You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
“Ọ bụ arụ nwoke iji nwunye ya edochi anya nne ya ebe nne ya ka-adị ndụ” - Ebuka Obi
Onye mgbasaozi ọma a ma ama bụ Chukwuebuka Obi akọwaala ihe mere o jiri ekwusike na o nweghi onye ọbụla ga-ahụ nwoke n’anya karịa nne ma ọ bụgodi nwunye nwoke ahụ.
Na mkparịtụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru sị “nwunye gị agaghị e mere gị ihe nne gị ga-emere gị.”
Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụrụ na a tụgịde nwoke ahụ egbe n’isi, na ihe nwunye ya ga-eme bụ ibe akwa mana nne nwoke ahụ ga-asị kama a ga-agbagbu nwa ya ka a gbagbuo ya onwe ya.
“Nne gị nwereike ịnwụchitere gị ọnwụ mana nwunye gị agaghị eme ya.”
Ọ sị na okwu ya bụ maka ụmụnwoke na-eji nwunye ha edochi anya nne ha ọkachasị mgbe nwunye ha ka nọ ndụ ma ghara ileta ya anya, na ọ bụ arụ.
“Ọ bụ arụ nwoke iji nwunye ya edochi anya nne ya, ebe nne ya ahụ ka-adị ndụ”
N’aka nke ọzọ, o tinyekwara ọnụ n’ihe banyere nwoke maọbụ nwaanyị idina ụdịdị ya ma sị na ọ na-ewute ya nke ukwuu.
Ọ jụrụ sị “Ị hụtụla ebe oke nkịta na-edina ibe ya, maọbụ ebe mkpị na-edina ibe ya? Ihe ndị ahụ bụ arụ.”
Ebuka Obi gakwara n’ihu katọọ mmetọ dị iche iche ndị mmadụ na-eme site n’aha ịkwako nke gụnyere nwoke ịracha ike nwaanyị.
O kwuru na ihe ndị ahụ bụkwa arụ ma sị na mmepe ọgbara ọhụrụ wetere nnukwu njọ karịa ihe ndị dị mma o wetere.
Ọ zakwara ajụjụ banyere ezinaụlọ ya ebe o kwuru na nne na nna ya ka-adị ndụ. Aha ha bụ Ogbueghi Vincent na Veronica Obi bụ ndị rụrụ ọrụ nkuzi ruo mgbe ha lara ezumike nka.
Ọ sị na nne na nna ya mụrụ ụmụ asaa, nwaanyị anọ na nwoke atọ.
Ọ sị na a mụrụ ha ụmụ ejima nwoke abụọ, ebe ha tọkwara ụmụeji nwoke na nwaanyị.
Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;