Onyeisiala Sri Lanka eriela mbọmbọ ọsọ maka ndụ ya

Ebe foto si, Getty Images
Gotabaya Rajapaksa bụ Onyeisiala mba Sri Lanka esila na mba ahụ gbaa ọsọ, maka ndụ ya.
Ndị agha mba ahụ kwuru na Rajapaksa na nwunye ya nakwa ndị nchekwa abụọ ji ụgbọelu ndị agha fepu gaa mba Maldives n'ụbọchị Tuzde.
Otu onye achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru na ọ ga-esi Maldives pụọ gaa mba ọzọ.
Rajapaksa na ezobu ezo kamgbe ndị na-eme ngagharịiwe wakporo ụlọ ya n'ụbọchị Satọdee gara aga.
Ihe niile ị kwesịrị ima maka mwakpo ebe obibi onyeisiala mba Sri Lanka

Ebe foto si, Getty Images
Puku kwuru puku ndị mba Sri Lanka awakpoola ebe obibi onyeisiala mba ahụ bụ Gotabaya Rajapaksa n'ụbọchị itolu nke ọnwa Julaị.
Ndị ngagharịiwe a si n’akụkụ mba ahụ dị ịche ịche gbakọtara na mpaghara Colombo bụ ebe onye onyeisiala Rajapaksa bi ma jiri obi iwe na-ekwu na ha chọrọ ka ọ rituo n’ọkwa oche ya n’ihi ebubo na ọchịchị ya ikpalitere ha oke ihe isi ike.
Ndị a na-eme ngagharịiwe na Sri Lanka ekwuola ugbua na ha ga-aga n'ihu na-ebube nọrọ n’ebe obibi onyeisiala mba ha ruo mgbe ndị isi ha abụọ bụ onyeisiala mba ha na Praịm minista minista ga-agba arụkwaghịm.
Onyeisala Gotabaya Rajapaksa ekwuola na ya ga-apụ n’ọchịchị n’ụbọchị 13 Julaị, dịka nkwupụta nke onye na-ekwuchitere nzuko ndị omeiwu ha si kwuo n’ụbọchị Satọọde.
Ndị ọrụ nchekwa mba ahụ gbara ama na onyeisiala Rajapaksa gbapụrụ ọsọ ụkwụ eru ala dịka ndị wakporo be ya.
Ha kwukwara na e duuru ya gaa be zoro ezo nchekwa dị.
Ndị ngagharịiwe a wakpokwara ebe obibi Praịm minista mba ahụ bụ Ranil Wickremesinghe.
Ha gbakwara ụlọ Praịm minista Wickremesinghe dị n'akụkụ ebe ndị bara ọgaranya bi na Colombo, ọkụ.
Wickremesinghe anatala mkpesa ndị a ma kwuo na ọ ga-aritu n’ọkwa oche ya ngwa ngwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ihe onyonyo ndị gbara na soshal midia gosiri ka ndị ngagharịiwe ahụ wakporo ụlọ Wickremesinghe nọ n’elu akwa ya nakwa oche ya ma na-ese foto.
Mba Sri Lanka so na mba ndị nọ n’ọnọdụ ahụ maka ndatu akụnụba ha dịka ha enweghịzịke ibubata ihe ndị dị mkpa maka ịbị ndụ dịka nri, mmanụ ụgbọala, ọgwụ na ihe ndị ọzọ.
Otu onye ntaakụkọ AFP news kwuru na ndị a si n’akụkọ mba dị ịcheịche wụpụta ma jibidio ọtụtụ ụgbọ oloko bu ha bata Colombo.
E kwuru na ndị nọ na-agụ egwu kwupụtara “Kwara lawa kwara lawa” dịka ha meriri ọtụtụ ndị uweojii nwara ịkwụsị ha n’ụzọ be onyeisiala mba ahụ.
Ndị uweojii gbaliri egbe elu ugboro ugboro ma gbakwa gaasị mmiri anya mana nke a akwụsịghị atụmatụ ha.
Otu ihe onyonyo gbara na Facebook gosiri ka narị kwuru narị ndị ngagharịiwe ahụ nọ n’ime ụlọ nakwa ogige ndị ọchịchị ha.

