Akwa nwaanyị ajadu bere dịka a gbachiri ụlọahịa ya n'Aba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Kemgbe ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) wakporo ọdụ ahịa Eziukwu/Cemetery dị n'Aba Abịa steeti, BBC Igbo zigara onye ntaakụkọ n'ime ahịa ahụ.

Onye ntaakụkọ anyị zigara kwuru na ọdụ ahịa ahụ a gbachiri maka ndị na-arụpụta ihe adịgboroja metụtara ndị aka ha nwereike ịdị ọcha.

Ọ kwuru na otu nwaanyị dị ya nwụrụ ọhụrụ na-ere akwa n'ime ọdụ ahịa ahụ bere akwa arịrị etu mgbachị ụlọ ahịa ahụ si metụta ezinaụlọ ya.

Mgbe ọ na-ebe akwa, nwaanyị ahụ ekweghị ka a gbaa ya ajụjụ ọnụ mana o kwuru na "akwamozu di m" bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2025 ma jụọ "kedụ ka mụ na ụmụ m ga-esi rie nri tupu akwamozu di m eruo".

Nwaanyị ahụ na-arịọ ka a hapụ ọtụtụ n'ime ha bụ ndị na-adịghị ere ihe adịgboroja ka ha gaa zụọ ahịa.

Ihe ndị ọzọ anyị chọpụtara

Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ndị ahụ na-ere ọgwụ na nri adịgboroja weere mpaghara ogbe n'ime ahịa ahụ dịka ebe ha na-arụpụta ajọ ihe dị icheiche.

Ebe ahụ dị n'ime ime ahịa bụ ebe ọtụtụ mmadụ na-azụkwa ahịa dị icheiche dịka ndị na-ere akpa.

Ọ chọpụtara na ndị ahụ na-ere ihe adịgboroja na-amaja ndị agbataobị ha na-azụ ahịa ma na-eyi ha egwu.

O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ ọ chọrọ ịgba ajụjụ gbasara ihe na-eme n'ime ahịa ahụ ekweghị ekwu okwu maka na ha na-atụ egwu maka ndụ ha.

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị "anyị maara na ha na-arụpụta ihe adịgboroja dị icheiche ma na-eresị ya ndị ọgaranya na-azụ ahịa n'ime ahịa bụ ndị na-ekpuchi ha".

"Ha na-eresị ya ndị nwere nnukwu ahịa n'ime ọdụ ahịa Eziukwu. Ndị ọrụ nchekwa maara ihe ha na-eme. Ọtụtụ oge, e jidechaa ha, a na-atọhapụ ha"

"Anyị enweghị ntụkwasịobi n'ebe ndị ọrụ nchekwa nọ maka na ọtụtụ oge ị gbaara ha ama, ndị na-arụpụta ihe adịgboroja ahụ ga-anụ ya".

Onye ntaakụkọ anyị hụrụ na ndịagha Naịjirịa si na 144 battalion dị n'Okpuru ọchịchị Ụkwa West kpachiri ọdụ ahịa ahụ ma na-eme ka ndị ọzọ ụlọ ahịa ha dị n'ime ahịa ahụ hara ịbanye n'ime ya kemgbe ụlọọrụ NAFDAC machiri ọtụtụ n'ime ya.

Oge NAFDAC gbachiri ụlọ ahịa ruru 150 n'Aba maka ire ọgwụ adịgboroja

Ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) gbachiri ụlọahịa ruru otu narị na iri ise n'ime ọdụ ahịa a ma ama n'Eziukwu Aba nke dị n'ime Abịa Steeti.

Dịka ụlọọrụ NAFDAC siri depụta n'akara ọbaozi X, ha hụrụ ọgwụ adịgboroja ruru ijeri naịra ise mgbe ha gara n'ọdụ ahịa ahụ.

Ndị NAFDAC wakporo ọdụ ahịa ahụ n'abalị 16 nakwa abalị 17 nke ọnwa Disemba 2024, ma mebie ọtụtụ ihe adịgboroja ha na-arụpụta.

Ihe ha mebiri gụnyere ọgwụ adịgboroja, ihe ọṅụṅụ, mmanya dị icheiche na-aba n'anya, na ihe nri e megharịrị dịka 'noodles', mmiri ara ehi, nakwa yogọt.

Ihe niile NAFDAC mebiri ruru ijeri naịra ise n'ọnụ ego.

Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC na-ahụ maka ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ Martins Iluyomade kwuru na e jirila ire ọgwụ na ihe adịgboroja mara ahia ahụ.

O gosikwara mwute banyere ihe na-eme n'ahịa ahụ n'agbanyeghị na ndị isi otu jịkọrọ ndị ahịa na ụlọọrụ NAFDAC nwere nkwekọrịta ịkwụsị ire ihe adịgboroja n'ahịa ahụ n'ọnwa Disemba afọ 2023.

Ọkankuzi Mojisola Adeyeye dọkwara aka na ntị si na ụlọọrụ NAFDAC agaghị anabata ụdịrị ajọ agwa ahụ ma kwuo na ha ga-ewere ikike niile ha were kwụsị ire ọgwụike n'ahịa ahụ.