Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti

Aha onyonyo, Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha
Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti

Ụlọelu ogogo ise dara n’ụlọakwụkwọ Dennis Memorial Grammar (DMG) n’Onitsha, Anambra Steeti ataala isi otu onye mma merụọ mmadụ abụọ ahụ.

Ụlọ a bụ nke nọ n’ogogo ngwụcha ya dara n’ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ ụbọchị Wenezde 13 Juun, 2024.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ụlọ a dara kọwara na ọ bụ ụlọakwụkwọ DMG nwee ụlọelu ahụ, bụ nke ndị gụrụ akwụkwọ ebe ahụ n’oge gara aga na-arụ.

Ụlọelu dara na DMGS dị n'Onitsha

Akụkọ kwuru na a malitere ịrụ ụlọ ahụ n’ihe dịka afọ abụọ gara aga bụ nke a na-akwado ịgbape ya n’afọ ọzọ iji mee emume ncheta afọ 100 ụlọakwụkwọ ahụ malitere.

Mmadụ atọ ahụ o metụtara bụ ndị ọrụ na-arụ n’ụlọ ahụ, otu onye nwụrụ ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ - ha na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Ndị ọkachamara n’ịrụ ụlọ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ha chọpụtara na akụrụngwa ndị e ji rụọ ụlọ ahụ dị mma kama na otu ihe mere ụlọ ahụ jiri daa bụ na e soghi ezi usoro rụọ yaa bụ ụlọ.

Ha gara n’ihu nye ndụmọdụ na gọọmentị kwesịrị ihiwe kọmitii gaa na-eme nyocha ma na-akụziri ndị ọrụ aka na-arụ ụlọ usoro e kwesịrị iji na-arụ ụlọ.

Ihe gọọmentị Anambra Steeti kwuru

Ụlọ ogogo ise dara na DMGS Onitsha

Osote gọvanọ Anambra Steeti bụ Onyeka Ibezim gara njem nleta n’ụlọọgwụ ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ.

O tikwara ezinaụlọ ndị nwanne ha nwụrụ aka n’obi ma kwuo na gọọmentị amalitela ime nyocha banyere ya.