Migrant Deaths: Gịnị mere na Melilla?

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba jikọrọ mba Afrịka bụ AU akpọọla oku ka ebido nyocha banyere ọnwụ ndị mbịarambịara ruru mmadụ iri abụọ na atọ nwụrụ na Melilla.
Melilla bụ ebe mba Morocco na mba Spen nwere oke ala.
Akụkọ kwuru na ọdachi a mere dịka ọtụtụ ndị ahụ nwara iji ọsọ gbabanye Melilla iji banye mba Spen.
Ndị ụweojii mba Moroko ji osisi nakwa anwụrụ anya mmiri nwaa ịkwụsị ndị ahụ ibanye ebe ahụ nke butere ọnwụ ha.
Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ na ya bụ ihe na-anata ọgwụgwọ ugbua na mba Moroko ebe otu narị na iri atọ na atọ mezuru uche ha ibanye Melilla.
Ndị uweojii Moroko kwuru na ọtụtụ ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ si na mgbidi kewara mba ahụ na Melilla.
A na-enyocha ndị ahụ ugbua ịmara ma akụkọ ha ji bịa a bụ eziokwu.
Ihe mere Melilla ji dị mkpa

Ebe foto si, EPA
Melilla bụ otu n'ime obodo abụọ bụ oke ala mba Spen dị n'Afrịka.
Ndị mbịarambịara na-ebikarị n'ugwu dị na mpaghara mba Moroko kwenyere na ha rue ebe ahụ, ha eruola mba Spen.
Ọ bụ echieche a butere ihe ahụ mere n'ụbọchị Fraịde dịka ọtụtụ n'ime ha nwara ike ha rue ebe ahụ.
Mana ihe niile adịbughi ka ọ dị taa na Melilla ahụ.
N'afọ ole na ole gara aga, Moroko na Spen na-ese okwu maka onye nwe ala ahụ dịka Moroko na-ekwusi ike na ọ bụ nke ha.
Ka ihe si kwuru ugbua

Ebe foto si, EPA
Dịka ngalaba AU kpọchara oku nnyocha, ndị ọzọ fọrọ n'ebe ahụ na mba Moroko na-eme ngagharị iwe maka ihe mere.
Ha na-ekwu na o dooro anya na mba Spen na mba Moroko jikọrọ aka egbu ha n'ihi na ha bụ ndị isi ojii.
Ọkọlọtọ ha bu si "unu ji okoko anabata ndị Yukren mana maka na anyị bụ ndị ojii unu ezighachi anyị ọkụ mmụọ"
Otu ndọrọndọrọ Unidas Podemos nke mba Spen sooro nzọmụkwụ ndị ahụ mere ngagharị iwe.
Ha kporo oku ka emee nyocha zuruoke banyere ihe mere na Melilla.
Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Pablo Echenique kwuru sị "ọ bụrụ na ndị nwụrụ nwere ntutu na anya ndị ọcha, ndị mmadụ enweeike hụ ihe ọfụma".
Mba Moroko anwụchiela mmadụ iri isii na ise ha sị na aka ha dị n'ọdachi a mere.

Ebe foto si, EPA









