Ọgbọnọ: Etu e si akọpụta ya site mkpụrụosisi ruo ite ofe
Ọtụtụ ndị ka ofe ọgbọnọ na-amasị kama ha amaghị etu esi emepụta ya.
Ọgbọnọ bụ ofe na-alọ alọ dịka nke ọkwụrụ kama ọbụghị ọkwụrụ ka eji eme ya.
Ọ bụ ndị bi na mpaghara ndịda Naijirịa kacha eri ya bụ ofe.
BBC Igbo zọpụrụ njem iji mata etu na ebe esi emepụta ya bụ ọgbọnọ.

Ihe ị kwesịrị ịma maka mkpụrụ ọgbọnọ
Ọgbọnọ bụ mkpụrụọsịsị ndị mpaghara bi n'okpuruọchịchị Boki nke dị na Krọs Rịva steeti na-akpọ 'Bush Mango'. Ọ na-etokwa na mpaghara ala Igbo dị icheiche dịka Anambra, Enugu, Ebonyi, Imo na Abịa steeti
Ọ bụ n'osisi dị n'ọhia ka ha si enweta ya na mbụ. Mgbe gboo Ogbono anaghị eto n'ụlọ.
Ọ bụ n'ime ọhịa ka o na-eto.
Ụmụnwaanyị na-aga n'ime ọhịa ndị a na-atụtụ mkpụrụ ya. Ọ nweghị onye nwe ukwu ọgbọbọ toro n'ọhịa.
Nke a mere ka ụmụnwaanyị na-ata oke ahụhụ ebe ha na-achọ ọgbọnọ.
Nke a meree ka ndị na-ahụ maka ọdịmma ọhịa nke bụ Wildflife Conservation Society (WCS) tụtara ha aro ma kụzịkwara ha etu ha ga-esị akụ osisi ọgbonọ n'ụlọ iji gbalahụ ntaramahụhụ so ịba n'ime ọhịa .
Juliet Ntui nke WSC kuziere ha etu e si akụ ọgbọnọ n'ụlọ, kuzikwaara ha ebe ha ga na-ere ya n'Ebonyi steeti ebe ha na-ere ya n'Eke Abakaliki.
A na-ere otu penta ọgbọnọ ihe dịka puku naịra itolu.
Kirie akụko a n'uju ya ka ị mata ihe ndị ọzọ dị mkpa maka Ọgbọnọ.
Obi dị ụmụnwaanyị Apo ọgbagante dị n'Okpuruọchịchị Boki, Kros Riva steeti ụtọ maka nkụzị ndị WSC dịka ọtụtụ n'ime ha jigoro ya na-enyere ezinaụlọ ha aka.













