịra, ekwubeghịkwa okwu ọbụla iji gosi na gọọmentị ga-erube isi na mkpebi ahụ ụlọakụ etiti nyere.
Naịra ochie bụ 'legal tender' na Legọs - Gọọmentị Legọs
Gọọmentị Legọs steeti enyela iwu ka ngalaba gọọmentị niile bido ịnata ndị mmadụ ego naịra ochie n'irube isi n'iwu ụlọikpe kachasị nyere.
N'akwụkwọ ozi si n'aka Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Gbenga Omotoso, o kwuru na "ọ bụ ihe megidere iwu mmadụ maọbụ ịjụ ịnara ego naịra ochie ruo ọnwa Disemba afọ 2023 dịka ụlọikpe kachasị si nye iwu".
Omotoso kwuru na Gọvanọ Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu agwala ndị na-azụ ahịa, ọ kachasị ndị nwere ụlọahịa nta ka ha bido ịna ego ochie.
Gọvanọ Jide Sanwolu zipụtara ozi n'ụbọchị Mọnde kwuo na iwu steeti ahụ bụ ka amalite iji ego ọchịe N200, N500 na N1000 azụ ahịa dịka ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụta ya.