Onye kuturu ụlọekpere Fada Okunerere na Nsukka? Lee ihe anyị ma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ihe anyammiri mere na Nsukka dị n'Enugwu steeti n'ụbọchị Tọzde 13 Maachị 2025 oge a wakporo ụlọekpere Fada Obayi onye e ji Fada Okunerere mara.

Fada Obayi tiri mkpu na soshal midịa kwuo na ọ bụ otu nwaanyị aha ya bụ Monica Otta duuru ndị akpụobi bu igwe caterpilla na Buldozer bịa kutuo ụlọekpere ya sị ala ebe ahụ bụ nke ya nakwa nke gọvanọ chịburu Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi.

Dika o siri kwuo "Onye kwaturu ụlọ ekpere m na ụlọ ebe m na-emepụta mmiri bụ Monica Otta. O teela o ji na-akpọ ganị ganị na ala bụ nke ya. Ala anyị zụtara n'usoro gọọmenti, nọrọ na ya kemgbe ọtụtụ afọ ka a na-ekwu ihe a".

"Nchọpụta gosiri na ọ tụụrụ gọmenti asị, ma jiri aka ya kpọrọ ndị omekome kutuo ụlọ na ngwongwo anyị."

Ụfọdụ ndị akaebe nọ na ya bụ Adoration n'ụbọchị Tọzde kwuru na ọtụtụ ụgbọala wakporo ha na mberede, were egbe chụsaa ndị mmadụ tupu ha amalite ịkụtu ụlọ.

Fada Obayi kwara arịrị kwuo na igwe e ji arụpụta mmiri ọṅụṅụ 'pure water' ha mebiri bụ nke ya bitere akatamkpo ego dị narị nde naịra atọ (300m) wee zụta nso nso a.

O kwuru na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha ji katapịlla mebie gụnyere ngwa egwu ruru narị nde naịra abụọ (200m) tinyere ọtụtụ ụlọ ruru ọtụtụ ijeri naịra.

Fada Obayi gara n'ihu kwuo na oge eruola mgbe nwaanyị ahụ bụ Monuca Otta ga-ekwu ebe o siri nweta ikike ịkwatu ụlọ na iweghara ala mmadụ maka na ụlọọrụ mịnịstrị na-ahụ maka ala na nhazi obodo ekwuola na ọ bụghị ha nyere ya ikike ịkpa ajọ agwa ahụ.

Dịka akụkọ a ka a na-ebido ebido, anyị na-agba mbọ ka anyị weta ọnụokwu nwaanyị Fada kpọrọ aha ya bụ Monica Otta nakwa ihe gọọmenti Enugwu steeti were ikwu maka ihe mere.