You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu m si zute di m bụ Gọvanọ Akeredolu nke Ondo Steeti - Betty Anyanwu
Nwunye Gọvanọ Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti bu Betty Anyanwu Akeredolu etiwaala akioyibo nsugbe banyere njem ya na alụmdinanwunye.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Betty kọwara etu o siri zute di ya, mmerikọta ndị Igbo na ndị Yoruba nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ọ sị na o zutere di ya n'Enugwu na kọwaa na ha hụrụ onwe ha n'anya ngwa ngwa ha zutere, mgbe ha ji otu afọ efe ala nna ha a kpọrọ 'Youth Service'.
"Mgbe a bịara ịlụ m, ndị ezinaụlọ m na-atụ ụjọ maka a na-eche na ndị Yoruba na-alụkarịa otu nwaanyị, mana di m gosiri ha na ọ bụ 'stereotype' nkịtị" ka o kwuru.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ihe ọzọ o kwuru okwu maka ya bụ etu o si rịa ọrịa akpụ ara bụ 'Breast Cancer'.
Ọ sị na mgbe ọ chọrọ ikwuputa ya ka ndị mmadụ mara, na Dọkịnta na-agwọ ya kụjara ma sị ya emele nke ahụ.
Ọ kọwara na ọ gara n'ihu malite ụlọorụ ya iji gbasa ozi nakwa ọzụzụ maka ọrịa ahụ n'agbanyeghi na ụmụ nwaanyị ibe ya enyeghi ya nkwado.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.