Electrical Engineering: 'Na nrọ ka e ziri m etu e si arụ igwe ọkụ latrik'

Aha onyonyo, Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa

Solomon Ukoha so n'ime ndị nwere akara aka ịrụpụta akụrụmgwa technuzu.

Dịka ụfọdụ mmadu n'Aba, Maazị Ukoha enweghị ohere ịga mahadum mana ọ na-agbalị ike ya n'imepute ihe.

Ọ sị na ọ bụ na nrọ ka uche oji eme ihe ọ na-eme si apụta.

N'ihe nkiri a, o gosiri aka ọrụ ya ma kwukwa ebumnuche na olilanya ya.

Akụkọ ga-amasị gị