You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere ndị obodo Amuri ji gọọ ọfọ megide ndị gburu Oyibo Chukwu
Ndị okenye obodo Amuri gbakọrọ n'ebe akpọrọ ama Obodo Okolo ma gọọ ọfọ megide ndị gburu nwa ha nwoke bụ Oyibo Chukwu.
Ha kwuru na ha bụ obodo anaghị akwafu ọbara mmadụ ma kwuo na o wutere ha etu e si jiri maka ntuliaka kwafuo ọbara nwa ha bụ Oyibo Chukwu.
Otu onye ezinaụlọ Chukwu gwara BBC Igbo okwu n'ekwentị kwuru na ndị okenye obodo ha mere nke a n'ihi na etu esi gbu nwanne ha bụ ihe jọgburu onwe ya.
"N'ihu Chineke nakwa n'ihu mmadụ, ihe ndị ha mere jọgburu onwe ya n'ihi na ihe a na-eme bụ ndọrọndọrọ onye kwuo uche ya" ka o kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ hụghị ihe o ji bụrụ ihe tigbuo zogbuo.
Chukwu bụ onye na-azọ ọkwa ụlọomeiwu n'Enugwu steeti n'aha otu Labour Party bụ nke e gburu n'Awkunanaw abalị atọ tupu e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ụbọchị 25 nke Febuwarị.
Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị otu Ipob ka na-enyo enyo maka ọnwụ Chukwu nakwa ọkwọụgbọala ya mgbe ha gara achụmnta vootu.
Mana ndị obodo ahụ kwuru na ha ekwenyeghi n'ihe ndị uweojii kwuru kama na ọ bụ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị ka e ji gbuo Oyibo Chukwu.
"Ọ bụ ndị okenye gọrọ ya bụ ọfọ, ọ bụ elu chụwa ha, ala chụwa ha niile aka ha dị n'ọnwụ Chukwu" ka onye ezinaụlọ ya gwara BBC.
'Anyị na-enyo na ọ bụ ndị Ipob/ESN gburu onye LP, ndị ọzọ'-Ndị Uweojii Enugu
Anyị na-enyo na ọ bụ ndị Ipob/ESN gburu Oyibo Chukwu, ndị ọzọ-Ndị Uweojii Enugu
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyo na ọ bụ ndị otu na-alụ ọgụ maka nnweeonwe Biafra na alaka ọgụ há bụ Easterne Security Network(ESN) bụ ndị gbara mkpamkpa tara isi onye na-azọ ọkwa ịnọchite Enugu-East n’ọkwa ịnọchite Enugu-East n’Ụlọomeiwu Ukwu na ndị ọzọ Wenezde.
Ndị ojiegbe gbagburu Oyibo Chukwu, gbara afọ 63 na ọkwọgbụọala ya bụ Sunday Igwesi, n'Eke Ọtụ dị n'Nkanu-West, Enugwu steeti n'ụbọchị Wenezde ka o si ebe ọ gara achumtavootu n'Agbani ala.
N’aka nke ọzọ, ndị omekome gbagbukwara onye out PDP n'okporoụzọ Topland dị nso Ebony Paint Road dịkwa n’Amechi Ọkụnanọ, Enugwu.
Oyibo Chukwu: Ihe Peter Obi kwuru maka mgbagbu onye LP na-azọ ọkwa ịnọchite Enugu-East n'Ụlọomeiwu Ukwu
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel ndụkwe binyere aka ma wepụta n'ehihie Tozde, " Kọmishona ndị uweojii Enugwu,bụ Ahmed Ammanienyela iwu ka a maa imi n'ala mee nnyocha ma chọwa ndị omekome a na-enyo na ha bụ IPOB/ESN bụ ndị n'abalị 22/02/2023 n'ebe dị iche iche wakporo ma gbuo ndị People's Democratic Party (PDP) na Labour Party (LP) ma wakpokwa ụgbọala ndị so onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha All Progressive Congress (APC)".
"Kọmishona kwuru nke a oge ọ gachara na Topland ndị nso Ebony Paint Road nakwa Eke-Otu both dị Amechi-Awkunanaw, Enugwu ebe mkpamkpa ndị ahụ kpara."
Onye na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha onye Labour Party bụ Peter Obi akatọọla ogbugbu e gburu onye na-azọ ọkwa ịnọchite Enugu-East n'Ụlọomeiwu Ukwu na h'aha pati ha.
