You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị uweojii amalitela ikposa ndị ọrụ ENTRACO n'Imo steeti
Ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha amalitela ikposa ndị ọrụ Environmental Transformation Commission (ENTRACO) gburugburu steeti ahụ.
N'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde 13 Nọvemba 2025, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye sịrị na ha amalitela itinye iwu ahụ n'ọrụ dabere na ntuziaka gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma nyere ha.
Okoye sịrị na Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma enyela ntuziaka ka ndị Area Commander niile, ndị Divisional Police Officer niile na ndị Tactical Commander niile hụ na e mezuru ntuziaka a.
Dịka o siri kwuo, ndị uweojii ga-anwuchi onye ọbụla ji aha ENTRACO arụ ọrụ n'Imo steeti ma kpụpụ ya n'ụlọikpe.
"Na mgbakwunye, ndị uweojii na-agbakọọrọ Gọọmenti Imo steeti aka na nnyocha a na-eme maka omume ndị ọrụ na ụlọọrụ ENTRACO".
"Anyị ga-enyocha mkpesa ndị nke bụ eziokwu e nyere megide ndị ọrụ ENTRACO gbasara omume ọjọọ, nnapụ maọbụ mmetọ, ebe ndị aka ha dị na ya ga-anata ntaramaahụhụ kwesịịrị ha," ka Okoye kwuru.
Ọ gara n'ihu gwa ndị niile nwere mkpesa maọbụ ozi ndị bara uru ka ha gaa na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii State Criminal Investigation Department (SCID) dị n'isi ụlọorụ ha n'Owere.
Gịnị mere Gọọmenti Imo steeti jiri kwụsị ụlọọrụ ENTRACO ọrụ?
Gọọmenti Imo steeti akwụsịtụla ụlọọrụ Imo State Environmental Transformation Commission (ENTRACO) ọrụ maka iji aka ike arụ ọrụ na mkpesa ndị mmadụ na-ewete banyere ha.
Nkwụsị ahụ bidoro n'ụbọchị Monde abalị iri nke ọnwa Novemba n'afọ 2025 dịka ndị mmadụ na-arụ ndị ENTRACO aka banyere ọnwụ otu onye nakwa onye ọzọ meruru mgbe ụgbọala ndị ọrụ ENTRACO kpalitere ihe mberede mere n'ebe St. Mulumba–Akachi dị n'Owerri, Imo steeti.
Odeakwụkwọ Gọọmenti Imo steeti nakwa onye ndụmọdụ pụrụiche na mgbasaozi bụ Oguwike Nwachukwu kwuru na nkwụsịtụ ọrụ a kwụsịrị ndị ENTRACO bụ maka ihe ahụ mere nakwa mkpesa a na-enwete banyere etu ha si arụ ọrụ.
N'okwu ya "bido ugbua, Gọvanọ Hope Uzodimma akwụsịla ọrụ ndị ENTRACO niile ugbua".
"Nke a bụ maka ihe mere butere ọnwụ otu onye nakwa onye nke ọzọ meruru ahụ nọ n'ụlọọgwụ, nke etu ndị ENTRACO si arụ ọrụ butere".
Etu onye ENTRACO si jiri ụgbọala gbuo mmadụ - Onye hụrụ ihe mere
Otu onye gwara BBC News Igbo okwu na-achọghị ka a hụta ihu ya maọbụ mara onye ọ bụ kwuru na ya hụrụ mgbe mkpamkpa ahụ kpara nke butere ọnwụ otu nwoke n'Owerri, Imo steeti.
Ọ kọwara etu ihe ahụ siri mee ma kwuo na "a hụrụ na ọ bụ ụgbọala Ford Jeep onye ọrụ ENTRACO na-anya, mana ọ dịka ụgbọala ha natara mmadụ, ọ bụghị onye nwe ụgbọala ahụ na-anya ya".
"Onye ọgbaatumtum na-agara onwe ka ọ kụturu. Mmadụ abụọ nwụrụ ozugbo ozugbo. Onye nke atọ bụ n'ime awa mmiri ka anyị sị kupụta ya ma buga ya n'ụlọọgwụ St. Johnpaul Hospital dị nso n'ebe ihe ahụ mere".
"Ọ bụ waa waa waa onye ENTRACO ahụ na-anya ka o jiri were ụgbọala kụọ onye ọgbaatumtum, kurie ya elu. Otu onye n'ime ndị ahụ ọ kụrụ ka ụkwụ ya gbariri agbari".
"Ma onye ọkwọ ọgbaatumtum na onye o bu n'azụ ka ha kụrụ ihe ahụ".
Gịnị bụ ụlọọrụ ENTRACO, ọrụ ha na iwu guzoro ha?
ENTRACO bụ ụlọọrụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi nakwa iwu gbasara ịkwọ ụgbọala n'Imo Steeti.
Ọ bụ mkpọbi okwu Environmental Transformation Commission nke iwu guzobere ya bụ Environmental Transformation Law 2008.
Ọ bụ iwu ahụ nyere ya ikike ịrụ ọtụtụ ọrụ dị iche iche nke gunyere ime ka obodo dị ọcha, ikpopụ ahịhịa, ime ka ndị ọkwọụgbọala hara ịda iwu ma ijide ndị dara iwu na ihe ndị ọzọ.
Iwu ahụ nyekwara ha ikike ịna ego a na-akwụ maka ikpochapụ ahịhịa na ego ndị ọzọ dị iche iche.
Dịka gọọmenti Imo steetdi kwụsịtụchara ndị ọrụ ENTRACO ọrụ ha, ka ha dọrọ aka na ntị banyere ndị ga-eji ohere ahụ na-ada iwu okporoụzọ.
Ndụmọdụ a dị n'akwụkwọ ọzị ahụ gọọmenti Imo steeti ji kwụsịtụ ha ọrụ ma gwa ohanaeze ka ha ghara iji ohere ahụ na-ada iwu okporoụzọ nakwa iwu ndị ọzọ.
N'okwu ha "anyị na-agwa ohonaeze ka ha na-edobe iwu niile. Onye ọbụla a hụrụ dara iwu a ga-enye ya ntaramaahụhụ so ya".
"Ịkwụsịtụ ọrụ ndị ENTRACO abụghị inye ndị mmadụ ohere ịda iwu".