You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ogwu-Aniocha, Orsu, Izombe... Lee obodo ebe ndị mmadụ gbarala ọsọ n'ihi enweghị nchekwa
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
Ndị Igbo na-ekwu na ọ bụ naanị ukwu osisi nụrụ na a ga-egbu ya ọ kwụrụ ebe ọ kwụ, mana mmadụ ọbụla hụrụ na ndụ ya abanyela n'ihe ụjọ ga-azọwa onwe ya n'oge maka na anaghị eji ihe e ji agba na ntị agba n'anya.
Ọtụtụ obodo na mpaghara dị icheiche n'Ọwụwa Anyanwụ adịla ka ebe a gbara ọsọ agha dịka ọnọdụ enweghị nchekwa na-arị elu.
Ị gaa obodo ụfọdụ ugbua, ọtụtụ ụlọ tọgbọ chakoo, ụlọakwụkwọ anaghịzi emepe, ndị ntorobịa anọghịzi nke ukwuu, ebe a na-eze ndụ maka mwakpo ndị ekperima.
Ndị Gọvanọ na ndị ọrụ nchekwa ekwela nkwa ugboro ugboro iwulite ọnọdụ nchekwa, mana kwa ụbọchị ka akụkọ ọjọọ na-apụta na mpaghara ndị a, nke na-eme ka ndị ka fọrọ afọ ebe ahụ na-achọ ụzọ mgbapụ.
Lee ụfọdụ obodo ụdị dị etu a:
Ogwu Aniocha
Ogwu Aniocha dị n'okpuru ọchịchị Ogbaru n'Anambara Steeti; ọ bụ mpaghara dị nso n'osimiri Naịja.
Ọgbaaghara dị n'obodo a malitere kamgbe ngwụcha afọ 2021 dịka a na-azọ onye ga na-anakọ ụtụisi n'ọnụ ebe a na-egwupụta mmanụ agbidi dị n'obodo ahụ.
Nsogbu a mere ka ndị ekperima wakpo ụlọ Igwe na-achị Ogwu Aniocha bụ Oliver Nnaji, ma gbaa ya ọkụ.
O teghị aka, ndị ekperima tọọrọ Igwa Nnaji ma mechaa gbuo ya.
Ka ọ dị ugbua, otu onye si mpaghara ahụ kwuru na ọ dịzi ka ndị ojiegbe ewerela obodo Ogwu Aniocha mere isi ụlọọrụ ha na mpaghara Ogbaru.
Onye ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị mmadụ agbaala ọsọ n'Ogwu Aniocha, ebe enweghị nchekwa na-akawanyekwa njọ n'obodo ndị gbara ya gburugburu dịka Osomala, Atani, Ogwuikpele, na ndị ọzọ.
Orsu/Lilu
Ọtụtụ obodo dị n'okpuru ọchịchị Orsu n'Imo steeti abụrụla ebe anaghị aga aga n'ihi onọdụ nchekwa ọjọọ.
Mpaghara dị n'oke ala Imo steeti na Anambra steeti; e nwekwara obodo ndị bụ Orsu n'Anambara steeti dịka Orsumoghu na Orsumenyi.
Ọ bụ na mpaghara a ka ndị agha Naịjirịa ji ụgbọelu kwaa mgbọ iji chụsasịa ndị ekperima zoro n'ime ọhịa.
Ugboro ugboro ka ndị ojiegbe wakporo ndị njem na mpaghara, tọrọ ụfọdụ ma gbukwaa ndị ọzọ.
Mana ndị ọrụ nchekwa gọọmentị ebukwaala agha ugboro ugboro megide ndị omekome ahụ na-akpa ike na mpaghara a.
Nke a emeela ka ọtụtụ ndị bi na mpaghara a gbaa ọsọ ndụ.
N'otu oge, onye si na mpaghara Orsu gbaa ọsọ gwara BBC Igbo na ọtụtụ ụlọ tọgbọzi chakoo n'obodo ha maka na ndị mmadụ agbapụchaala n'ihi egwu.
Onye a kwuru na ụfọdụ ụlọakwụkwọ anaghị emepezi, ebe ndi ekperima ebichiela n'ụfọdụ ụlọ ndị mmadụ.
Izombe - Oguta
Obodo Izombe nke dị n'okpuru ọchịchị Oguta aghọọla ebe ọ na-abụ chi bọọ a nụ akụkọ mwakpo ọhụrụ.
Ma ọ bụghị ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ, ọ bụrụ ndị ọrụ nchekwa Imo steeti a na-akpọ 'Ebube Agu'.
N'Ọktoba 2021, ndị agha Naịjirịa wakporo obodo Izombe ma mebie ụlọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na e gburu onye otu ha ebe ahụ.
N'ọnwa Ọgọst 2022, ndị ekperima wakporo obodo Izombe nakwa Agwa, gbuo ndị uweojii anọ.
Mwakpo ọzọ mekwara n'Izombe n'ụbọchị 26 nke ọnwa Ọgọst, dịka ndị obodo boro ebubo na ndị Ebube Agu wakporo ha ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.
Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị ntorobịa n'Izombe agbaala ọsọ pụọ n'obodo ha n'ihi egwu.
Umunneochi/Isuochi/Leru/Lokpanta
Mpaghara a dị n'etiti oke ala Enugwu, Anambara na Abia steeti.
Ihe na-achụ ndị mmadụ na mpaghara a abụghị ndị ekperima 'unknown gunmen', kama ọ bụ ndị ọchịehi jizi ntọrị mmadụ mere akaọrụ.
Mpaghara Owere-Ezukala, Umunneochi, Isuochi, Leru, Lokpanta bụzi aga aga ugbua n'ihi akụkọ ntọrị mmadụ.
N'ụbọchị Mọnde, Sepụtemba 5 2022, akụkọ kwuru na ndị ọchịehi wakporo Owere Ezukala ma tọrọ ọtụtụ ndị njem.
Chetakwa na ọ bụ n'Umunneochi ka a nọ tọrọ onyeisi ụka Methodist na Naịjirịa bụ Samuel Kanu-Uche. Ọ kwụrụ otu narị nde naịra tupu ndị ekperima ahụ atọhapụ ya na ndị otu ya.
Ebe ndị ọzọ ọnọdụ nchekwa dị oke njọ
Mpaghara ala Igbo ndị ọzọ ebe enweghị nchekwa na-enye ndị mmadụ ọsọ ugbua gụnyere:
Mpaghara Ihiala, Azia - n'Anambra steeti
Mpaghara Enugwu Ezike - n'Enugwu Steeti
Mpaghara Ohafia - n'Abia Steeti
Mpaghara Onicha - n'Ebonyi Steeti.