You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Igbo widowhood Practices: Ụfọdụ 'omenala mmegbu' megide ụmụnwaanyị isimkpe ọ ka dị ire ugbua?
A bịa n’omenala Igbo, a na-akwanyere nwaanyị ugwu n’ebe ọ pụrụiche maka uru ha bara n’ezinaụlọ nakwa obodo.
Nwaanyị a na-enyekaarị nkwanye ugwu a bụ nwaanyị tozurula agbọghọ, lụọ di ma mụta nwa, nke mere Igbo jiri tụọ ilu sị na “mma nwaanyị bụ di ya.”
Na-agbanyeghi ụdịrị mma ọbụla ọ mara ma ọ bụ ụdịrị akụnaụba o nwere, ugwu ya agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na ọ lụbeghi di mụta nwa.
Ọ bụrụ na di ya nwụọ, ihe niile banyere nwaanyị ahụ ga-agbanwe n’otu ntabi anya. Aha ya ga-agbanwe bụrụzie nwaanyị isimkpe maọbụ nwaanyị ajadu.
Mgbe ụfọdụ ugwu niile o nwere ga-ala, a na-ahụtazi ya dị onye ọjọọ, ụfọdụ na-ebo ya ebubo igbu di ya.
A ga-ebido na-akpasị nwaanyị a agwa ọjọọ dị iche iche bụ nke omenala Igbo kwadoro.
O nweghi onye ga-akọwa kpọmkwem etu maọbụ mgbe omenala a malitere kama ọ bụ ihe malitere mgbe gboooo.
Akụkọ a ga-eleba anya n'ụfọdụ agwa ọjọọ ndị a na-akpasị ụmụnwaanyị isimkpe n'aha omenala, nke ka dị ugbua nakwa ndị a kwụsịrịla.
Ụfọdụ omenala na-akpagbu ụmụnwaanyị isimkpe
Ọnụ na-ekwuru otu na-ahụ maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị a kpọrọ ‘Women Aid Collective (WACOL)’ bụ nwada Egodi kọwara ụfọdụ mmegbu a a na-emegbu ụmụnwaanyị isimkpe n'aha omenala Igbo.
Ịnọ na nsọ
Nke a bụ mgbe a na-edopu nwaanyị di ya nwụrụ ( ajadu) iche n’ebe ndị mmadụ ọzọ nọ maka na a na-ahụta ka onye ruru unyi. Ndị mmadụ agaghị eru ya nso ruo mgbe a sapụrụ ya ọcha.
Ịnọ ọdụ n’ala
Mgbe ụfọdụ ụmụada obodo ebe a lụrụ nwaanyị ahụ na-amanye ya n’ike ka ọ na-anọdụ n’ala ụkpọrọ, iji igosi na o sila n’oche onye lụrụ di daa n’ihi ọnwụ di ya. Mgbe ahụ ugwu niile agwụla.
Nwaanyị na ozu ihikọ ụra
Nke a omenala a na-asị nwaanyị nọrọ n’akụkụ ozu di ya maọbụ ka ohie ụra n’ụlọ ebe e dosara ozu di ya. A si na ọ bu otu ụzọ nwaanyị isimkpe ji akwanyere ozu ahụ ugwu ikpeazụ.
Iru uju n’ọha
Nke a bụ mgbe a na-amanye nwaanyị isimkpe n’ike ka o bee akwa n’ebe ọha ga-anụ olu akwa iji gosi na ọnwụ di ya na-emetụ ya n’obi nke ukwuu. A na-esi nwaanyị a bee akwa n’isi ụtụtụ ụbọchị ọbụla malite mgbe di ya nwụrụ ruo mgbe e lichara ya.
Ịṅụ iyi
A na-eme ka nwaanyị di nwụrụ ṅụọ n’ụzọ di iche iche iji gosi na aka ya dị ọcha n’ihe banyere ọnwụ di ya, maọbụ na o nweghi akụnaụba di ya o ji. A na-eme nke a site n’ịmanye ya n’ike ka ọ ṅụọ mmiri e jiri saa ozu di ya ahụ maọbụ ịga n’ihu arụsị kwubie okwu.
Ndị ọzọ gụnyere;
Ịkpụ ntụtụ si nwaanyị
Ike nwaanyị agbụ n’aka (starvation)
Ịsa ahụ n’elu ili di ya
Iyinye nwaanyị akwa mkpe ọnwa isii maọbụ otu afọ
Ikuchi nwaanyị di ya nwụrụ n’ike (Ịlụrụ ya n'ike)
Iyi akwa ojii maọbụ nke ọcha agba mkpe.
