Etu ị ga-esị gbanarị ọnwụ ma ị rite nsị na nri

Ebe foto si, Chidimma Njoku
- Onye dere ya, Isiyaku Muhammed
- Ndị mere akụkọ a, Digital Journalist
- Ebeg o si, Abuja
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Maka ọnọdụ akụnụba Naịjirịa na ihe ụkọ, ọtụtụ ndị mmadụ amalitela iri nri dị icheiche ọ kachasị nrị ha adịghị eribu na mbụ.
N'otu ọnwa, mmadụ 24 anwụọla n' ezinaụlọ atọ dị n'ime Sokoto nakwa Zamfara Steeti ka ha richara akpụ e jiri akwụkwọ nri kwadoo.
Onyeisi ngaraba na-ahụ maka ahụike na Zamfara Steeti bụ Yusuf Abubakar gwara BBC ihe kpatara ọtụtụ mmadụ ruru 25 jiri nwụọ.
"Otu onye ọlụugbo gara gbaa ọgwụ n'ugbo ya n' ụtụtụ. N' ehihe, ha agaa weta akwụkwọ nrị n' otu ubi ahụ bụ nke ha jiri sịe nrị. Nke a kpatara ha ọnyụnyụ na ọgbụgbọ. Ọtụtụ ndị rịrị nrị ahụ nwụrụ".
ka e sị achọpụta onye riri ajọ nri na-egbuegbu
Dọkịnta Fatima Adamu na-arụ ọrụ n' Aminu Teaching Hospital dị na Kano steeti kwuru na "ọ bụ ajuju naanị ka anyị ga-aju onye e butara n'ụlọọgwụ. Ọsịsa anyị ga-enweta ga-enyere aka ịma ihe mere ya."
Mana mmadụ riri ṅsị ma ọ bụ ajọ nrị nwere ihe ga-eme onye ahụ n'ahụ oge o richara nrị ahụ.
Ọtụtụ na-enwe afọ mgbu, ndị ọzọ na-enwa ahụ ọkụ na ịgbọ agbọ.
Onye riri ajọ nrị o nwere ike ịweta ọgwụgwọ?

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịnta Fatima kwuru na ọ bụ nnukwu nsogbu oge ọbụla ajọ nrị banyere n'afọ mmadụ.
"Ahụ mmadụ ga-achọpụta na e nwere ihe na-ekwesighị ịnọ n'ime afọ onye ahụ. Ahụ ya ga-agba mbọ iwepu ihe ahụ, mana ọ bụrụ na o wepunwughị ya, oge ahụ ka ọ ga ebido bụrụ ọrịa. Mana ọtụtụ ajọ nrị mmadụ riri nwere ike ghara ime ga ọ gaa ụlọọgwụ nweta ọgwụgwọ".
"Ọtụtụ na-enweta ọgwụgwọ na- agaghị ụlọọgwụ, ebe ọtụtụ mmadụ bụ ndị ga-enweta onwe ha naanị oge ha gachara ụlọọgwụ.
O nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha kwụsị ịjị aka ha na-enye onwe ọgwụgwọ n'ụlọ maka na nke ahụ na-ebuta mmadụ ịwụ.
Lee ọtụtụ ihe na-adịghị mma ndị mmadụ na-eme oge mmadụ riri ajọ nrị
Dọkịnta Fatima kwuru na oge ụfọdụ na mmadụ rie ajọ nrị, e nwere ihe dị icheiche ndị agbata obi ha na-asị ha mee maka ibenata ihe ụfụ, mana ọtụtụ ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ nsogbu dịara onye ahụ.
"ị ga-anụ ndị ga-asị onye rịrị ajọ nrị gaa ṅụọ mmịrị ara ehi, ọtụtụ ga-asị onye ahụ gbọọagbọ". Ma nke a nwere ọnọdụ nwereike ime ka onye ahụ nwụọ.
Ọ baghị uru i chere, oge ọbụla ị hụrụ na mmadụ riri ajọ nrị ahụ, nwere ọsọ gaa ụlọọgwụ.
Etu mmadu ga-esi gbanarị iri ajọ nrị nwere ṅsị

Ebe foto si, Getty Images
Nrị nwere ṅsi dị njọ na-ahụ ọkachasị oge ọ banyere n'afọ, mana kedu ka ndị mmadu ga-esi gbanarị iri ajọ nrị?
Dọkịnta ahụ kwuru na ọ dị mkpa na mmadụ tinyere anya na nrị nwere ihe ndị a:
* Nrị dị ọcha
* Mee ka ebe ị na-esi nrị dị ọcha
* Na-edobe nrị n' ebe dị ọcha nje agaghị abanyewu na ya
* Saa ihe ị jị esi nrị
* Na-etinye nrị n'igbenjụoyi
* Na-asa aka gị oge niile
* Edosakwala ihe na-adịghị mma n'akụkụ ebe ị na-esi nrị








