Ihe mere ụlọọrụ mba UK jiri gwaa ụmụakwụkwọ Naịjirịa kwakọrọ si na mba ha laa

Ndị Naịjirịa nọ na mahadụm dị na UK enwela nsogbu, a kwụsịrị ha ịgụ akwụkwọ, gwa ha sị na UK laa maka na ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ha n'oge.
Ụmụakwụkwọ Mahadụm Tesside ka a kwụsịrị ịgụ akwụkwo, mee mkpesa maka ha na ụlọọrụ gọọmentị mba UK maka na ego Naịjirịa dalamba ebe pounds nọ nwere mee ego ụmụakwụkwọ ahụ nwere n'ụlọakụ bụrụ nke na enweghizi ike ịzụ ịkwụ ụgwọakwụkwọ.
Ọtụtụ n'ime ha gwara BBC na ọ dị ha kọ ha gbụọ onwe ha ma bọ ụlọakwụkwọ ha ebubo maka ụsọrọ ha jị eso ha na enweghị mmetuta mmadụ.
Mana ọnụ na ekwuru mahadụm ahụ kwuru na akwụghị ụgwọakwụkwọ bụ ịda ịwụ eji enye Visa, ma kọwaa na ha enweghi ihe ọzọ ha kwesiri ime karịa ịkpọtụrụ ndị gọọmenti. Mana ụlọọrụ gọomentị UK kwụrụ na ọ bụ ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ dịara ịma ịhe ha ga eme maka ịkwado agụmakwụkwọ.
Naịjirịa na enwe nsọgbụ akụnụba nke enwebeghi na mbụ. Ọ na emetuta ụmụakwụ bụ ndị Naịjirịa nọ na Mahadụm dị na UK.
Ihe ịdị okeọnụ na abụkalị 34% mana ihe bidoro imebi oge gọọmentị chọrọ ịgbanwe ego, ma nwepu ego ochee.
N'ime otu afọ, mgbanwe ego Naịjirịa mechere daa mba karia 100% na ọbụrụ na ị gbanwe ya na US Dollar.

Tupuu ha ebido ịgụ akwụwkọ na Mahadụm Teeside, a gwara ụmụakwụkwọ ahụ na ha ga egosi ihe akaebe ga egosi na ha nwere ego ga ezu ha ịkwụ ụgwọakwụkwọ, ego nrị na ndị ọzọ .
Mana nsọgbụ akụnụba Naịjirịa na ego ịda mba gbarịrị ego ha were n'ụlọakụ.
Ọnọdụ akụnụba Naịjirịa metutara ụmụakwukwọ ahụ oge Mahadụm ha gbanwere ka e sị akwụ ụgwọ-akwụkwọ site na ịkwụ ụgwọ-akwụkwọ ụgbọrọ asaa banye n'ịkwụ ụgwọ-akwụkwọ ụgbọrọ atọ.
Ụmụakwụkwọ rụrụ 60 gwara BBC aha ha, ma na arịọ ụlọakwụkwọ ka ha mere ha ebere. Ụmụakwụkwo ọ metutara ka a kwụsịrị akwụkwọ n'ike.
Ụfọdụ ka ndị ọụ na agabata ụgwọ na arụrụ mahadụm ha ọrụ kpọtụrụ.

Adenike Ibrahim fọrọ obere ka ọgụcha akwụkwọ afọ abụọ ya oge onwere nsọgbụ ịkwụ ụgwọ-akwụkwọ tupuu achụpụ na ụlọakwụkwọ ma nwere aha mee mkpesa na ụlọọrụ gọọmentị UK.
Ọ mechere kwụọ ụgwọ akwụkwọ ya, mana Mahaadụm ya ekwehi anabata ya. Ha gwara ya kpọrọ nwa ya nwoke sị na mba UK laa.
Ọ kwụrụ "Akwụghịm ụgwọakwụkwọ etu m kwesịrị, mana akwụọla m 90% tupuu m nwe nsọgbụ ma biachaa mee ihe ọmụmụ m kwesiri ịmụ na ụlọakwụkwọ"
"Akpọọla m ha ma rịọ ha ka anyị nwee nkwekọrịta, mana ha achọghị ịma ihe na eme ụmụ akwụkwọ ha".
Ọ kwụru na ihe a bụ "ihe mgbawa obi" na ya amaghịzị ihe ga eme asambodo ya.
Ibrahim kwuru na "Ọ bụ ihe mgbawa obi dịalụ nwa m nwoke kemgbe m gwara ya, ọ na enwe obi mgbawa"
Ha enweghị ikike ịzara ọnụ ha
Ụlọọrụ Gọomentị na UK gwara Ibrahim na ndị ozọ na ha wenweghizi ikike ịnọ na UK maka na ha adaghịzị agụ akwụkwọ na mahadụm ha.
Na akwụkwọ BBC hụrụ, e nyere ụmụkwụkwọ ahụ ụbọchị ha ga ahụpụ UK ma kwụọ na 'ha enweghị ikike ikpere ọnụ ma ọbụ ka atule ọnọdụ ha"
Otu onye na dị enyere akwụkwọ ka ha si na UK laa kwụrụ na kemgbe e nyere ya akwụkwọ ahụ na ihe na agbata ya n'obi bụ ka ya gbụọ onwe ya.
Mahadụm ahụ kwuru na ha emeela ihe ha ga emewu maka ịkwadọ ụmụakwụkwọ ahụ.