Ịnapụ nwaanyị akụnaụba di ya n’ike dgz.
Omenala ndị a ọ kwụsịla?
Nwada Egodi kwuru na ụfọdụ 'omenala mmegbu' ndị a ka dị ire n'ụfọdụ obodo n’ala Igbo mana ọtụtụ n'ime ha alaala.
“Mmegbu a na-emegbu nwaanyị isimkpe kadị mana ọ bụzighi etu ọ dị na mbụ ka ọ dị ugbua maka na ụfọdụ obodo enweela ọtụtụ mgbanwe kama mgbanwe ahụ ezuchabeghi oke.”
O kwuru na mmegbu ndị a na-agbakwasị ụkwụ n’ihe dị icheiche dịka ụmụ ole ọ mụrụ, ọ mụtara ụmụnwoke ka ọ bụ naanị ụmụnwaanyị, ụmụ ya etoola ka ha ka dị obere mgbe di ya nwụrụ dgz.
“Etu e si emegbu nwaanyị isimkpe mụrụ nwa dị iche na etu e si emegbu nke na-amụtaghị nwa, ọ dịkwa iche na nke mụrụ naanị ụmụnwaanyị nakwa nke mụtara ụmụnwoke, ma dịkwa iche na nke ụmụ ya na-etochaala nakwa nke ụmụ ya ka dị obere.”
Egodi kwuru na ọtụtụ obodo n’ala Igbo akwụsịla ụdịrị mmegbu ndị a site n’enyemaka ndị ụka Kraịst bụ ndị na-abịa ewere ọnọdụ ma ọ bụrụ di nwaanyị ahụ nwụọ ọkachasị ma ọ bụrụ ndị na-aga ụka.
Ọ gara n’ihu kwuo na nkwụsị ndị a sikwa na mgbasaozi nke ụlọọrụ ha bụ WACOL na-agbasa, nke na-ekwu ka e megbula ụmụnwaanyị isimkpe.
Egodi kwuru na otu agwa ọjọọ a na-akpasị ụmụnwaanyị isimkpe ka dị ugbua bụ ịnapụ akụnaụba di ha n’ike.
“Ọtụtụ ezinaụlọ ebe a lụrụ nwaanyị ka na-anapụ nwaanyị akụnaụba di ya n’ike ma ọ bụrụ di ya ahụ nwụọ, mgbe ụfọdụ nwaanyị ka ga-anọ na-eruju ọnwụ di ya, mana ndị ezinaụlọ di ya ahụ ga-akpachi akụnaụba nwoke ahụ gụnyere; ụlọ obibi, ụgbọala, ọbaego, ụlọahịa nakwa ụlọ nrụpụta ihe.
“Ọtụtụ oge ọ bụ nwaanyị ahụ na di ya gbara mbọ, taa ahụhụ rụpụta akụnaụba ndị a mana ụmụnne di ya agaghị achọ ịma kama ha ga-anapụ nwaanyị ihe ndị ahụ n’ike.
O kwuru na ọtụtụ mkpesa na-abịa n’ụlọọrụ ha bụ WACOL bụ maka ụmụnwaanyị isimkpe ezinaụlọ di ha napụrụ akụnaụba di ha n’ike.
O kwuru na ụlọọrụ ha na otu ndị ọzọ dị iche iche na-eme ọgbakọ n’etiti ha na ndị Igwe obodo, ndị ntoroọbịa, ndị ụmụada obodo nakwa ndị ndu iji hụụ na a kwụsịrị ụdịrị.
Ụzọ niile a e si akpagbu nwaanyị di ya nwụrụ (nwaanyị isimkpe), abụghị ka ọ dị ma a bịa n’okwu nwoke nwunye ya nwụrụ.
Nwoke nwunye ya nwụrụ nwere ikike ịkwa ozu nwunye ya etu masịrị ya, mgbe masịrị ya nakwa iru uju nwunye ya etu ọbụla o siri chọọ.
Onweghi onye na-asị nwoke a bịa kpụọ isi, ṅụọ iyi, yiri akwa mkpe maọbụ mee ihe ndị ọzọ maka na nwunye ya nwụrụ.
Ya mere otu dị iche iche ji akpọ oku ka a kwụsị ụfọdụ agwa ndị a na-akpaso ụmụnwaanyị di ha nwụrụ ọkachasị ndị nke megidere ikike dịịrị ha dịka mmadụ.