Ebe foto si, Getty Images

Ihe onyonyo nke BBC gosikwara ka ndị nọ n’ime olulu mmeri ‘Swimming Pool’ e gwuru n’ime ogige a nke ndị bi ebe ahụ ji emegharị ahụ ma na-emesapụ ahụ.
Ụfọdụ n’ime ndị a wụbakwara ime ụlọọrụ onyeisiala mba ha kpọm kwem dịka kemgbe ọnwa ole m ole ha na-eme ngagharịiwe n’ezi ụlọọrụ ya.
Ka ọ dị ugbua, mmadịụ 33 nke gụnyere ndị ọrụ nchekwa, emeruola ahụ ma na-anata ọgwụgwụ n’ụlọọgwụ National Hospital of Sri Lanka dị na Colombo dịka otu ọnụ na-ekwuru ụlọọgwụ si gwaa ụlọọrụ ntaakụkọ BBC Sinhala.
Dịka ikuku ngagharịiwe a malitere iku na ngwụcha izu a, gọọmentị mba nwara mmachịe ngagharị ndị mmadụ n’abalỊ Fraịdee mana ndị mba a erubeghirị ya bụ iwu isi nke mere ya ji kagbuo ya bụ atụmatụ.
Ndị kpara nkata mere ejiri jụụ irubere ya bụ iwu isi bụ ndị ngagharịiwe, otu ndị na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nakwa patị ndị na-anọghị n’ọchịchị.
Ihe ịkwesịrị ima maka mba Sri Lanka
- Mba Sri Lanka bụ mba mmiri gbara ogige dị na mpaghara ndịda mba India Ha nwetere nnwereonwe n’aka mba Briten n’afọ 1948
- Ha nwere agbụrụ atọ n’ime nke bụ agbụrụ Sinhalese, Tamil na ndị ụka Alakụba (Agbụrụ atọ a mezuru pasentị 99 n’ime mmadụ nde 22 bi na mba ahụ)
- Ọchịchị mba nọ n’aka otu ezinụlọ kemgbe afọ ole m ole gara aga.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ikwesiri ime maka Ezinụlọ Rajapaksa
- Ezinaụlọ Rajapaksa bụ nke onyeisiala Rajapaksa si nọ n’ọchịchị kemgbe
- Mahinda Rajapaksa pụrụ dịka onye nzọpụta nye ndị mba n’afọ 2009 mgbe ọ chụpụrụ ndị otu nnwereonwe nke agbụrụ Tamil n’ọchịchị dịka ha kpaliterechara agha gbụrụ ọtụtụ ndị mba ahụ
- Ka ọchịchara, nwanne ya nwoke bụ odeakwụkwọ ndị agha mgbe ahụ malitere chịwa, ya bụ onyeisiala Gotabaya Rajapaksa onye nọ n’oche ọchịchị ruo ugbua
- Mba a nọ n’ọnọdụ ọjọọ ugbua dịka akụnụba ha na-akpụwanye afọ n’ala kemgbe afọ ole m ole gara aga.

Ebe foto si, EPA

Gịnị mere ndị mba a ji eme ngagharịiwe?
- Nsogbu ndị mba danyerela n’ime ya ugbua nke kpalitere ngharịiwe a gụnyere enweghị ọkụ latrịk, enweghị ike bubata ngwa nrị, ọgwụ, nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa ndị mmadụ kwesịrị iji bie ndụ nke ọma
- Ihe ndị bụ ihe mere iwe ndị mba ahụ jiri dị ọkụ nye ezinụlọ Rajapaksa dịka ha wakporo ebe obibi ya taa bụ Satọdee
- Gọọmentị mba na nso nso a nwete mmanụ ụgbọala na mbinye site na mba Russia nakwa ebe ndị ọzọ mana atụmatụ ahụ achịtaghị aja ma ncha
- Ha birikwara ego maka mgbepụta n’aka ihe isi ike ọrịa covid-19 kpalitere na mba mana ndị ọkachamara n’ihe gbasara ndokwa akụnụba kwuru na ndị ọchịchị mba ahụ na-erefusi ego ha aghara aghara nke bụ ihe tinyere ha n’ọnọdụ ọjọọ ha nọ ugbua
- Ihe isi ike dị na mba a mere ka nwanne nwoke onyeisiala ha nke tọrọ ya bụ Mahinda Rajapaksa gbaa arụkwaghị m n’orụ n’ọnwa Mee nke afọ a.









