Etu ndị na-enye aka amụpụta nwa si egbusi ụmụaka ndị nwaanyị ma mechaa na-azọ ndụ ha

    • Onye dere ya, Amitabh Parashar
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Eye Investigations
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Onye na-enye aka amụpụta nwa a kpọro 'midwife' Siro Devi dakwasiri Monica Thatte n'ahụ na-ebe akwa. Monica dị afọ karịrị afọ ịrị abụọ lọghachịtara ebe a mụrụ ya n'India bụ ebe Siro na-enyere ụmụnwaanyị dị ime aka ịmụ nwa, mụrụ ọtụtụ ụmụaka.

Na mpaghara India ebe ahụ bụ ebe a na-amanye ndị nọọsụ na-amụ nwa ka ha pigbuo ụmụaka nwaanyị a mụrụ ọhụrụ.

Mana enwere ihe na-egosi na Monica dịka otu nwa nwaanyị n'ime ndị Siro Devi zọpụtara ma hara igbu ha oge a mụrụ ha.

A na m eso akụkọ gbasara Siro kemgbe afọ iri atọ m gbachara ya na ụmụnwanyị anọ ndị ọzọ ajuju ọnụ na mpaghara Bihar dị na India n'afọ 1996.

E were oge e boro ya na ụmụnwanyị ndị ọzọ ebubo igbu ụmụaka ụmụnwanyị a mụrụ ọhụrụ na Katihar bụ ebe nne na nna ụmụaka ahụ na-amanye ha n'ike ka ha were ọgwụ gbagbuo ha ma ọ bụ jiri aka pịgbụọ ha.

Hakiya Devi kwetere na ya egbuola ihe dị ụmụaka nwanyị 12 ma ọ bụ 13. Onye ọzọ bụ Dharmi Devi kwetere na ya gburu ihe ruru ụmụaka nwanyị 15 ruo 20.

Ọ bụ ihe tara-akpụ ịmara ụmụaka nwanyị ole ha gburu ma a tulee ka e si nwete ndeko gbasara ya

Mana n'akụkọ nyocha oyu ndị ọrụ ebere nere n'afọ 1995 bụ ebe a gbara ụmụnwayị iri atọ ajuju ọnụ, ụmụaka nwanyị 1000 ka ha wereike ị na-egbu afọ niile. Mana Bihar were ndị midwife ọnụ ọgụgụ ha ruru ọkara nde. Igbu ụmụaka abụghị sọ naanị na Bihar ka a na-egbu ha.

Ị sị na gị agaghị egbu ụmụaka nwanyị ahụ abụghị ihe midwife ọbụla ga-awale "maka na ezinaụlọ ha ga-agbachị ụzọ jide osisi mkpara n'aka ma na-eche ihe anyị ga-eme"

Hakiya Devi kwuru na "ọtụtụ ga-agwa anyị na ha amụọla ụmụaka nwanyị anọ ma ọ bụ ise, na nwa nwanyị ọzọ ga-ekpochapu akụnụba ha".

"Ha na-asị ka anyị gbuo ụmụaka ahụ maka na "Ọ bụlụ na ha zụchaa ihe niile ụmụnwanyị ha mụrụ ga-eji laa be dị ha, na ha ga-ada ogbenye ma kwụrụ agụụ ruo na ha awụọ"

"Onye ka anyị ga ekpesere ihe mere? Ụjọ ji anyị aka. Anyị gaa gwa ndị uweoji, anyị ga-abanye na nsogbu. Anyị kwuputa ihe mere, ezinaụlọ ahụ ga-enyi anyị egwu"

Ndị na-amụ nwa na India na-abụkarị ndị dara ogbenye. Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị mụtara ka-esi amụ nwa n'aka nne ha ma ọ bụ nne-nne ha.

N'India ndị dara obenyi enweghị ọnụ. Ndị were akụnụba na-akpagbu ha. Ndị ogbenye ga-emeriri ihe a gwara ha mee ma ọ bụ ata ahụhụ nke ukwuu.

Na mba ahụ, ọ bụrụ na nwanyị dị ime mụọ nwoke, ndị na-amụpụta nwa na-enwete ego ruru 1000 rupees mana ọ bụrụ nwanyị a na-akwụ ha ọkọra ego ahụ.

A na-ekwekwa ụmụnwanyị na-amụpụta nwa nkwa ihe dịka akpa nrị, sarị ma ọ bụ ego ka ha nweike ikwete gbuo nwa nwanyị amụrụ ọhụrụ, mana ọtụtụ oge, ezinaụlọ ahụ adịghị emezu nkwa ha.

Ihe na-akpata nsogbu a niile na-arụtụ aka n'omenala India bụ ebe ezinaụlọ mụrụ nwanyị ga-azụta akatamkpo ihe ha ga-eji duo nwa ha nwanyị ụlọ ma ọ chọọ ịga be dị ya. Mana na-agbanyịchị na iwu machịrị oke mmefu ego ahụ n'afọ 1961, ndị mmadụ ka na-eme ya n'India. Ọtụtụ na-ahụ ịmụ nwoke dịka ihe mmemme na oriri ma na-ahụ ịmụ nwanyị dịka ihe mgbawa obi na mmefu ego.

Mana Siro Devi bụ naanị onye na-amụpụta nwa ka dị ndụ na ndị niile m gbara ajuju ọnụ afọ iri atọ garaaga.

"A na ahụ ụmụaka nwoke n'anya nke ukwuu karịa ụmụaka nwanyị n'India"

N'afọ 1996 ihe mgbanwe bidoro na-eme oge Anila Kumari bidoro na-akwado ụmụnwanyị na-amụpụta nwa na mpaghara Katihar.

