You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
CBN eyiharịala ma bulie ịdọrọ ego ATM site N100,000 ruo N500,000
Akwụkwọ ozi na-ekwu na ụlọakụ kachasị na Naijirịa bụ Central Bank of Nigeria ebuliela ọnụ ọgụgụ ego mmadụ nwereike ịwere kwa izuụka n’igwe ATM site n’otu puku narị naịra ruo puku narị naịra ise ebe ụlọọrụ agaghị abụzị puku narị naịra ise ma bụrụzịa nde naịra ise.
Ha kwuru na ha mere mgbanwe a dịka ndị mmadụ tụnyere uche ha maka atụmatụ iwetu ego e nwereike ịdọrọ n’igwe ATM kwa izuụka.
Akwụkwọ ozi a kwuru na ọ bụrụ na ego mmadụ chọrọ iwere karịrị dịka ha siri kwuo, na onye ahụ ga-akwụ 3% n’ime ego ọ chọrọ iwere ebe ụlọọrụ ga-akwụ 5% n’ime ego ha chọrọ iwe.
Ọzọ kwa a bụrụ na ụlọakụ ga-anata onye ahụ:
1) Akwụkwọ njirimara onye ahụ ( National ID card, International Passport, Drivers License)
2) Akara Bank Verification Number onye a na-enye ego
3) Tax Identification Number onye na-akwụ na onye a na-enye ego a.
4) Akwụkwọ ikike nke si n’aka onyeisi ụlọakụ e si ewewre ego a.
Akwụkwọ ozi a kwuru na atụmatụ ọhụrụ ga-adị ire site n’ụbọchụ itolu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 ma sịkwa na ọ ga-akagbu atụmatụ ego nke ha hiwere n’ụbọchị 6 nke ọnwa Disemba afọ 2022.
Dịka Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa wepụtara iwu ọhụrụ gbasara etu ndị mmadụ si adọrọ ego n'ụlọakụ, ọtụtụ ndị mmadụ atamuola ntamu n'ihi mgbagwojuanya etu ya bụ iwu ga-esi metụta ha.
Cheta na iwu ọhụrụ a CBN tinyere ga-amalite ịdị ire n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwari 2023.
Otu n'ime iwu ọhụrụ a bụ na mmadụ agaghị enwe ike ịdọrọ ego karịrị 20,000 naịra site n'igwe ATM maọbụ POS n'otu ụbọchị.
Onye ọ bụla mere nke a ga-akwụrịrị 1000 naịra maka 20,000 ọbụla, nke pụtara 5%.
Iwu a kwukwara na akwụkwọ ego ndị ụlọakụ ga na-etinye n'igwe ATM agaghị agafe akwụkwọ narị naịra abụọ.
Ndị ọkachamara gbasara okwu akụnụba nakwa ego etinyela ọnụ iji kọwaa uru nakwa ọghọm ga-esi n'iwu ọhụrụ a pụta.
Katch Ononuju bụ ọkachamara n'okwu akụnụba gwara BBC Igbo na iwu ọhụrụ a CBN wepụtara bụ ọrụ ha ka ha na-arụ.
O kwuru na ọ bụ ihe dịịrị CBN ihazi etu e si ejikwa ego na Naịjirịa.
Dịka Ononuju si kọwaa uru iwu ọhụrụ a ga-aba gụnyere:
- Ibelata etu ego si efegharị na Naịjirịa
- Ọ ga-enye aka ka ndị mmadụ matawanye uru ọ bara bụ iji tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ nakwa akụrụngwa ekwentị ezipu nakwa anabata ego
- Ọ ga-ebelata etu e si eji ego eme mpụ dị icheiche dịka ịzụ vootu n'oge ntuliaka
- Ọ ga-eme ka ndị nọ n'ime obodo mata ihe ekwe na-akụ n'ụwa
Ononuju kwuru na onweghị ihe ọbụla n'ụwa dizu mma, kama ọ bụ dịka oge na-aga, ndị mmadụ ga na-amụtawanye ụzọ ka mma isi eme ihe dị icheiche.
Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu na akụrụngwa tekịnụzụ e ji ezipu ma na-anabata ego anaghị arụcha ọrụ nke ọma na Naịjirịa mana iwu ọhụrụ a ga-eme ka ndị ụlọakụ lebaa anya n'akụrụngwa ha ma mee ka ọ kawanye mma.
