Onyeisiala Bola Tinubu ezigala ozi nkasiobi nye ezinaụlọ Edwin Clark lara mmụọ

Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na Edwin Clark

Ebe foto si, Facebook Tinubu/Pandef

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na Edwin Clark
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu ezigala ozi ịtị aka n'obi nye ezinaụlọ Edwin Clark nwụrụ anwụ.

Bola Tinubu mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi ịtị aka n'obi ọ dere nke Bayo Onanuga bụ onye ndụmọdụ ya pụrụiche binyere aka.

Edwin Clark nwụrụ n'oge ọ dị afọ iri itoolu na asaa n'Abuja, isi obodo Naịjirịa.

Tinubu kọwara ọnwụ Edwin Clark dị ka "ihe na-agba anya mmiri nakwa ihe nwute".

Ọ sị na Edwin Clark bụ otu onye nwere ugwu ma bụrụ onye a maama n'ihe gbasara ọchịchị na mpaghara Naịjirịa niile.

Ọ kọwakwara Clark dịka "onye nkuzi na ọkaiwu nwere mmasị n'ịdị n'otu mba Naịjirịa ruo mgbe ọ nwụrụ".

"A ga-echeta Edwin clark dịka onye na-akwado ikike dịara ndị Niger Delta nakwa usoro ọchịchị 'True Federalism'.

Tinubu kpere ekpere ka chineke tie ezinaụlọ Clark aka n'obi ma nye ha ume ịdi ọnwụ nwa amadị ahụ.

'A ka m nọ n'iri uju a sị na Edwin Clark anwụọla' - Peter Obi

Edwin Clark na Peter Obi

Ebe foto si, Facebook Peter Obi / Pandef

Nkọwa foto, Edwin Clark na Peter Obi

Gọvanọ chiburu Anambra steeti ma bụkwara onye ji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Peter Obi ekwuola na ya ka nọ n'iri uju maka ọnwụ Pa Ayo Adebanjo a sịkwa na Edwin Clark anwụọla.

Peter Obi mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi o dere n'akara X soshal mịdịa ya.

N'okwu Peter Obi "a ka m nọ n'iri uju maka ọnwụ onye m na-ahụ ka nna nakwa onye ndu bụ Pa Ayo Adebanjo, a sịkwa na onye ọzọ m na-ahụ dịka nna bụ Edwin Clark anwụọla".

"Ejim aha m na ezinaụlọ nakwa ndị otu 'Obidient Movement' nwere na-asị ezinaụlọ Edwin Clark nakwa ndị otu ya bụ Pan-Niger Delta Forum (PANDEF) ndo."

"Clark bụ nnukwu mmadụ na Naịjirịa ma bụrụkwa onye a maama maka ịkwado udo, ịdị n'otu na ọdịmma mmadụ na ibe ya".

"Ọ bụ onye a ma nke ọma na-ekwu okwu banyere ịnweta ezigbo ọchịchị na Naịjirịa".

Edwin Clark bụ onyendu otu Pan Niger Delta Forum (PANDEF) anwụọla

Tupu ọ nwụọ, Edwin Clark bụbu kọmịshọna gọọmenti etiti na-ahụ maka mgbasaozi ma bụrụkwa onye ndu mpaghara Saụt Saụt Naịjirịa.

Ebe foto si, Pandef

Nkọwa foto, Tupu ọ nwụọ, Edwin Clark bụbu kọmịshọna gọọmenti etiti na-ahụ maka mgbasaozi ma bụrụkwa onye ndu mpaghara Saụt Saụt Naịjirịa.

Edwin Clark bụ onyendu otu 'Pan Niger Delta Forum (PANDEF)' anwụọla ka ọ gbachara afọ iri itoolu na asaa (97yrs).

Otu onye ezinaụlọ ya bụ Ọkammụta C. C Clark kwuru na Edwin Clark nwụrụ n'Abuja n'ụbọchị Mọnde 17 Febụwarị 2025.,

Tupu ọ nwụọ, Edwin Clark bụbu kọmịshọna gọọmenti etiti na-ahụ maka mgbasaozi ma bụrụkwa onyendu mpaghara Saụt Saụt nke Naịjirịa.

Ezinaụlọ ya na-arịọ ka ọhaneze kpere ha ekpere n'oge iru uju a.

Ọnwụ Edwin Clark na-abịa n'ime abalị ole na ole onye ndu otu Afenifere bụ Ayo Adebanjo nwụrụ.

Akụkọ ka na-abịa......

Onye bụ Edwin Clak?

A họpụtara Edwin Clark dịka Kọmịshọna mpaghara Mid-west na-ahụ maka agụmakwụkwọ. E mechara họpụta ya dịka Kọmishọna na-ahụ maka ego.
Nkọwa foto, A họpụtara Edwin Clark dịka Kọmịshọna mpaghara Mid-west na-ahụ maka agụmakwụkwọ. E mechara họpụta ya dịka Kọmishọna na-ahụ maka ego.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

A mụrụ Edwin Clark ụbọchị Wenezde 25 Mee 1927 n'obodo Kiagbodo dị na na Delta steeti.

Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na Sekọndri na Effurun, Okrika na Aafugbene tupu ọ gawa ụlọakwụkwọ Government Teacher Training College nke bụzi mahadum Delta State University, Abraka ugbua.

Ọ rụrụ ọrụ nkụzi tupu ọ gaa mba ofesi ebe ọ gụrụ akwụkwọ ma nweta nzere dịka onye ọkaiwu.

Njem ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị malitere oge Naịjirịa na-achọ nwereonwe ya. A họpụtara dịka Concillor mpaghara Bomadi n'afọ 1953. O sonyere National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC).

Edwin Clark so na ndị otu si mpahara Mid-West sọnyere n'ọgbakọ Constitutional Conference katọrọ inwere ọchịchị n'ike e mere na Naịjirịa n'afọ 1966. Ọ bụ Yakubu Gowon hiwere ọgbakọ ahụ.

A họpụtara ya dịka Kọmịshọna mpaghara Mid-west na-ahụ maka agụmakwụkwọ. E mechara họpụta ya dịka Kọmishọna na-ahụ maka ego.

Dịka Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ, Edwin Clark rụrụ ọrụ maka ihiwe ụlọakwụkwọ Mid-west College of Technology nke mechara bụrụ mahadum Univeristy of Benin ugbua.

N'afọ 1983, a họpụtara ya dịka Sịnetọ n'ọchịchị Shagari. Ọ nọrọ n'ọkwa ahụ naanị ọnwa atọ.

O hiwere mahadum Edwin Clark University n'afọ 2015.