New Naira Scarcity: Ihe ndị mmadụ na-agabiga n'ihi ụkọ ego naịra
- Onye dere ya, Makuochi Okafor
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Ebeg o si, Lagos
Iji gosipụta ụdịrị ihe ndị mmadụ na-agabiga n'oge a ụkọ ego Naịra na-aga n'ihu na Naịjirịa, otu onye ntaakụkọ BBC na Legọs steeti sere onwe ya onyonyo site n'ụlọ ya, banye n'okporoụzọ ebe ọ nwara ịchọọ ego naịra ma ruo n'isi njedebe njem ya bụ ụlọọrụ ya.
Ihe onyonyo gosipụtara etu ya bụ nwaamadị siri taa oke ahụhụ n'atụmatụ ịchọta ego narịa nke na-akọ ugbua.
Ụlọakụ etiti machiri iji ego ochie Naịra azụ ahịa na Naịjirịa dịka emegharịchara ego ọhụrụ Naịjirịa nke a malitere ikesa n'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba 2022.

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Onyeisiala Muhammadu Buhari n'izu gara aga nyere iwu ka ọha ndị malitezie iji ego ochie N200 azụ ahịa dịka ihe isi ike ya bụ uko ego matara mere ya ọgbagara dapụta n'akụkụ Naịjirịa dị ịche ịche.
Buhari nakwa onyeisi Ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele kwuru na atụmatụ imeghari akwụkwọ ego Naịjirịa ugbua bụ iji hụ na ebelatara nsogbu enweghị ezi nchekwa (ọkachasi n'aka ndị ntọ nakwa iyi ndụ egwu), mfesa ego naịra adigboroja, nrụrụaka nakwa ihe ịkwalite akụnụba Naịjirịa.
Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla ya bụ atụmatụ dịka ụfọdụ ndị gọvanọ buuru okwu a gaa ụlọikpe kachasị.
Ndị mmadụ ekwukwala na ya megharị ego a ga-emetụta ntuliaka dịka ya bụ ihe emeela ndị mmadụ a nọrọ n'ọnọdụ dị egwu nakwa mee ka ọgaghara dapụta n'ebe dị iche iche n'oge nkwado ntuliaka a.
A ka na-eche ka ụlọikpe mee mkpebi n'okwu mana ka nke a na-aga n'ihu, ọtụtụ ụmụ afọ Naịjirịa na-eti mkpu akwa n'ihi ahụhụ ha na-ata site na enweghị ego naịra nke gụnyere inweghi zute nri, enweghị ike zụta mmanụ ụgbọ ala, enweghị ike mee njem gaa ọrụ, enweghị ike zuo maọbụ rie ahịa nakwa ihe ndị ọzọ.


