Etu e siri gbuo ụmụnwoke abụọ na Kano

Ifeanyi Elechukwu

Ebe foto si, Chukwudi Iwuchukwu

Nkọwa foto, Ifeanyi Elechukwu

Akụkọ na-ekwu na mkpamkpa kpara n'akụkụ Kano steeti a kpọrọ Sabon Gari mgbe ndị omeokome gbagburu umụnwoke abụọ n'ahịa Azubros Plaza dị n'ụzọ Fransị.

E nyere aha otu onye n'ime ha dịka Ifeanyi Elechukwu bụ onye Anambra steeti na-azụ ahịa na Kano.

Onye ọzọ nwụkwara na mwakpo a dịka e siri kwuo ebe ahụ bụ enyi ya nwoke bụ Chibuile Emmanuel onye bịara ịleta ya n'ọdọ ahịa ya mgbe ya bụ ihe ọdachị ahụ mere.

Akụkọ ọnwụ mmadụ abụọ a malitere ifesa kemgbe izu gara aga nke mere BBC Igbo jiri siri ime n'ala gaa Kano steeti ịchọpụta ihe mere ebe ahụ n'ezie.

Ihe enyi Ifeanyi Elechukwu gwara BBC

Otu onye ma Ifeanyi Elechukwu kọwaara BBC Igbo na mgbe akụkọ ọnwụ ya wuru ebe niile, "ndị mmadụ amaghị na ọ bụ otu omekeome gburu ya."

Nwoke ahụ sị "ndị mmadụ na-eche na ọ bụ nsogbu dị n'etiti ya na nwunye ya mbụ butere ogbugbu ya".

Enyi Ifeanyi kọwakwara na ndị uweojii nwụchiburu Ifeanyi mgbe ogbunigwe gbachara n'ahịa dị n'Aba road na Sabon Gari n'ọnwa Mee.

"Ọ (Ifeanyi) nọrọ n'aka ndị uweojii nke DSS izu ụka abụọ mgbe ha na-eme nyocha tupu ọ pụta" ka o kwuru.

Enyi ya ahụ kwuru na ọ na-eche na ọ bụ ozi ịgbaama ndị o nyere ndị uweojii mgbe ọ nọ n'aka ha mere ndị omekome jiri bịa gbuo ya.

N'uche ya, ọ na-ekwu na ozi ndị omekome ahụ bụ banyere enyị bụ Ifeanyi.

O kwukwara na ndị DSS nyochara Ifeanyi maka ebubo iresi ndị otu omekome 'battery' e ji arụpụta ogbunigwe mana ha mechara tọhapụ ya.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụ olu ndị ụweojii na Kano steeti banyere akụkọ a amịtaghị mkpụrụ n'ihi na ha azaghị ekwentị ha maọbụ ozi banyere ebubo ndị a.

Ebe gaasị gbara na Kano n'ọnwa Mee
Nkọwa foto, Gaasị gbara na Sabon Gari dị na Kano n'ọnwa Mee.

Ozi Iswap zipụtara

Enwebeghị ihe ịgbaama nke ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa zipụtara kwuru kpọmkwem na ozi a a sị otu Islamic State – West Africa Province (Iswap) zịpụtara na soshal midia nke e dere n'asụsụ 'Arabic' bụ nke ezie maọbụ na ọ metụtara ọnwụ ụmụnwoke abụọ a.

Cheta na dịka abalị abụọ gachara mgbe a gbagburu mmadụ abụọ a, ndị a na-eche bụ otu Iswap zipụtara ozi na soshal midia ha kwuo na ha gburu otu nwoke ha sị na-agbara ndị agha Naịjirịa ama agbanyeghị na ha akpọghị aha nwoke ahụ kpọmkwem.

Kedụ ndị bụ otu ISWAP

  • Otu Iswap bụ otu ndị agha nnupụisi nke ndị otu alakụba na-ekpuchi mpaghara Ọdịda anyanwụ Afrịka.
  • Ha nọ n'okpuru otu ndị agha nnupụisi nke ukwu bụ Islamic Steeti.
  • Ọ bụ ha na-awakpo ụfọdụ mba dị na ọdịda anyanwụ Afrịka dịka ozi ịgbaama ha si ekwuo ugboro ugboro, ọ kachasị na Naịjirịa ebe ha kwetara nọ n'isi ọtụtụ mwakpo nakwa ntọrọ ndị mmadụ na ụlọọrụ dị icheiche.
  • Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha gburu onyeisi otu ahụ bụ Abu Musab al- Barnawi n'ọnwa Ọktoba afọ 2021.