You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Brymo arịọla mgbaghara ọzọ maka okwu ya megide Igbo
Otiegwu a ma ama bụ Olawale Olofooro Ashimi a ma dịka ‘Brymo’ arịọla ndị Igbo mgbaghara maka okwu ndị o kwuru kwugide agbụrụ ahụ na nsonso a.
N'izụụka gaara aga, Brymo wepụtara ozi n'akara Twitter ya nke kwugidere ndị Igbo ma kegharịa okwu mkparị nke ndị ọzọ na-akwado ya kpọrọ ndị Igbo.
Igbo bụ otu n'ime agbụrụ kachasị na Naijiria *bụ ndị si nọ na steeti ise dị n' Ọwụwa Anyanwụ dịka Abia, Anambra,Ebonyi,Enugwu na Imo,,
E nwekwara ụfọdụ Igbo na Delta, Rivers,Kogi na Benue steeti.
Nozi Brymo wepụtara n'akara Twitter ya ụbọchị Monde, o kwuru sị, " Mgbagharanụ m maka iihe nile m gbọrọ medie ndị Igbo."
"Ebughị m n'obi imebi ihe. Gbagharanụ m."
Brymo ekwuola na o nweghị mgbe ya kparịrị ndị Igbo.
Na nkọwa a o mere ụbọchị Fraide na-abịa dịka ụmụ Naijiria na-adọrị ya na soshal midia maka ihe ha hụtara dịka okwu akpọmasị megide ndị Igbo n’ akara Twitter ya na nsonso a.
N’abalị ole na ole gara aga, Brymo wepụtara ozi kwara ndị Igbo emo ma kesakwa ozi mkparị ndị Igbo nke ndị ọzọ wepụtara n’akara ya na Twitter kemgbe abalị ise nke ọnwa Jenụwarị.
Mana n’ozi ọ gbasara n’ Instagram ya, ọ sịrị na ọ bụ ndị mmadụ ghọtahiere ihe ya deere, na ọ bụghị mkparị.
“Akparịghị m agbụrụ (ndị Igbo)."
“Ana m arịọ onye ọbụla ọ dara na ntị ka mkparị mgbaghara.”
N’ajụjụ nke otu onye na-eso ya jụrụ ya maka ihe butere okwu o jiri kwuo okwu pụrụ ụka na soshal midia, o kwuru na ọ bụ agwa Chimamanda kpara dịka ọ jụrụ ịnara nturuugo Naijria ma nabata echichi e chiri ya n’Ala Igbo mere ya ji sị na Igbo etorighị ị na-ekwu okwu ịchị Naijiria.
“Ọ dị mkpa onye ọbụla ịghọta na okwu a nile malitere dịka m hụrụ n’akwụkwọ akụkọ na Chimamanda Adichie jụrụ ịnata nturuugo Naijiria mana ọ natara echichi omelala e chiri ya n’Ọwụwa Anyanwụ, mere m were sị na n’uche nke m, ya bụ ihe nwere ihe ọ na-arụtụ aka na onye Igbo ịbụ onyeisiala.”
“ O siri ike mmadụ
Brymo, onye n’ọsịsa ajụjụ ọzọ kwuru na ọ bụ ya na-edepụta ozi nile na-apụta n’akara Twitter ya, sịrị, “Ekwughị ihe emeghị, akparịghị m ndị Igbo.”
O kwuru na ọ bụ ndị na-ebinye aka n’ akwụkwọ mkpesa ka anapụ ya ntutuugo Afrima ka ya na-agwa dịka o boro ha ebubo ịchọ ịnapụ ya be ya si eri.
“Mkpesa ahụ dị njọ n’ihi na ọ bụ ibu agha megide ebe onye =nwa si eri.”
Ihe Brymo kwuru kpọmkwem
“Ọ dị mkpa onye ọbụla ịghọta na okwu a nile malitere dịka m hụrụ n’akwụkwọ akụkọ na Chimamanda Adichie jụrụ ịnata nturuugo Naijiria mana ọ natara echichi omelala e chiri ya n’Ọwụwa Anyanwụ, mere m were sị na n’uche nke m, ya bụ ihe nwere ihe ọ na-arụtụ aka na onye Igbo ịbụ onyeisiala.”
“ O siri ike mmadụ ikweta nke a, mana etibuola mkpụ ka e nye ndị Igbo ọkwa onyeisiala afọ ole na ole gara aga.”
“ M were kwuo na , ihe ọ sọrọ onye ọbụla kwube,ọ bụrụ na ị nụrụ akụkọ echichi ahụ , ọ ga-agbata gị n’obi, ọ bụ na ndị Igbo anaghị agba mbọ inwweta ọkwa onyeisiala?”
“Ọtụtụ ndị mmadụ ga-na-echekwa ya bụ ihe, kama na ọ bụ m bụ onye kwupụtara nke m.”
“Ndị mmadụ anabataghị ya, ha sị na enweghị m ikike ikwu ụdị ihe ahụ, na onye ọbụla nwere ike ịjụ ịnabata ihe ọbụla.”
A sịrị ha ee, ọ bụ eziokwu kama na aakụkọ ihe mere na Naijiria n’etiti Naijiria na mpaghara ahụ na ụdị mmadụ Chimamanda bụ( ọ bụ nnukwu mmadụ, nay a bụ ihe nwere ihe ọ pụtara.”
