Ụdịrị ọrịa kansa ara kachasị arịa ụmụnwaanyị isiojii na ụzọ e si egbochi ya

Nyocha maka ọrịa Kansa ara nke ụmụnwaanyị

Ebe foto si, SPL

Ndị nyocha sayensi mba Amerịka enyochapụtala njịkọ dị n’etiti ajọ ọrịa kansa nke ara na ụmụnwaanyị isi ojii.

Nyocha ha gosiri na ọ bụ ụmụnwaanyị isi ojii ka ọrịa a kacha awakpo.

Ha kwuru na ha na-atụ anya na ihe a ha nyochapụtara ga-akpali mmụọ ụmụnwaanyị isi ojii ka ha na-enyocha onwe ha ugboro ugboro gbasara ọrịa a.

Laverne Faunteroy nwaanyị isiojii dị afọ 53 bi na New York kwuru sị, “Enweghị mgbe o jiri baa m n’obi maọbụ ịchekasị uche maka nke a”.

Laveren na-ebi ndụ gbadoro ụkwụ n’ahụike. Kama otechaghị aka o mere emume ncheta ọmụmụ ya ka o nwetara ozi na o nwere ọrịa kansa.

O kwuru sị, “ụjọ tụrụ m n’ihi ndị niile m ma nwere ọrịa kansa ejighị isi ha pụta, obi dara m mba, ezigbo ụjọ jidere m”.

LAVERNE FAUNTLEROY

Ebe foto si, LAVERNE FAUNTLEROY

Laveren chọpụtara na o nwere kansa ara nke a kpọrọ ‘Triple Negative’ (TNBC).

Ndị mmadụ anaghị enwekaarị kansa nke a, ọ na-eto ngwa ngwa, ọ na-agbasakwa ngwa ngwa, ma na-esi ike ịgwọta. Ọrịa kansa nke a na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ.

Dịka etu ọrịa kansa nke a siri dị, ọgwụ eji agwọ kansa ndị ọzọ anaghị adị ire n'ebe ọ nọ.

Ọ bụ ụmunwaanyị na-erubeghị afọ iri anọ (40) ka ọ na-emekaarị ma bụrụkwa ụmụnwaanyị isi ojii ka ọ kachasị arịa.

Nyocha ngalaba JAMA oncology bipụtara chọpụtara na ọrịa a ji pasentị 28% egbu ụmụnwaanyị isi ojii karịa ụmu nwaanyị ndị ọcha nwere ya bụ ọrịa.

Ugbua, nyocha ọzọ akwadola ya bụ mpụtara na-ekwu na e nwere ihe jịkọro agbụrụ ụmụnwaanyị Afrịka na ọrịa kansa 'Triple Negative' (TNBC).

Dkt Lisa Newman (Aka ekpe) na Dkt Melissa B Davis (Aka nri)

Ebe foto si, John Abbott

Nkọwa foto, Dkt Lisa Newman (Aka ekpe) na Dkt Melissa B Davis (Aka nri) na-eme nyocha maka ọrịa kansa nke ara

Lee etu ị ga-esi nyocha ara gị maka ọrịa Kansa.

  • Wetuo obi ala – nyocha ara gị otu mgbe kwa ọnwa ọbụla
  • Oge kachasị mma bụ mgbe ị na-asa ahụ, ị gbara ncha n’aka.
  • Kama tupu i mee nke a, gaa n'enyo lee ma ara gị o nwere ebe ọ zara aza.
  • Cheta lee anya n’abụ gị.
  • Cheta kwa na ụmụagbọhọ nwereike inwe ara zara aza, kama nke a apụtaghị na ha nwere ihe dị njọ na-eme ha.
  • Ara nwekwaraike ịza mgbe nwaanyị nọ na nsọ ya kama ọ karịa otu ọnwa gaa hụ dokịnta gị.
  • Mara kwa maka ndị ezinaụlọ gị n’ihi na o nwereike isite n’agbụrụ mmadụ.
Dkt Newman

Ebe foto si, WEILL CORNELL MEDICINE

Nkọwa foto, Dkt Newman
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dọkịnta Lisa Newman bụ Weil Cornell Medicine onye so na nyocha ndị sayensị nke mbaụwa maka ọrịa kansa ara n’ụfọdụ mpghara n’Afrịka kamgbe afọ iri abụọ.

