Etu ndị ntọrị si gbahapụ ụkọchukwu katọlịk ha tọrọ na Benin

CATHOLIC ARCHDIOCESE OF BENIN CITY

Ebe foto si, CATHOLIC ARCHDIOCESE OF BENIN CITY

Nkọwa foto, A na-atọkarị ndị ụkọchukwu Katọlịk n'oge a na Naịjirịa

Ụlọ ọrụ Archbishop nke Catholic Achdiocese dị na steeti Benin akọwala etu ndị ntọrị si tọghapụ Fr Luigi Brenna, CRS n'ụbọchị July 3, 2022.

Michael Oyanoafoh bụ Chancellor ụlọ ọrụ ahụ depụtara na Fr Luigi Brenna, CRS enwerela onwe ya.

N'akwụkwọ ozi o depụtara, Oyanoafoh kwuru na ọ bụ mgbe Fr Luigi Brenna, CRS na-ekiri ndị na-agba bọọlụ n'elekere ise nke mgbede July 3, 2022 n'ime obodo ka ndị ntọrị a na-eche na ha bụ ndị ọchị ehi dabatara ime ebe ahụ ma gbawa egbe aghara aghara.

Tupu Fr Luigi Brenna agbaba n'ụlọ ya, ndị ntọrị ahụ nwuchiri ya ma tiwe ya ihe , ma were mma kụọ ya n'isi ma n'ahụ ya ma dọrọ ya pụwa, dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwu.

Ka ha dọkpụ ya na-aga, ha malitere kụwa ya ihe ọzọ makana o kweghị e so ha. Ihe ahụ akụịrụ ya mere ka o kubitu. Ha hapụrụ ya ebe ahụ maka na ha chee na ọ nwụọla.

Mgbe o nwetere onwe ya, o bu ahụ ọbara ọbara lawa bee ya. Ndị ụkọchukwu ibe ya zoronu mgbe egbe na-ada aghara aghara pụtara kpọrọ ya gawa ụlọgwụ Igbinedion dị n'okada.

Fr Luigi Brenna ka na-anata ọgwụgwọ ruo ugbua dịka akwụkwọ ozi ahụ si n'ụlọ ọrụ Catholic Achdiocese dị na steeti Benin si depụta.

CATHOLIC ARCHDIOCESE OF BENIN CITY

Ebe foto si, CATHOLIC ARCHDIOCESE OF BENIN CITY

CATHOLIC ARCHDIOCESE OF BENIN CITY

Ebe foto si, CATHOLIC ARCHDIOCESE OF BENIN CITY

Nkọwa foto, A na-atọkarị ndị ụkọchukwu Katọlịk n'oge a na Naịjirịa

Ihe ndị uweojii kwuru maka ntọhapụ Fr Luigi Brenna, CRS n'aka ndi ntọrị

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọrụ ndị uweojii nọ n'Edo steeti ekwuola na ha ndị uweojii nọ n'obodo Iguobazuwa nwetere mkpesa gbasara ntọrọ ụkọchukwu Katọlịk dị afọ iri isii na anọ (64) ma banye ọrụ ozugbo.

ASP Jennifer U. Iwegbu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ọ bụ na Ogunwenyu dị n'Usen community n'okpuruọchịchị Ovia South West dị n'Edo steeti.

Iwegbu kwuru na ndị uweojii soro ndị ntọrị ahụ gawa n'ogbe ha, ndị ntọrị malitere gbawa egbe mgbe ha hụrụ ha mana ndị uweojii gbakarịrị ha n'egbe ma gbagbuo ndị ntọrị atọ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ ma gbahapụ ụkọchukwu ahụ ha tọrọ.

O kwuru na ndị uweojii kpọọ ụkọchukwu ahụ ndị ntọrị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ dị na Igbinedion Teaching Hospital, Okada.

O kwuru na ha ka na-aga n'ihu n'inyocha ọhịa ahụ ma nwude ndị ntọrị ka nọ ebe ahụ.

Ndị ntọrị tọrọ ụkọchukwu Katọlịk abụọ ọzọ ụbọchị Jụlai 3, 2022

Ndị o ji egbe ezu tọrọ ụkọchukwu abụọ ndị ọzọ n’Edo steeti n’ime ndịda anyanwụ, Naịjirịa n’ụbọchị Sunday bụ Julaị 3, 2022.

Nke a na-abịa dịka izu ụka abụọ gachara ndị ntọrị tọrọ ma gbuo otu ụkọchukwu na steeti ahụ.

Chidi Nwabuzor bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ihe a mere n’okporoụzọ Benin-Auchi

Ndị uweojii kpọpụtara Fr. Udo Peter na Fr. Philemon Oboh dịka ụkọchukwu katọlịk abụ ọ ahụ ndị ntọrị tọrọ.

N’izu ụka gara aga ka ndị ntọ tọrọ ma gbuo Rev. Fr Christopher Odia bụ ụkọchukwu nọ na St. Michael Catholic Church dị n’ Ikabigbo n’okpuruọchịchị Etsako West dị n’Edo steeti.

Akụkọ kwuru na ọbụ mgbe ọ na-akwado ị ga-aka ụka ụtụtụ ka ndị ntọrị ahụ tọrọ ya , ma mechaa gbuo ya.

Ndị uweojii na-ekwu na ha na-awagharị ọhịa niile iji chọpụta ndị ntọrị ahụ tọrọ ụkọchukwu abụọ ndị a.