Anyị anụbeghi maka ngagharịiwe ọbụla n'Imo - Ndị uweojii

Ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha anụbeghi maka ngagharịiwe ọbụla na-eme na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam gwara BBC nke a n'ekwentị na ọnwebeghi ihe ọ nụrụ maka ya bụ okwu mana ọ ga-azaghachi mgbe o mere nnyocha.

Mana ihe onyonyo na-efegharị ebe niile na-egosi ebe ndị ntorobia na-eme ngagharị maka ogbugbu otu onye n'ime ha.

Akụkọ na-ekwu na ndị echeere bụ Ebubeagu gburu otu onye ntorobia aha ya bụ Kelechi Ogbonna si obodo Amaeshe dị n'okpuruọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.

Nke a mere ka iwe wee ndị ntorobịa obodo ahụ nke mere ha ji pụta ngagharịiwe megide ndị ahụ.

Ihe ọzọ bụ na dịka ndị ahụ echeere bụ Ebubeagu na-achọ ịgbapu n'obodo ahụ ha merụkwara ndị ntọrọbia abụọ ọzọ ahụ nke mere na ha nọ n'ụlọogwụ anata ọgwụgwọ ugbua.

Etu ihe si kwụrụ

Ihe onyonyo ahụ na-egosi ebe ndị ntorobia na-achụ ụgbọala ndị ahụ ma na akwa ha emo mgbe ha na-apụ.

Ha mechara buru ozu onye ahụ nwụrụ gaa n'ụlọ onye bụbu onyeisioche Komiti na-elekọta Oguta.

Ha kpọrọ gọọmentị oku ka ha nyochapụta ndị ahụ gburu Ogbonna ma kpee ikpe n'ụzọ nkwụmọtọ.

Nwanne Ogbonna bụ Zinny Ogbonna kwuru na eburula ozu nwanne ya tinye n'ụlọ ozu ugbua.

Onyeisi ndị ntorobịa bụ Chinagorom Origbu kwuru na ha akọrọla ndị uweojii maka ihe na-eme.