Aba Power Plant: Etu ndị Aba ga na-akwụ ụgwọ ọkụ

Aha onyonyo, Aba Power Plant: Ihe ọ ga-efu ka ọkụ anyụ anyụ na-enwu n'Aba na gburugburu ya - Barth Nnaji
Aba Power Plant: Etu ndị Aba ga na-akwụ ụgwọ ọkụ
Igwe ọkụ latrik n'Aba
Nkọwa foto, Igwe ọkụ latrik n'Aba
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Ọkammụta Barth Nnaji bụ onye nwe ụlọọrụ ọkụ latrik n'Aba bụ Geometric Power akọwaala ihe ga-eme ka ọkụ a ghara ịnyụ anyụ.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara na ọ bụghị ihe raara ahụ ka ọkụ latrik na-enwu na-anyụghị anyụ n'Aba ma ọ bụrụ na mmanụ gaasị ga na-eru ha aka mgbe niile.

Nke a na-abịa dịka Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima gbapechara ụlọọrụ a ga-enye okpuruọchịchị itoolu dị n'Abia Steeti ọkụ n'ụbọchị 26 Febụwarị 2024.

O kwuru na ụlọọrụ ha nwere akụrụngwa 'turbine' atọ nke otu n'ime ha nwere ikike inye ọkụ latrik 47 megawatt.

O kwuru na ọ bụrụ ha nwete mmanụ gaasị zuruoke, ga-eme ka 'turbine' atọ a na-arụ ọrụ, na nke a pụtara na ọkụ anyụghị anyụ ga-adị, ebe ha ga-etinye nke fọrọ afọ n'igwe ọkụ 'national grid'.

Ọkụ latrik Geometric

Nwada Agatha Nnaji bụ nwunye ya ma bụrụkwa onye nchịkọta ụlọọrụ Geometric Power gbakwụnyere na ego ole ndị Aba ga-akwụ n'ụgwọ ọkụ latrik agaghị akarị ihe gọọmentị nyere n'iwu ka a na-agwụ.

O kwuru na ọ bụghị ụlọọrụ ha ka ọ dị n'aka ikwu ego ole ndị mmadụ ga-akwụ kama na ọ bụ ụlọọrụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) na-ekpebi ego ole ndị mmadụ na-akwụ n'ọkụ latrik.

Ụlọọrụ na-enye ọkụ latrik

Ọkammụta Nnaji gara n'ihu kọwaa etu ụlọọrụ ha si malite njem ịrụ ụlọọrụ ga-enye ọkụ anyụghị anyụ n'Aba.

O kwuru na ha arụbuola igwe ọkụ n'Abuja mgbe Onyeisiala Olusegun Obasanjo na-achị, na ọ bụ oge ahụ ka ndị nwee ụlọọrụ n'Aba kpọtụrụ ha ka rụọ ụdịrị ihe a n'Aba.

Kirie ihe onyonyo a maka ihe ha kwuru n'uju;