Anya m ji ahụ ụzọ alaala - Mama nnukwu nwagbọghọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọ oloko na Legọs

Ndị ezinụlọ otu nwaagbọghọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọoloko na Legọs akwaala arịrị maka ihe ụfụ so ọnwụ nwa ha.
Aina Oreoluwa Juliana, nwaagbọghọ dị afọ 27, so n'ime mmadụ isii lara mmụọ oge ụgbọoloko kụrụ otu ụgbọala bus n'okporo ụgbọoloko dị nso n'Ikeja Legọs n'ụbọchụ Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Maachị 2023.
Ndị ezinụlọ ya sị na ọnwụ Juliana na-eme ha ka ọ bụ na nrọ maka na nwa ha nwaanyị bụ ezigbo nwa nyere ha.
Nwata nwaanyị a na-arụ ọrụ na mịnịstrị agụmakwụkwọ nke Legọs steeti, bụ ebe ọ nọ iji otu afọ fee ala Naịjirịa dịka iwu kwuru maka ndị gụchara mahadum ọhụrụ, nke a na-akpọ 'National Youth Service Corps'.
Ụgbọala bus ọ nọ n'ime ya aga ọrụ n'ụbọchị Tọzde ahụ bu mmadụ 85 ọzọ oge ihe mberede ahụ mere, mmadụ isii nwụrụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Ọ na-emere m ihe niile - Mama nnukwu Oreoluwa

Ebe foto si, @BABAJIDE SANWO-OLU/TWITTER
Na mkparịtaụka ya na BBC Pidgin nwere, mama nnukwu Oreoluwa bụ Deaconess P.A. Aina kwuru na Oreoluwa bụ nwa nwa ya nke mbụ ma bụrụkwa onye kacha akpachapụrụ ya anya.
"Ọ bụ nwa nwa m n'eziokwu, ọ na-akpachapụrụ m anya nke ọma, ọ na-aga ozi niile n'ụlọ a. Ọ bụrụ na m rịawa ọrịa, ọ bụ ya na-azụtara m ọgwụ, na-eleta m anya, kwụdebe m n'akụkụ, ọ naghị achọ ihe ọbụla ga-eme ka m taa ahụhụ.
"Ọ bụ naanị ya ka m ma na m kpọọ ya oku maka ihe ọbụla, ọ ga-aza. Ọ bụ nnọọ ezigbo nwa nye m," ka Deaconess Aina kwuru dịka anyammiri juru ya anya.
Nwanne nna nwata ahụ lara mmụọ bụ Tope Aina kwuru na ụlọọgwụ ga-eme nnyocha iji mata kpọmkwem ihe gburu Oreoluwa, n'ihi na onweghị mmerụ ahụ ọbụla a hụrụ anya n'ahụ ya.
"Ahụghị m mmerụ ahụ ọbụla n'ahụ ya. Site n'isi ruo n'obi ya bụ ebe m hụrụ, naanị n'isi ka m hụrụ ebe a mapadoro aha ya. Ha sị na ha ga-eme nnyocha (autopsy) iji mata ihe kpatara ọnwụ ya," Tope kwuru.
Otu nwanne ya nwaanyị aha ya bụ Seun kwukwara na Oreoluwa nwere ọtụtụ ebumnuche maka ọdịnihu ya, na ọ nwere nchekwube ịga mba UK ga nweta nzere 'masters' ma o mechaa NYSC ya.
"Ọ dị m mwute nke ukwuu, iwe na-ewe, ọ gbagwojuru m anya, ọ na-adị m ka mmadụ ọ ga-akpọte m na nrọ a ma gwa m na Ore gara ọrụ, na ọ ga-alọghachi," Seun kwuru.
Ihe gọọmentị Legọs kwuru maka ihe mberede a

Ebe foto si, @BABAJIDE SANWO-OLU/TWITTER
Gọvanọ Legọs Steeti bụ Babajide Sanwo-Olu agaala njem iti aka n'obi n'ezinụlọ ndị ihe mberede a metụtara, ma rịọ ha "ka ha hụta ọnwụ ndị a ha hụrụ n'anya dịka etu Chukwu si chọọ ya".
Sanwo-Olu kwuru na nnyocha mbụ ha mere gosiri na ọ bụ onye na-akwọ ụgbọala bus ahụ ka ya bụ ihe si n'aka.
Ọ gara n'ihu kwuo na n'ime mmadụ 85 nọ n'ime ụgbọala ahụ, mmadụ isii nwụrụ, mmadụ 29 nwere nnukwu mmerụ ahụ, mmadụ 42 nwere mmerụahụ ebuchaghị ibu, ebe asatọ ndị ọzọ nwere naanị obere mmerụ ahụ.
Ọtụtụ ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede a esila n'ụlọọgwụ laa be ha.
Onyeisiala Muhammadu Buhari zigakwara ozi iti aka n'obi nye ezinụlọ ndị mmadụ nwụnahụrụ nakwa ndị nerụrụ ahụ n'ihe mberede ahụ.









