Nigeria Economy:Lee usoro ndị nwereike inyeaka melite ọnọdọ

Etu nwereike i si gbanwe ọnọdụ gị n'oge nsogbu akụnaụba Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Michael Ilediagu na Ezennia Uche
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Ọnọdụ ọtanisi Naịjirịa nọ na ya ugbua abụrụla nsogbu nyere otụtụ ezịnaụlọ. Ụfọdu a naghị ebizi ndụ etu ha si ebi bu make na ego anaghị ezuru ha.

Ulọọrụ na-ahụ maka ngụkọ akụnaụba bụ 'National Bureau of statistics' ekwuola na ọnọdụ ntanisi Naịjiria akawanyela njoo.

Dọkịta Okechukwu Okere bu onye ọkamara na ịhe gbasara akunuba na ịchụ ego kọwara ịhe ịse nwere ike ịyere Naịjirịa aka ị pụta n'ọnọdụ ọke ịhe ụkọ, ma n’ọnọdụ akụnụba mmekpa ahụ.

Ọ koọwara etu ezịnaụlọ nwereike i si nyere onwe ha aka ma nye ndụmmọdụ dị oke mkpa.

Ọ kwuru n'agbanyere na ezịnaụlọ enweghị etụ ha ga-esị hazịgharịa ọnọdụ akụnụba Naịjịrịa maka na ọ bụ ọrụ gọọmentị; mana ezịnaụlọ nwere ịhe ha kwesịrị ịme ga-enyere ha aka n'oge dị ọtụ a.

Usoro ịse ga ahazịgharị ọnọdụ akụnụba Naịjirịa

Etu i ga esi nyere onwe gị aka n'ọnọdụ ihe mberede Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Na mkparịtaụka Dọkịta Okere na BBC , o kwuru na a chọọ ịhazị akụnuba Naịjirịa, nke mbu bu ịme ka egọ nweịke sị n'aka fere aka ngwa-ngwa. A ga-ebeneta oge ana-egbu na azụmahịa, ma mee ka ego ana emefụ maka ịbụharị ngwa ahịa dị ọnụ ala.

ịhe mbụ aga-eme ka ịhe ndị a bịa na-mmezụ bụ ịdọzị akụrụngwa ọbọdọ dịka ụzọ, usọrọ njem dịka ụgbọ ọlọkọ.

N'okwu ya “E kwesịrị ị jị ụgbọ ọlọkọ nwere jịkọta ịsịobọdo steetị nịle dị na Naịjirịa nakwa Abuja”.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

“Enweghị obodo mepere-emepe n'uwa nile na-entinghị nnụkwu ego na-ịme ka ụgbọ ọlọkọ dị na be ha kwuru chịmchịm”.

Ọ gara n'irụ kwụọ na gọọmentị kwesịri ịme ka ndị nkịtị nwee ịkikere itinye egọ na-mmepe odụ ụgbọọlọkọ na Naịjirịa.

“Gọọmentị kwesịrị ịme ka ndị na-achụ nta egọ banye n'azụmahịa njem ụgbọọrọkọ ma mee ka ndị na-azụ ahịa ụgbọọrọkọ bata na Naịjịrịa hazịe ya ma buputa ụgbọọrọko nke na-eme njem ngwangwa, obụghị nke na agba ọsọ ọnyịpa”.

Nke a ga-akwụsị ịgbụ oge n'azụmuahịa ma bulite ọnọdụ akunuba Naịjirịa.

“Nke abụọ bu ịdọzị ọkụ latrịk. Kemgbe afọ ịrị ịse na ụma, Naịjirịa ka na ata ahụhụ maka ọkụ latrịk”.

Okere kpọrọ ọkụ ka ahazịharịa ịhe gbasara mmeputa ọkụ latrịk ma mee ka ọtụtụ ndị jị ego achụ ego banye na ngalaba mmeputa ọkụ latrịk.

Nke atọ bụ nchekwa obodo. Dọkịnta Okere nyere gọọmentị ndụmọdụ ka ha kwụsị imefụ egọ na ịhe gbasara mmepụta ọkụ latrịk ma hapụ ndị ji ego achụ ego ka ha mewe nke ahu.

Ọ gara n'irụ kwuo na nke a ga-enyere gọọmentị aka ịwe ego ha ga-ejị hazịe ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba n'obodo Naịjịrịa.

Okwuru na “Gọọmentị ga-eme ka egọ zụo oke ị jị duga ndị agha Naịjiria ọzụzụ ma kwụọ ha ụgwọ ọhụma”

Nke anọ bụ mpụ, nrụrụaka na ịrị ngarị. Okere kwuru na ya maghị etu aga-esị kwụsị nrụrụaka na Naịjirịa maka na onye ọbula n'Afrịka na-ele onyeịsịala anya.

O buru na ọnye bụ onyeịsịala adịghị egọsị na ya akwadọghị nrụrụaka, ị ga ahụ na nke agaghị akwụsị.

Nke Ịse bụ na Gọọmentị kwesịrị ị jị akọ na ụche nwere na-emefụ egọ na ịhe gbasara ọdịmma ndị mmadụ. Ihe dịka agụmaakwụkwọ na ahụịke.

Na ịhe gbasara agumakwụkwọ, Okere kwuru “Gọọmentị kwesịri ịyefe ụlọ akwụkwọ na aka ndị ụka na ndị obodo. Gọọmentị ga agwa ndị uka na ndị obodo ha na-elekọta ụlọakwụkwọ, ebe gọọmentị ga na-eme ịwụ gbasara ya ma mee ka ọnọdụ agumakwukwọ dị mma”.

E tụ ezịnaụlọ ga-esị nyere onwe ha aka

E tụ ezịnaụlọ ga esị nyere onwe ha aka

Ebe foto si, Getty Images

Abia n’etu osiri emetuta ezinaulo, nke bụ ezịokwu bụ na-enweghị ịhe ezịnaulo ga-emewụ mana usoro ndị nwereike i nyeaka.

Ọnọdụ akụnụba Naịjirịa sọ mee ka ntọrị mmadu na abawanye. Nke a na- emetuta njịrị ara ezịnaụlọ.

“Mana ịhe ezịnaụlọ kwesịrị ịme bụ ịwetụlata aka n'etụ ha sị emefụ ego. Ugbua bụ mgbe onye ọbụla ga-aza aha nna ya ma mee ka ịhe ụkọ hara ịmetụta ezịnaụlọ ya tụpụu ị tịnye anya n'nke ọhaneze”. ka ọ kọwara.

“Ị nwereịke ịchọ ịyere ndị ọzọ aka, mama ụgbụa ọdịmma ka ịyere onwe gị aka”.

Ọ gara nịrụ kwụọ na ugbụa abụghị mgbe mmadụ jị egọsị na ọ kpatara ego maka na nke a nwereike i mee ka ndị mmadụ tinyere ya anya, nke nwereike i nwete anya ndị ntọ.

E tụ ezịnaụlọ ga-esị nyere onwe ha aka

Ebe foto si, Getty Images