Ọ gịnị na-esere Soludo na Fada Ebube Muonso ọzọ?

Okwu ọhụrụ malitere ifesa na nso nso a dịka Fada ụka Katọlịk ama ama bụ Fada Emmanuel Obimma nke ọha ji aha ‘Fada Ebube Mmunso mara kwuru okwu metụtara aka na-achị Anambra steeti n’emume ụka e ji chụọ afọ 2022.

Obimma bụ onye ndu ọgbakọ ụka ọ kpọrọ Holy Ghost Adoration Ministry dị n'Ọnịcha kwuru okwu n’ihe onyonyo na-efegharị ugbua, sị na ‘Anambra steeti bụ steeti kacha njọ na Naịjirịa ugbua’ dịka ọ rụrụ Gọvanọ Chukwu Soludo aka dịka onye ọchịchị achịtaghịbeghị aja n’okwu mbelata enwgehị ezi nchekwa na steeti ahụ nakwa onye ọchịchị kpatarala ọtụtụ ụtụ isi nye ndị mmadụ.

Onyeisi mgbasaozi gọọmentị steeti ahụ bụ Christian Aburime gwara BBC Igbo n’ụbọchị Tọọzde na okwu ụkọchukwu a kwuru “ezighi ezi ma ncha”.

Ọ gara n’ihu kwuo:

“Oteela o ji akatọ Gọvanọ, naanị ya ma ihe kpatara”

“N’okwu ụtụ isi a nke ọ na-arụ aka, ọ sịrị asị dịka ọchịchị Soludo anaghị ana ndị ọrụ aka dịka ndị ‘Vulcanizer’, ndị na-eri nri nakwa ndị ‘Barber’ ego ụtụ isi ọbụla etu ụkọchukwu a siri kwuo.”

“Ihe niile o kwuru abụghị eziokwu, ọchịchị Soludo ahaziela ọnọdụ nchekwa Anambra steeti n’ụzọ dị mma karịa etu ọ dịbụ n’oge gara aga”

“Tupu ọ malite ọchịchị a na-egbu ndị mmadụ, e wezuga ogbugbu ndị otu nzuzu mere na nso nso, tigbuo zọgbuo nakwa ogbugbu ndi mmadụ n’Anambra adatuola”

Aburime kwukwara na ọchịchị Soludo gbapụtara mpaghara asatọ n’Anambra nke gụnyere mpaghara Ihiala bụ ebe nsogbu enweghị ezi nchekwa na-enye nzogbu kemgbe.

Ọ kọwara na nke bụ eziokwu bụ na okwu ọrụ nchekwa abụghị ọrụ dịịrị gọọmentị steeti kama na ọ bụ gọọmentị etiti ka ọ dị n’aka mana na ọchịchị Soludo agbaala mbọ n'ịbelata ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na steeti ahụ.

O kwukwara na ‘Gọvanọ Soludo bụ Gọvanọ mbụ n’Anambra steeti mepere okporoụzọ 250 n’ime oge ọnwa isii.”

Anambra so n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa ebe enweghị ezi nchekwa na-enye nsogbo kemgbe afọ olemaole gara aga. Ọtụtụ otu ndị ojiegbe malitere iwakpo ndị mmadụ, ụlọọrụ gọọmentị, ndị ọrụ gọọmentị nakwa ndị ọrụ nchekwa.

Gọọmentị steeti a ka na-agba mbọ ịdaju ihe a na-eme nke so n’ihe Fada Ebube Mmụọ nsọ ji rụọ Soludo aka.

Gịnị ka Fada Ebube Mmunso kwuru kpọm kwem?

N’ihe onyonyo a na-efegharị, a hụrụ ebe Fada katọrọ ọchịchị Soludo ma kwuo na etu o siri katọọ Peter Obi na-azọ ọkwa onyeisiala n’aha Labour Party adịghị mma ma ncha.

Ọ kọwara na ndị Igbo nke gụnyere Gọvanọ Soludo kwesịrị ịgbakọta ọnụ kwado Obi onye ọ sị ‘ga-agbapụta Naịjirịa n’ọnọdụ ọjọọ ọ nọ n’ime ya.”

N’okwu ya n’ihe onyonyo ahụ, o kwuru “Charles Soludo sị na Peter Obi agaghị enweta mmeri na ntuliaka, Soludo ó bụ Chukwu.”

“Kedụ uru ị ga-erite na ịkwatu nwanne gị?”

‘Ị na-asị na ọ gaghị abụ onyeisiala mana nke e nyere gị na-akwanarị gị n’aka

 O kwuru na ọha na-eche ka ọ gbanwe Anambra ka ọ dị ka Dubai na Taiwan.

“Lee ihe na-eme na steeti a, enweghị ezi nchekwa, ndị mmadụ na-anwụ kwa ụbọchị.”

“Ọ pụtara na ọchịchị Anambra agaghị enweike hazịe ọnọdụ nchekwa a?”

“Naanị ịna ụtụ isi aghara aghara bụ ihe na-ada ebe ndị agbaoro a sị na-achụpụrụ werezị ọnọdụ ebe niile”.

O kwuru na steeti ahụ na-adatụ n’ụzọ ọjọọ kwa ụbọchị dịka ọ ji oluike kwuo na ‘Steeti kacha njọ na Naịjirịa ugbua bụ Anambra steeti.”

“Otu onye ndị ntorobịa tụkwasịrị obi maka mgbapụta... Kedụ ka mmadụ ga-esi kwuo na ọ gaghị enweta mmeri”

Ọ gara n’ihu katọọ okwu Soludo kwuru na nso nso megide Peter Obi ma kwuo na ndị ọchịchị dịka Obasanjo nakwa ndị mpaghara Ugwu na-ekwu ihe dí mma maka ya, “ọ lọta n’obodo ya, e were egbe chụba ya ọsọ.”

Cheta na n’ebe ngwụcha afọ 2022 na Gọvanọ Chukwuma Soludo kwuru na Peter Obi agaghị emeri ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ n’otu 'Labour Party', ma kwukwaa na ọtụtụ ebe Peter Obi tinyere ego Anambra steeti oge ọ bụ Gọvanọ, achịtaghị aja ọbụla ugbua.

Peter Obi sara ya mgbe ahụ kwuo na ya gbalịrị ike ya oge ọ bụ gọvanọ ime ihe ya chere ga-ewetara Anambra steeti ọganihu mana "Ugbua, Chukwu enyela Soludo ohere imetọpụ ihe ndị ahụ ọ sị na mụ emetaghị nke ọma, ya mezie ya ka ọ kara Anambra steeti mma,"

 Nke a abụghị mbụ Fada Ebube Mmụọ nso na Soluod na-atakọta isi . Akụkọ pụtara n'ebe Juun 2022 kọwara na Fada a buru amụma na ndị ọchịehi ga-awakpo obi gọọmenti steeti ahụ dị n'Ọka, ebe Soludo ga-ebu ọbara n'ahụ gbapụta.

Soludo gbarụrụ ihu maka nke a ma zipụta ozi kwuo

"Akpọrọ m gị ugboro abụọ dịka m gechara amụma i buru maka ndị Fulani Ọchịehi gburu ichi wakporo obi Gọọmentị n'Ọka na etu m si buru ọbara n'ahụ gbapụta nakwa nkatọ ị katọsiri ike maka ọnọdụ mkpocha ahịhịa."

 "Ndụ m dị n'aka Chukwu, Ọ marala abalị ole maọbụ afọ ole o deere m.