Nyocha ya gosiri na ọ bụ ụmụnwaanyị si na mpaghara Ndịda Afrịka dịka mba Gana ka ọria kansa TNBC kachasị enye nsogbu.

O kwuru na ọ nwereike ịbụ maka na ahụ ụmụnwaanyị ndị a agbanweela maka etu ahụ ha si ebuso ọrịa Malarịa agha.

Newman kwuru sị, “ nyocha ọrịa kansa ara nke 'Triple Negative' na-egosi na agbụrụ mmadụ si metụtara etu ahụ onye ahụ si alụsọ ọrịa a ọgụ nke na-emetụta ụfọdụ akụku ahụ mmadụ dịka ara nwaanyị”.

O kwukwara sị, “ ọrụ nchọpụta a na-akpalị mmụọ anyị n’ihi na ọ na-aza ajụjụ maka etu ọrịa si awakpo mmadụ site n’agbụrụ”.

Ọ gara n’ihu kọwaa, “Ọ na-enyekwa anyị ezi nghọta maka ọrịa a”.

Newman gbara ama sị,” Anyị na-ahụta oke agbụrụ gbasara ọrịa kansa dịka ngalaba ahụike na ndị na-elekọta ndị ọrịa anya anaghị ekwe eji ụmụnwaanyị ndị agbụrụ Afrịka eme nyocha maka ọrịa kansa dịka ha na-eji ndị ọcha eme”.

Etu a ga-esi eme ka ihe dị mma

Laverne kwenyere na ọ dị mkpa na ụmụnwaanyị agbụrụ Afrịka soro na nyocha ahụike maka ọrịa.

O kwuru sị, “ Echere m na akụkọ anyị na mba Amerịka na etu e siri kpasoo anyị agwa oge gboo, na-egbochi anyị isonye n’ihe ọbụla”

O kwuru sị, “ Achọrọ m iso na ndị ga-eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mma n’ọdịnihu”.

Laverne enweghịzị ọrịa kansa dịka awara ya ahụ n’ọnwa Julaị maka ọrịa a.

“Ihe niile na-aga nke ọma... eji m ya eme ọnụ na m soro na nyocha a. Ma jiri kwa ya na-eme ọnụ na m nyeere Dọkịnta Newman aka maka nyocha ya”.

DR GEORGETTE ONI

Ebe foto si, DR GEORGETTE ONI

Nkọwa foto, DKT GEORGETTE ONI

Na mba Briten, ụmụnwaanyị agbụrụ Afrịka ji ugboro abụọ karịa ụmụnwaanyị ndị ọcha gbasara ịnyochapụta ọrịa kansa oge ọ nọ na ngwụcha ya.

Ngalaba NHS nke agbụrụ na Health Observatory na-akpọku ụmụnwaanyị isiojii ka ha soro na nyocha a”.

Dọkịnta Georgette Oni bụ dọkịnta na-awa ụmụnwaanyị ahụ maka ọrịa Kansa bi na Notthingham kwuru na ọ bụ ezigbo nsogbu na ụmunwaanyị isiojii anaghị eso na nyocha ahụike ndị a.

O kwuru sị, “Ihe m na-ekwukaarị maka ya ọtụtụ mgbe bụ ka ụmụnwaanyị ndị isiojii soro na nyocha ndị a, n’ihi na ọ bụ ebe a ka e si edepụta mpụtara nyocha ndị a”.

“Ọ bụ etu a ka e si achọpụta etu e si alụso ọrịa a ọgụ, nke a bụ nke metụtara gị dịka mmadụ n’ihi na ọ bụ ụmunwaanyị agbụrụ Afrịka ka ọ kachasị metụta”.

O kpebiri sị, “Ọ bụ mgbe ọtụtụ ndị mmadụ soro mee nyocha ka mpụtara ya na-aba oke uru”.