Ihe mere m jiri mepe ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ na-efu n'Anambra - Ebuka Obi

Seraphic Home bụ ụlọọgwụ ma bụrụkwa ụlọ nleta ndị kara nka nakwa ebe a na-agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ isi na-efu
Nkọwa foto, Seraphic Home bụ ụlọọgwụ ma bụrụkwa ụlọ nleta ndị kara nka nakwa ebe a na-agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ isi na-efu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A gbapeela ebe a na-agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ na-efu n'Anambra steeti.

Ebe ahụ a na-akpọ Seraphic Home, n'Aguleri nwere ngalaba dị icheiche nke gunyere ebe ndị kara nka ga na-anọ.

N'oge a na-agbape ebe ahụ ka Govanọ Chukwuma Soludo na-achị steeti ahụ kelere onye hibere ebe ahụ ma bụrụkwa onye mgbasa ozi Chukwu a maama bụ Ebuka Obi maka ịrụ ebe a na-edobe ndị nka ma na-agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ.

Mana n'oge Ebuka Obi kwuru okwu ka ọ kọwara na kamgbe ya ji bụrụ ụmụaka ka ya nwere mmasị" ịrụ ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ndị na-arịa ọrịa ụbụrụ ma bụrụkwa ebe a na-eleta ndị agadị na-akwụghị ụgwọ ọbụla".

"Ọbi dị m ụtọ na taata ka m na-agbape ụlọọgwụ a n'Aguleri".

"Ugbua onye ọbụla nwere onye n'enwe ọya ụbụrụ isi ma agadị enweghị onye enyemaka nwezịrị ike ibuta ya na Seraphic Home Aguleri na-akwụghị ụgwọ ọbụla".

Ya bụ ụlọọgwụ nwere akwa ndina ruru nari ise dịka ha ga-amalite ịnabata ndị ọrịa ngwa ngwa.

Foto Ebuka Obi
Nkọwa foto, Foto Ebuka Obi

Ebuka Obi bụ onye a ma dịka onyeisi Zion Prayer Movement Outreach. Mana kedụ ihe ị kwesiri ịma maka Ebuka Obi?

Na mkparịtaụka Ebuka Obi na BBC Igbo nwere lee ihe o kwuru:

  • A mụrụ Ebuka Obi n'afọ 1981.
  • Nne na nna ya ka dị ndụ, aha ha bụ Maazị Vincent na Veronica Obi, ha abụọ bụ ndị nkuzi lara ezumike nka.
  • Ọ bụ otu n'ime ụmụ asaa nne na nna ya mụrụ.
  • Ọ bụ onye Ngọ Ọkpaala n'Imo state.
  • Ebuka Obi bụ onye nwere ụlọ mgbasa ozi Chukwu maọbụ ụlọ ekpere a na-akpọ Zion Prayer Movement Outreach. Ebuka bụ onye a maama maka okwu Chukwu nakwa ihe ọ na-ekwu ma nwekwa igwe mmadụ ndị na-aga ụlọ ekpere ya.
  • Cheta na oge garaaga ka ndị mmadụ na-ebo ya ebubo "ime ihe ịtụnaanya adịgboroja" nke a na-akpọ "arrange miracle" bụ nke ọ gọrọ ma kwuo na ya amaghị ihe ọbụla gbenyere ya. O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ebe ọ kọwara na ọ bụ oziọma ọ na-agbasa mere aha ya ji ewu ewu na soshal midia nakwa na mbaụwa dị iche iche.
  • Ọ sị na ọ lụbeghị nwaanyị maọbụ mụọ ụmụ.