“Ndị mmadụ gara n’ihu nna-ekwu, rute mgbe e bidoro yiwe m egwu ọnwụ.”
“E deedịrị akwụkwọ mkpesa megide m.”
“Ngwangwa há tinyere akwụkwọ mkpesa ahụ n’intanet, otu onye bịara n’ihu ọbaozi m sị rịọ mgbaghara.
“ M asị gịnị? Ndị Igbo gbakwa ọkụ.“
“ Ọ bụghị ha ka m na-agwa, ọ bụ ndị binyere aka na akwụkwọ mkpesa ka m na-arụtụ aka.“
”Bekee ka m sụrụ.; ‘ọ’ dị n’ozi ahụ pụtara ‘otu’, ọ bụghị ‘igwe mmadụ’.
Brymo anti-Igbo Tweets: Ihe karịrị mmadụ 30,000 ebinyela aka na mkpesa ka a napụ otiegwu a ohere nturuugo AFRIMA
Ọha esierela otiegwu Olawale Oloforo a ma dịka "Brymo" ọnya dịka mmadụ karịrị puku iri atọ (30,000) binyerela aka na mkpesa ka a napụ ya ohere inweta nturuugo, 'All Africa Music Award' (AFRIMA) nke afọ a.
Brymo, onye e jiri egwu ya bụ "On mbe" maara bụ otiegwu a na-anụ aha ya maka egwu ya nke ọtụtụ n'ime ha bụ Yoroba na Bekee ka ọ gwọkọrọ tie ha.
Dịka onye malitere akwụkwọ mkpesa ahụ na 'change.org' bụ Chiristian Ogundele siri kwuo, Brymo zipuru okwu akpọmasị megide ndị Igbo ma kesaakwa ozi akpọmasi ndị ọzọ zipụtara na twitter.
"Brymo na nso nso a wepụtara ozi akpọmasị megide agbụrụ Igbo di na Naijiria na Twitter, ọ gakwara n'ihi kegharịa ozi akpọmasị ndị ọzọ zipụtara megide ndị Igbo."
"Ihe ndị a o mere kpalitere nkewa nakwa akpọmasị na mba nwere ọtụtụ agbụrụ dịka Naijiria."
Ogundele gara n'ihu kwuo na igbochi Brymo ohere inweta nturuugo Afrima ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ya na ndị yiri ya n'ụdị agwa ahụ.
Oku ndị ọha mmadụ na-akpọ ka e mechuo Brymo ihu na-abịa dịka Brymo zipụrụ ugboro ugboro ozi ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia hụtara dịka ozi akpọmasị agbụrụ megidere ndị Igbo n'akara Twitter ya na nso nso a.
Brymo ji akara Twitter ya @BrymOlawale were kpọọ si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria bụ ebe ndị Igbo si, ma kwaa ha emo (anyị enweghị ike idepụta ụfọdụ ihe ndị o kwuru dị ntị njọọ.)
Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya, ebe ọtụtụ ndị ọzọ kwụ ya n'azụ.
Ụfọdụ ndị gbarụrụ ihu n'okwu ya akpọọla Brymo oku na soshal midia ka ọ rịọ mgbaghara mana o kwuru na ya agaghị arịọ mgbaghara ọbụla.
Kama ịrịọ mgbaghara, Brymo keresara ozi akpomoku ka ndị mmadụ binye aka n'akwụkwọ mkpesa ka a napụ ya nturuugo Afrima.
Etu okwu si malite
Ndị ntoroọbia malitere kpụrụ Brymo n'ọnụ na soshal midia dịka o kwuru n'abali ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 na- ọ ga-ara ahụ ụmụ Naijiria ịtụnyere onye Igbo vootu ka ọ bụụ onyeisiala n'ihi ndị nwere agba n'Igbo na-akwado mkpu nnwereonwe Biafra.
Peter Obi so asọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka 2023 bụ onye Igbo si Anambra steeti.
Brymo kwụpụtakwara nkwado ya nye onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha APC bụ Bola Ahmed Tinubu sị na "ọ bụghị nanị n'ihi na m bụ onye Yoroba si Legọs".
Ọ kwuru na ya anaghị eme nkụja maka ndị na-eso bụ ndị kwuru na ha agahịkwa na-akwado ya n'ihi ihe o kwuru banyere ndị Igbo.
Onye bụdị Brymo a kpụ n'ọnụ?
OlawaleIbrahim Ashimi a ma dịka "Brymo" bụ otiegwu nakwa odeegwu Naijiria a ma ama.
Onye Legọs steeti , a mụrụ Brymo n'Okokomaiko dị na Legọs n'afọ 1986.
Nwa amadi a tipụtara efere egwu mbụ ya n'afọ 2007, malitere tiwe egwu n'afọ 1999.
O nweela efere egwu isii nke gụnyere 'Son of Kapenta(nna ya bụ onye kapịnta).
O ritekwala ọtụtụ nturuugo gụnyere ; Afrima 2013, Hip Hop World Awards, 2012Most Gifted Afro Pop Video of the Year, 'Ara' Channel O Music Video Awards, 2012.