Ihe ụlọọrụ Inec kwuru maka PVC a hụrụ na Nnewi, Anambra Steeti

Onyeisi ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nke n’Anambra Steetị bụ Queen-Elizabeth Agwụ ekwuola na ụlọọrụ ha na ndị ọrụ nchekwa na-eme nyocha ịchọpụta ndị nwe akpa PVC ahụ a sị na dinta hụrụ n’ime ọhịa dị na Nnewi.

O kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Awka maka etu ha si dị njikere ịhazi ntuliaka onyeisiala na ndị ụlọomeiwu echi 25 Febụwarị 2023.

Ọ sị na mgbe ọ malitere ọrụ n’Anambra n’ọnwa Nọvemba 2022, na ọnụọgụgụ PVC dị ha n’aka ruru otu narị puku na puku iri atọ na anọ (134,000).

Ọ gara n’ihu kwuo na ha bipụtakwuru PVC dị otu puku narị na puku iri abụọ na anọ (124,000) gbakwụnyere nke ha nwere ma malite ikesa ya.

Ọ sị na ọ bụrụ na ịgbakọ PVC ndị ha nwere na ndị ha kesara, na ha erughi ọnụọgụgụ PVC a sị na a hụrụ n’ime ọhịa.

O kwuru na e wepụ soshal midia na o jibeghi anya ya abụọ hụụ PVC ndị ahụ anya.

Ọ sị na ọ bụrụ ilezie anya ị ga-ahụ na e nwere ebe mmiri si baa n’opi ụgbọghọrọ.

Elizabeth gara n’ihu dụọ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha kwụsị ịṅaa ntị n’ihe niile si na soshal midia.

Etu e si chọpụta akpa PVC n'ime ọhịa Nnewi

Ihe onyonyo malitere ifesa na soshal n’ụbọchị 22 nke ọnwa Febụwarị gosiri ebe e si n’otu akpa wepụta ọtụtụ kaadị na-enye ndị mmadụ ikike ịtụ vootu a kpọrọ ‘Permanent Voters Card’ (PVC) na Nnewi, Anambra Steeti.

Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka e mee ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’ụbọchị Satọde 25 Febụwarị, 2023.

Akụkọ kwuru na otu onye dinta chọpụtara akpa ahụ jupụtara na PVC ndị mmadụ n'ime ọhịa dị na Nnewi, mgbe ọ gara ịgba nta.

Onye dinta ahụ buuru akpa PVC ahụ gawa n’ụlọọrụ mgbasaozi a kpọrọ Authority FM dị na Nnewi bụ ndị wụpụtara ọtụtụ PVC ndị a n’ala ma see ha foto tinye n’ọbaozi ịntanetị.

Otu onye hụrụ ka ihe si mee na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na otu nwoke onye dinta butere akpa ‘cement’ PVC ndị mmadụ juru n’ime ya n’ụlọọrụ Authority FM na mgbede ụbọchị Tuzde 21 Febụwarị, 2023.

Ọ sị na nwoke a Kwuru na ọ hụrụ akpa ahụ ọtụtụ puku PVC dị n’ime n’ọhịa dị n’Akammili Umudim nke obodo Nnewi.

Ọ kwuru dị ka ọ dị ugbua na e burula PVC ndị ahụ gawa n’obi Eze Umudim n’ụtụtụ taa bụ Wenezde 22 Febụwarị, 2023.

Otu onyeisi ndị obodo nke ngalaba Nzukora na Nnewi bụ Maazị Atueyi gwara BBC Igbo na ha maara maka akụkọ PVC a.

“Anyị nụrụ maka ya, akpọọla m ndị ndu obodo ndị ọzọ dị na Nnewi, ha kwetere n’ezie na PVC ndị ahụ bụ nke ndị obodo ha.

“Ihe anyị na-arịọ ugbua bụ ka e nye anyị ohere ikesa PVC ndị a ka o ruo ndị nwe ha aka maka na anyị maara ndị niile bụ ndị obodo anyị.

“Anyị na ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) na-arụkọ ka a maara ma ha ọ ga-enye anyị ohere ikesa ya.”

Atueyi sị na ọtụtụ ndị obodo ha gara n’ụlọọrụ Inec iwere PVC ha enweteghi ya, na ọ bụrụzie n’ime ọhịa ka a gara wufuo akwụkwọ ikike ịtụ vootu ha.

Mana ihe onyonyo ọzọ na-efesa ugbua na-egosi ka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ na-ahazi PVC ndị a mana a mabeghi ma ọ bụ ụlọọrụ Inec nyere ndị ikike ime nke a.

Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?

Ndị uweojii Anambra Steeti Anambra steeti ekwuola na ha anabeghi ozi banyere PVC a sị na dinta hụrụ n'ime ọhịa.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga sị na kọmishọna ndị uweojii enyela iwu ka e mee nyocha banyere ihe onyonyo a na-efegharị tupu ha etinye ọnụ na ya.

Nke a abụghị mbụ a ga-ahụ ọtụtụ PVC ndị mmadụ a wụfuru awufu. N’ọnwa Julaị 2022, a hụrụ ọtụtụ PVC ndị mmadụ ka ha tọgbọ n'ala n'Imo nakwa Bayelsa Steeti.

Ụlọọrụ Inec kwuru n'oge ahụ na ha ga-eme nyocha ịchọpụta ebe PVC ndị ahụ si nakwa ndị nwee ha.

Ndị Naịjirịa ga-apụta n'igwe n'ụbọchị satọde 25 Nọvemba 2023, ibinye aka iji họpụta onye ga-anọchi anya Onyeisiala Muhammadu Buhari ruo afọ anọ ọzọ.