Esther Obigwe kwuru na ya gbara mbọ ka ya gwa mahadụm ahụ ka ọnọdụ ya sị di maka ego mana onwghi onye gere ya ntị rụọ na oge ha nyere ya akwụkwọ, machie ya ịbịa na mahadụm ahụ ma gwa ya sị na UK laa.
"A bịara m akwụkwọ ka m kwesiri ịbia ma nọrọ n'ihe nkụzị niile e mere"
"Ọ bụ ihe obi mgbawa, abụzị m onye na enweghi ka ọha ya ma nọorọ naanị m, enweghi onye m ga akọrọ"
"Kemgbe ọnwa abụọ, adaghị m eriwu nrị ma ọ bụ rahụ ụra. Amaghị m ihe mere e ji mee anyị ihe a, enweghi ajọ ihe anyị mere"
Ọ kwụrụ na "ọtụtụ ụmụakwụkwọ mefuru nnukwu ego tupuu ha abịa UK"

Jude Salubi, bụ onye na agụ akwụkwọ gbasara ịrụ ọrụ obodo ka a kwụsịrị ịbata na mahadụm ka ọfọrọ ebele ka ọgụchaa akwụkwọ. A gwakwara ya sị na UK pụọ.
Ọ na esi na Teesside gaa Liverpool na ngwụcha ịzụ ụka ọbụla ebe ọ na arụ ọrụ awa ịrị na asatọ ebe ọ na achọ ịkwụcha ụgwọ akwụkwọ ya.
"Ụgbụa akwụọla m £14,000 ma na ọ fọrọ £14,000 ka m kwụchaa"
"A chọrọm ịkwụcha ego fọrọ mana a chọrọm ka ọ bụrụ na m kwụcha ụgwọ ahụ ka ha nabata m na mahadụm ma nwehachịta visa m"
- ọbụrụ na ihe edere n'akụkọ a metụtara gi, ị ga enwete ndụmọdụ ebe a.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
BBC ghọtara na ọtụtụ na ụmụakwụkwọ a chụrụ na mahadụm ahụ akwụchaala ụgwọakwụkwọ fọrọ mana mahadụm ha enweghị ịke ịnyere ha aka na ụsọro ndị gọomentị gị sị ha laa.
Ọnụ na ekwuru Mahadụm ahụ kwụrụ na "Mahadụm Teeside nwere afọ ojuju dịka mahadụm nwere ụmụakwukwọ sị na mba ụwa niile ma nwee ọtụtụ ụmụakwụkwọ, mana ha mara ebe ikike ha jedebere na etu e sị enye Visa na ihe gbasara ya.
"Ụsọrọ nọ na ịwụ bụ ihe emere ga ụlọakwukwọ nwee ike ịkwadọ ụlọọrụ na ahụ maka ịbata na ịpụ na mba UK"
ọ kwụkwara na "anyị maara nsọgbụ ọtụtụ ụmụakwụkwọ nọ n'ime ya " mana anyị enyeela ha nkwado anyị kwesiri"
"Anyi nweputara etu ọzọ a ga esi kwuọ ụgwọ akwụkwọ; mana ọtụ n'ime ụmụakwụkwọ emeghi ya etu ahụ"
Mana ụlọọrụ gọọmentị UK kwụrụ na ọ bụ naanị mahadụm ha nwere ikike ịnye ma ọ bụ ịnapụ ụmụakwụkwọ Visa.
Ọ kwụrụ "onye ọbụla a napụrụ Visa ya kwesiri ime ka ngwangwa nwete visa ọzọ ma ọ bụ sị na UK laa"
Ọtụtụ ụmụakwụkwọ Naịjirịa ka a napụrụ vịsa ha, gwa ha sị na UK laa maka na ego Naịjirịa bụ naịra daramba nke mere ọ gị ahịaha arụ ịkwụ ụgwọakwụkwọ na oge ha kwesiri ịkwụ ya.
Ụmụakwụkwọ Mahadụm Teeside ka a kwụsịrị akwụkwọ ịbata mahadụm ha ma nwere aha ha gaa n'ulọọrụ gọọmentị na UK maka na ego Naịjirịa dara ọnụala ma kpọchapụ ego ha nwere na ụlọakụ ha.
Ọtụtụ kwụrụ na ịgbụ onwe ha gbatara ha na obi ma bọ mahadụm ha ebubo enweghi mmetuta mmadụ.
Ọnụ na ekwuru mahadụm ahụ kwụrụ na akwụghị ụgwọ-akwụkwọ bụ ịda ịwụ e jịrị nye mmadụ ohere ịgụakwụkwọ na Visa. Ọ sị na enweghi ihe ọzọ ha ga eme na abụghị ịkpọtụrụ ụlọọrụ gọọmentị UK maka ya.









