Etu mmiri si Lagdo dam nke Cameroon nwere ike ime ka nsogbu idemmiri Naijiria kawanye njọ

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Aminu Adau
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Abuja
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Kwa afọ, mgbe ọbụla a chọrọ imepe mmiri Lagdo dam dị na mba Kamerun, nde kwuru nde ndị mmadụ n' opekata mpe steeti iri na-achị obi n'aka.
Narị kwuru narị ndị mmadụ atụnyela ndụ ha n'afọ ndị gara aga dịka e mepere ọgba mmiri 'dam' ,ebe puku kwuru puku ndị mmadụ ghọrọ ndị enweghị ụlọ maọbụ ebe ha na-akpata ego rute oge mmiri tara.
N'ụbọchị Tuzde, ụlọọrụ 'Nigerian Hydrological Services Agency (NIHSA), mara ọkwa ịdọaka na ntị sị na mba Kemerun na-akwado ịgbape ‘ọgbammiri 'Lagdo Dam' ha ma kwuo na steeti 11 dị nso na ikpere mmiri Osimiri Benue nwere ike inwe nsogbu idemmiri iwakpo ha.
Ọ bụrụ na nke a mee, ọnọdụ idemmiri n' ala a bụ ebe ọtụtụ nwụọrọla n'afọ a, yufọdụ bụrụ ndị enweghịzi ebe obibi, ga-akawannye njọ.
Steeti a na-ele anya ọ ga-emetụta gụnyere - Adamawa, Anambara, Bayelsa, Benue, Krọss Riva, Delta, Edo, Kogi, Nasarawa, Rivas, na Taraba – bụ ebe enwerela nsogbu idemmiri n'afọ iri gara aga oge ọbụla a gbapere 'Lagdo Dam'. Kwa afọ, ọnụọgụgụ ndị nsogbu a metụtara na-arị elu, na-agbanyeghị na ụfọdụ kwuru e nwere ike igbochili ya.
Onyeisi ụlọọrụ NIHSA bụ Umar Mohammed, kwuru n'ozi o wepụtara sị,“A ga-agbape mmiri ahụ n'ụdị iji hụ na ọ karịghị Osimiri Benue, iji gbochie nnukwu idemmiri na ndịda Naijiria."
Gịnị mere Lagdo Dam ji enye Naịjirịa nsogbu?

Ebe foto si, Getty Images
E wuru ọgbammiri 'Lagdo Dam' n'afọ 1982 iji nye ndị mpaghara Ugwu Kamerunb ọkụ latrik ma nyekwa ohere ịgba mmiri n'ubi akọrọ ihe dị hekta15,000 mmiri.
Mana dịka ọtụtụ ọgbammiri si eme, ọ na-ejukarị kwa afọ, nke mere ka ọ dị mkpa ịgbape ya.
A na-ekwu na Naijiria kwesịrị ịrụ ọgbammiri nke n'akụkụ ya a kpọrọ " Dasin Hausa Dam' nke kwesịrị ịdị n'Adamawa Steeti. Nke kwesịrị ịnabata mmiri si 'Lagdo Dam' mgbe abụla mgbe a gbapere ya iji belata nsogbu ọ na-ebute na Naijiria.
Mana arụchabeghị ya nke mere na mmiri si na Lagdo Dam nke Kamerun na-aga nihu na-emebi ihe n'ọtụtụ obodo na Naioijiria, ọkachasị ndị dị nso Osimiri Benue bụ ebe mmiri ahụ na-eruga.
Kedụ ihe so ya?

Ebe foto si, Getty Images
Afọ gara aga, oge Gọọmentị Naijria kwuru na idemmiri gburu mmadụ 29 , ma chụpụ mmadụ 48,168 ndị ọzọ n'ebe obibi ha, e kwuru na ihe mere ya bụ nsogbu ahụ ji dị nnukwu bụ mmiri a tọpụrụ site na ọgbammiri 'Lagdo Dam'.
N'afọ 2022 when ndị gọvernment kwuru na mmadụ 612 people nwụrụ, ebe ihe karịị nde mmadụ atọ na ụma bụ ndị mmiri chụpụrụ n'be ha na steeti dị iche iche, ebe mmiri si baa opi ụgbọgụrụ bụ Lagdo Dam'.
N'afọ ahụ, ụlọ dị 181,600 bụ ihe mebitụrụ, ebe ụlọ dị 123,807 mmebiri kpamkpam. ubi dị hekta 176,852 mebitụrụ, ebe nke dị hekta 392,399 mebiri kpamkpam.
A gụkọrọ ihe idemmiri na-eme kwa afọ na Naijiria mbụ n'afọ 2012 bụ oge o gburu mmadụ iri mana nke a na-akawanye njọ kwa afọ.
Afọ a ọ ga-adị iche?

Ebe foto si, Getty Images
Ibrahim Audu Usaini bụ onyeisi ụlọọrụ gbagbata nke Niger Steeti (Niger State Emergency Management Agency) bụ otu n'ime steeti ndị e kwuru nwere ike ịdanye na nsogbu a gwara BBC na ha amalitela mgbasa ozi n'obodo ndị e nwere ike imetụta ra, ebe e buga ndị mmadụ na mpaghara ebe dị elu n'obodo ha.
Usaini sịrị,“Anyị ga-enye ha nri na ihe enyemaka ndị ọzọ, dịka ha achọghị ịpụ kpamkpam, dịka ha achọghị ịhapụ obodo ha kpamkpam."
Ọ kọwara na dịka Naijiria nwewerela nsogbu 'idemmiri ọcha'site na mmiri ozizo,na ala a na-eke nkwụcha maka maka 'idemmiri ojii' nke ga-bịa n'ihi mgbape 'Lagdo Dam '.
Dịka ndị gọọmentị Naijiria sị na-ha ga-ahazili mmiri si 'Lagdo Dam' abata Naijiria dịka ọ na-abata, o dobeghị anya ma ọ ga-ekwe mme nakwa etu a ga-esi gbal;ahụ mbibi na-eso ya kwa afọ.












