Ọnụ ahịa ọgwụ emeela ka ọ raa m ahụ ịzụta 'Inhaler'
Asthma bụ otu ọrịa na egbochi mmadụ iku-ume ma nwekwa otu ọgwụ eji agwọ akpọrọ Inhaler.
Mana dịka ọnụ ahịa ngwa nri na ọgwụ na-arị elu na Naịjirịa, ọ raara ahụ ndị bu ọrịa ịnweta ya bụ ọgwụ dị ezigbo mkpa, ọ kachasị ebe ndị mmadụ na-anwụ maọbụrụ na ha ejighi ọgwụ ahụ.
Phoebe bụ otu nwaanyị na-arịa ya bụ ọrịa "Asthma", ọ kọọrọ BBC ihe ndị ọ na-agabiga nakwa ahụhụ ọ na-ata iji nwetanwu ọgwụ a dị ya oke mkpa.
Ọ kọwara etu ngalaọnụ inhaler sị emetuta ndụ ya ma na egbochiri ya ime ihe ụfọdụ na amasị ya.
Kingsley Thompson bụ onye na akwado ikike dịịrị mmadụ na-akpọ oku ka gọọmentị mee ka ndị nwere ọrịa asthma na-enweta inhaler n'efu.
Kirie akụkọ a n'uju ebe a