N'okwu nke ya, Okechukwu Okere bụ ọkammụta na ngalaba 'Economics' kwuru na mbọ CBN na-agba ibelata etu ego si esi n'aka fere n'aka na Naịjirịa bụ ihe dị mma.
Nke a bụ maka na nrụrụaka na-aka mfe ime site n'iji ego a hụrụ anya karịa iji tekịnụzụ ezipu maọbụ anabata ego.
Iji akụrụngwa tekịnụzụ ezipu maọbụ anabata ego bụkwa njirimara obodo meperela emepe, Okere kwuru.
Mana mperi dị n'iwu ọhụrụ a bụ na akụrụngwa teknụzụ kwesịrị ime ka nzipu na nnabata ego dịwanye mfe, anaghị arụ ọrụ nke ọma na Naịjirịa.
Iji maa atụ, Dkt Okere kwuru na ọtụtụ oge ka mmadụ ne-ezipu ego site n'ekwentị ya, ego ahụ apụọ n'ọbaego ya, mana onye o zigaara ego agaghị enweta ya.
Ọzọkwa bụ na ị gaa n'ọtụtụ ime obodo na Naịjirịa, ịntaneetị adịchagị maọbụ ike ha agagghị ebuli nzipu na nnabata ego dịka ọ dị n'obodo ndị mepere emepe.
"Ihe ndị a ka gọọmentị kwesịrị ibu uzo tinye anya, mee ka ha na-arụ ọrụ otu o kwesịrị tupu etinyezie iwu dị otu a," Dkt Okere kwuru.
"Maka na dịka ọ dị ugbua, ihe iwu a ga-eme bụ ime ka ihe siwanyere ọtụtụ ndị Naịjirịa ike."
Lee iwu ọhụrụ a Central Bank tinyeburu n'uju
Iwu ọhụrụ ndị a gụnyere;
- Ego mmadụ nwere ike ịdọrọ n’ime ụlọakụ kwa izuụka agaghị akarị otu puku narị naịra (N100,000) ebe nke ụlọọrụ agaghị akarị puku narị naịra ise (N500,000), ma ọ bụ onye ahụ pasentị ise na ebe ụlọọrụ ga-akwụ pasenti iri n’ego ọbụla ọ chọrọ ịdọrọ.
- Onye ji akwụkwọ ‘cheque’ ego dị na ya karịrị puku iri ise (N50,000) agaghị adọpụtali ego ahụ n’ime ụlọakụ.
- Naanị otu puku narị naịra (N100,000) ka mmadụ nwereike ịdọrọ site n’igwe Automated Teller Machine (ATM) kwa izuụka, ebe puku naịra iri abụọ (N20,000) ga-abụ kwa ụbọchị.
- Naanị akara akwụkwọ ego narị naịra abụọ (N200) gbadata ala ka ụlọụka ga na-etinyezi n’igwe ATM ha.
- Ego kachasị i nwereike ịdọrọ n’aka ndị na-enye ego n’akụkọ ụzọ bụ point of sale (PoS) agaghị agafe puku naịra iri abụọ (N20,000) kwa ụbọchị.
- Ọ bụrụ n’ọnọdụ gbatagbata, ego ole mmadụ nwereike ịdọrọ agaghị agafe nde naịra ise (N5,000,000) ebe ụlọọrụ ga-abụ nde naịra iri (10,000,000) kwa ọnwa. Mana onye ahụ ga-akwụ ụgwọ nọ n’elu ya ma gosi akara njirimaara dị iche iche gụnyere BVN na ihe ndị ọzọ.
Iwu ọhụrụ a ga-amalite rụwa ọrụ n’ụbọchị 9 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.
CBN sị na ha mere nke na mbọ ha na-agba n’ime ka naịra sie ike bụkwa nke ha malitere site n’ịgbanwe ihu ego narị abụọ, narị ise na otu puku naịra (N200, N500 na N1000).
Chet na ụlọakụ etiti site na nkwado Onyeisiala Muhammadu Buhari gbanwere ihu ego ndị a n’ọnwa Nọvemba 23, 2022.