Ndị omekome bu egbe gbagburu Oyibo Chukwu, gbara afọ 63 n'Eke Ọtụ dị n'Nkanu-West, Enugwu steeti n'ụbọchị Wenezde ka o si ebe ọ gara achumtavootu n'Agbani ala.
N'ozi o wepụtara n'akara twitter ya n'ụtụtụ Tozde, Obi onye kwuru na nkwafu ọbara na-aga na Naijiria ugbua akarịala sịrị, " Ndụ ndị mmadụ dị mkpa, pati ọbụla masịrị ha nọrọ."
"Ana m akatọsi ike ogbugbu Ọkaiwu Chukwu."
Obi onye tiri ezinaụlọ Chukwu aka n'obi, kporo oku ka ndị ọrụ nchekwa nwuchie ndị kpara mkpa mkpa ahụ.
N'otu aka ahụ, otu na-alụ ọgụ maka ikike Dịịrị onye bụ Amnesty International katọkwara ọnwụ Chukwu.
Oyibo Chukwu: Etu 'unknown gunmen' si gbagbuo onye LP na-azọ ọkwa ịnọchite Enugu-East n'Ụlọomeiwu Ukwu
Ndị omekome agbagbola onye na-azọ ọkwa ịnọchite Enugwu-East n'ụlọomeiwu Naijiria.
A gbagburu Oyibo Chukwuna ọkwọụgbọala na ya so n'ụbọchị Wenezde dịka ha si ebe ha gara achụmtavootu ala nso Ekeọtụ dịka o si Agbani dị na Nkanu-West alaghachi Enugwu n'ụbọchị Wenezde.
Nke a ana-abịa ka ọ fọrọ naanị abalị atọ ka e mee ntuliaka 2023.
Ọnụ na-ekwuru ya bụ Chijioke Ogbodo gwara BBC Igbo n'ekwentị, "E nwetara m ozi ihe mere n'abalị ụnyaahụ. Ọ na-achịkọta achụmtavootu ya na isi njedebe. "
" Ọ gara nzụkọ n'Agbani ,isiụlọrụ Okpuru Ọchịchị bụ eze o si alaghachi Enugwu bụ ebe o nwekwara nzụkọ ọzọ n'abalị ahụ oge ndị bu ụgbọala ha ji ụgbọala ha kwụchie ụgbọala nke ha n' Eke Ọtụ, gbagbuo ya ma gbagbukwa ọkwọụgbọala ya."
" Nke kachacha njọ bụ na a gbagbuchara ha, sunye ha na ụgbọala ha nọ na ya ọkụ."
Ọ gara n'ihu kwuo na ' o chere na ndị gbagburu ya si n'ebe ọ gara ọgbakọ soro ya dịka 'Ụgbọla o ji abụghị nke esere ihe achụmvootu."
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ụgbọala na-agba ọkụ
Onye na-azọ ọkwa gọvanọ na-aha labour Party bụ Edeoga onye kwuburu sị, “Ndị pati ndị ọzọ bụ ndị ọrịrị Labour Party na-eri nri n'afọ na-achụgharị na-azọ ọkwa na pati dịka ha na-atrụ egwu na-aga emeri ha na ntuliaka Satọde."
Otu Labour Party ekwbeghị ihe ọbụla maka ihe mere mana Peter Obi agwaala ndị na-akwado pati ha ka tụọ vootu ha n'udo nakwa n'ụzọ kwesịrị.
Onye bụdị Oyibo Chukwu?
Chukwu, bụ onye ọkaiwu, ojiegoachụego nwere agba nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Onye Amuri dị n'Enugwu, ọ zọbuola ọkwa gọvanọ Enugwu n'aha pati SDP n'afọ 1990.
Chukwu bụbu onyeisioche otu jịkọrọ ndị ọkaiwu ụ Nigeria Bar Association, ngalaba nke Oji River.
Chukwu onye si otu PDP banye Labour Party bụbu odeakwụkwọ PDP Enugu steeti n'oge Dr Okwesilieze Nwodo dịka Onyeisioche pati ahụ.
Ọ gụrụ maka iwu na mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.
Chukwu, onye nwe ụlọọrụ na-arụ ewumewu a kpọrọ Kanov Nigeria Limited, gbara afọ 63 tupu ọ nwụọ.
Ọ hapụrụ nwaanyị ya na ụmụ were laa mmụọ.