You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọgbaa bọọlụ ama ama bụ Pele anwụọla
Ọgbaa bọọlụ ama ama bụ Edson Arantes do Nascimento eji Pele mara nke mba Brazil anwụọla dịka ọ gbara afọ 82.
Nke na-aeso dịka ọrịara ọrịa.
Ọrịa akụrụ na ọrịa nwoke nyere ya nsogbu na nsonso a.
Otu n'ime ihe iribama eji mara Pele bụ na ama ya dịka onye nyere goolu 1,281 kamgbe ọ gbawara bọọlụ ma gbaa asọmpị Bọọlụ ugboro 1,363.
Naanị Pele bụ onye ọgbaa bọọlụ meriri asọmpị iko mba ụwa ugboro atọ.
O buliri iko mba ụwa n'afọ 1958, 1962 na 1970.
Ngalaba FIFA kpọpụtara ya dịka onye kacha gbaa bọọlụ kamgbe afọ 2000.
Ihe ndị ama ama na-ekwu maka ọnwụ Pele
Fabrizio Romano bụ onye ntaakụkọ ama ama maka egwuregwu bọọlụ kwuru maka ọnwụ Pele ma sị na agaghị echefu aha ya echefu.
O zịgaara ezinụlọ ya ozi iti aka n'obi.
Ngalaba na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naijirịa bụ Nigerian Football Federation zịgara ezinụlọ ya ozi iti aka n'obi.
Harry Macguire na-agbara mba Briten na Manchester United gwara Pele ka ọ laa nke ọma ma sị na ọ bụ ihe ịtụanya na o meriri Iko mba ụwa ugboro atọ.
Ọgbaa bọọlụ bụ Mesut Ozil kwuru na ụkpụrụ Pele hiwere ga-adịgịde.
O kwuru na Pele na Maradona ga-abụzị ndị otu bọọlụ 'Heaven FC' n'eluigwe ma sị na enweghị ndị ga-emeri ha.
Cristiano Ronaldo zịgara ezinụlọ Pele ozio iti aka n'obi. O kwuru na Pele bụ onye kpalịrị mụọ ọtụtụ ndụ pụrụ nde mmadụ. Ma sịkwa na ya agaghị echefu ihụnanya pele gosiri ya.