Obi na-ata m ụta maka ọnọdụ nne na nna m nọ ugbua - Sonia Ekweremadu

Sonia Ekweremadu bụ nwa Ike Ekweremadu, onye bụbu osote onyeisioche sineti Naịjirịa, ekwuola na ọbi dị ya njọ maka ọnọdụ nne na nna ya nọ ugbua n'ihi ya.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere na London, dịka nne na nna ya nọ n'ụlọikpe maka ebubo ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ.

Ụlọikpe tụrụ Ike Ekweremadu mkpọrọ afọ itoolu na ọnwa asatọ maka iji ụzọ aghụghọ kpọfete otu nwata nwoke na UK iji were akụkụ akụrụ ya tinyere nwa ya nwaanyị bụ Sonia, onye na-arịa ọrịa akụrụ.

A tụkwara nwunye Ekweremadu bụ Beatrice mkpọrọ afọ anọ na ọnwa isii, ma tụọ otu nwoke ọzọ aha ya bụ Obinna Obeta mkpọrọ afọ iri maka otu ebubo ahụ.

Sonia kwuru na ya ghọtara ikpe a mara nne na nna ya, mana ọ nabataghị ya.

O kwukwara na ọrịa na-arịa ya ka a na-akpọ 'Nephrotic Syndrom' maọbụ FSGS n'ịchafụ, nke pụtara na ọ ga na-enweta ọgwụgwọ a na-akpọ 'dialysis' ndụ ya niile ma ọ bụrụ na a gbanweghị akụrụ ya.

O kwuru na o soghị na ndị chọtara nwoke ahụ kwetara na ọ ga-enye ya akụrụ ya, kama na ya nụrụ na otu onye ekwetala inye ya akụrụ ya.

Gbasara nwata nwoke ahụ, Sonia kwuru sị: "onweghị ihe ọbụla m bu n'obi gbasara ya, ana m echere ya echiche ọma."

Sonia kwuru na otu ihe ya mụtara n'ihe niile a bụ na ụwa na-agbanwe agbanwe ngwangwa, "otu ụbọchị ị nọ n'ụlọ gị na-enweta onwe gị, echi ya, ihe niile aghasaala."

Gere mkparịtaụka a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.