Anila bia ọ jụọ ha ma ọ bụrụ nwa ha ka-asị gị gbụọ, ha aga-egbu ya?

O mekwara ụmụnwanyị ndị ahụ ebido na-enwete enyemaka. Ndị mmadụ na-akwado ha ma na-enye ha ego nke mere ka mmanye ndị mmadụ na amanye ha na-akwụsị.

Siro gwara m okwu n'afọ 2007 ma kwuo na e were mgbanwe n'ọnọdụ ha.

"Ugbua onye ọbụla gwara m kugbuo nwa ya, m ga-agwa ya ka m kpọrọ nwa ahụ kpọgara Anila Madam"

Nke a mere ndị na-amụpụtanwa jiri zọpụta ọtụtụ ụmụaka a chọrọ igbu ma ọ bụ gbahapụ.

Nke a mere m ji chọọ ịmara ihe mere ụmụaka ahụ azọpụtara. kedu ka ọnọdụ ha dị kemgbe a zọpụtara ha.

Kirie: Mkwupụta onye 'midwife' ahụ

Afọ irị atọ garaaga ka otu onye nta akụkọ n'India mere ihe onyonyo ebe ndị na-amụpụta nwa na-ekwuputa etu ha si gbuo ụmụaka nwanyị a mụrụ ọhụrụ

Kirie ya n' iPlayer (naanị n'UK ), ma ọ bụ na YouTube

Gee ntị: Nụrụ ihe ndị na-amụ nwa (Midwives) na-ekwu ihe ha mere

BBC Eye chọtara otu nwanyị na ndị ahụ a zọpụtara ma hara igbu ha!

Kirie ya BBC Sounds (naanị n'UK ), ma ọ bụ na nke a maka ndị na-anọghị n'UK Were ntị gị nụrụ ya ebe a

Anila gwara m na ya yere ụmụaka niile ya zọpụta aha dị iche dịka ịgbakwunye "Kosi" n'aha ha. Kosi bụ aha mmịrị dị na Bihar.

Oge m na ndị BBC World Service Team jokoro aka ọnụ, anyị chọpụtara otu onye a na-akpọ Medha Shekar bụ onye mere nyocha ihe gbasara igbu ụmụaka n'90s.

N'aka Medha ka anyị ji weta otu onye ndeko niile na-egosi na o so na ndị a zọpụtara aha ya bụ Monica.

Oge m jere hụ Monica na Pune bụ ebe ya na-ezinaụlọ kpọorọ ya n'oge ọ dị obere ka ọ gwara m na ezinaụlọ ahụ mere ya nke ọma, ma bụrụ ezinaụlọ nwere ihunanya.

Monica mana ọ bụ na Bihar ka e si kpọrọ ya. Mana anyị mepere ya anya gbasara ihe mere tupuu eduru ya.

Monica gara hụ Anila na mbido afọ a ma na-ahụ onwe ya dịka ezi mkpụrụ ọrụaka ndị na-amụpụta nwa.

"Ihe a dịka ndị gbachara mbọ were na-eche ka ọ mịta ezi mkpụrụ. A chọrọ m ịhụ ha"

Anila bere akwa oge ọ hụrụ Monica. Anila bere nnukwu akwa ma jidesie Monica ike. Mana Siro amaghị etu ahụ dị ya.

“A kpọọrọ m gị dụga gị ebe ndị enwe nne enwe nna na-anọ ka m zọo ndụ gị. Obi m ga-anọ n'udo ugbua”.

Mana oge m juru Siro ajuju gbasara ihe mere na 60s, ekweghi ekwu ihe ọzọ mere oge ọ zọpụtara Monica na ka ọnọdụ ha dị oge ahụ.

"ihe mere na mgbe garaaga bụ ihe garaaga" ka o kwurur.

Mana otu ihe na-esoghịụ n'ihe garaaga bụ mkpagbu a na-akpagbu ụmụaka nwanyị rụọ taata.

Ịgbụ nwanwanyị a mụrụ ọhụrụ na-ebeleta mana nke ka dị bụ itupu ime nwanwayị n'afọ n'agbanyịghị na ịwụ machịrị ite-ime kemgbe 1994.

Ka anyị ka na-eme onyo a, anyị hụrụ obelenwa e tufuru na Katihar n'ime ọfịa, ebe nwa ọzọ ka a tufuru n'akụkụ ụzọ. Mana otu n'ime ụmụaka ahụ abụọ wụrụ ebe otu ezinaụlọ bịara kpọrọ nke ọzọ.

Mana tupuu Monica ahapụ Bihar, ọ gara hụ ebe a na-akpọrọ ụmụaka nne na nna ya tufuru dị na Katihar.

O kwuru n'agbanyịghị na igbu ụmụaka na-ebenata, mana ọtụtụ ka na-atufu nwa ha nwanyị.

"Ọ dị ka ọ bụ m ka a tụghapụrụ... a na m ahụ onwe m n'ime ụmụaka abụọ e tufuru".

Mana otu ezinaụlọ kpọọrọ otu nwa ahụ e tufuru ma baa ya aha, kpọ ya Edha nke pụtara obi anụrị".

Gaurav na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị agha ugbọelu n'India kwuru na "anyị hụrụ foto nwatakiri nwanyị a ma kpebie na anyị ga-eduru ya".

Gaurev na-ezitara m onyonyo Edha kwamgbekwa mgbe. Oge ụfọdụ m na-ezigara ya Monica.

Ọ bụrụ na m leghachị anya n'azu ihe dịka afọ ịrị atọ garaaga, ị ga-ahụ na afọ niile anyị tinyere n'akụkọ abụghị maka ihe mere n'oge garaaga, mana ọ bụ ka akwụsị ma gbanwe ọnọdụ.