Etu ndị mmadụ si zọpụta m n'idemmiri buuru m n'Imsu Junction - Ada Ngozi Adiele

Otu nwaada idemmiri buuru n'ebe akpọrọ 'Imsu junction' dị n'Owerre, Imo steeti ekwuola etu ndị mmadụ si zọpụta ya.

Ada Ngozi Adiele nọ n'ụlọọgwụ ugbua kwuru na o si n'ụgbọala rituo mgbe mmiri ozuzo na-ekwo ekwo buuru ya.

Ọ kọwara na ụkwụ mịpụrụ ya mgbe ọ na-anwa ịwufe ọwa mmiri dị ebe ahụ.

"Ọtụtụ ndị mmadụ hụrụ ihe mere nwara ịzọpụta m mana o nweghi isi" ka o kwuru.

"Ndị mbụ bụ ndị sere ihe onyonyo fegharịrị, ndị ọzọ mechara hụ ebe m weliri aka elu ma tinye ihe gbochiri m, ma zọpụta m".

Ihe onyonyo ebe ndị hụrụ ihe mere kọwara etu o si gaa

Ụlọọgwụ ebe Adiele na-anata ọgwụgwọ n'Owerre ekwuola na ha agaghị ana ya ego ọbụla maka ọgwụgwọ a na-agwọ ya.

Onyeisi ndị nleta n'ụlọọgwụ ahụ bụ 'Matron' kwuru na Adiele amaghị ebe ọ nọ mgbe e bubatara ya n'ụlọọgwụ ahụ.

"Mgbe e butere ya, ọ machaghị ebe ọ nọ, ihe ọ na-ekwu bụ ka ahapụ ya ka ọ laa be ya".

"Anyị na-ekele Chineke na ndị mmadụ nọ nso mgbe ọ danyere n'ime mmiri ma hụkwa ebe ọ nọ n'ime mmiri ma zọpụta ya", ka o kwuru.

Ọnụ na-ekwuru ụlọorụ nchekwa nke 'Civil Defence' na steeti ahụ bụ Chimezirim Norwel, kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.

Akụkọ kwukwara na ọ bụ n'ihu ụlọọrụ Civil Defence ka otu nwoke na-ere ekwentị na ndị ọzọ zọpụtara nwaada ahụ.