Etu ndị uweojii si nyochapụta ebe ndị omekome na-emepụta ogbunigwe n'Ebonyi steeti

Akụkọ si Obodo Obegu nke Ebonyi steeti akọwal etu ndị uweojiri siri nwụchie otu nwoke a sị bụ onyeisi otu omekome na-akpa ike na steeti ahụ dịka ha nnyochapụtara ogege ebe a sị ndị omekome ahụ na-edobe ma na-emepụta ogbunigwe.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti abụ Chris Anyanwu gwara BBC Igbo na ya bụ ndị omekome bụ “ndi otu Ipob/ESN”.

N’ozi o zipụtere, ọ kọwara na nnyochapụta ogige a zoro ezo bụ site na njịkọ aka ọnụ ndị ọrụ nchekwa nakwa etu ha siri gba mbọ ma imi n’ala n’ọrụ ha.

Anyanwu kwuru na ha na ndị omekome ahụ kwakọritara mgbọ dịka ha gburu mmadụ abụọ n’ime ha, nwụchie onyeisi ha dịka ndị ọzọ bu apa mbọ egbe gbaa ọsọ.

O kwuru na ụfọdụ ndị uweojii merụrụ ahụ na mwakpo a mana enweghi onye n’ime ha nwụrụ.

O kọwara na ọ bụ site na ama ya bụ onyeisi ndị a nwụchiri ka ha ji wụba ogege a ebe ha hụrụ ọtụtụ akụrụngwa nakwa kemịkalụ e ji arụ ogbunigwe, uwe gosiri njiri mara ndị otu Ipob, ọtụtụ ọgwụ, egbe, uwe ndị uweojii Naịjrịa, uwe ndị agha, ụgbọala a na-eche e zuru ezu nakwa ihe ndị ọzọ.

Na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ Channels TV mere n’ụtụtụ Fraịdee, Anyanwu kọwara na akụrụngwa ndị nakwa kemịcalụ ndị ahụ dị oke ire nke bụ na atụ ya na ‘ọ nwereike ikpochapụ otu mpaghara n’otu mgbe.’

Ugboro ugboro, ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa eboola ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ịnọ n’isi tigbuo zọgbuo na-ada n’akụkụ Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mana Ipob na-apụta na-agọpụ onwe ha n’okwu a.

Cheta na n’afọ 2017, gọọmentị Naijirịa machiri otu a ma kpọpụta ha dịka otu na-akpata ọgbaghara.

Ọtụtụ mwakpo, ntọrọ, nakwa ogbugbu ndị mmadụ malitere ịda n’akụkụ dị iche iche n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kemgbe afọ ole m ole gara aga.

Na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, a malitere iwakpo ndị ọrụ gọọmentị, ụlọọrụ gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa, ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ebe ndị ọzọ.

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'pob nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a.

A nwụchịrị onyeisi otu a bụ Nnamdi Kanu n’afọ 2021 maka ọtụtụ ebubo nke gụnyere ikpa nkata ikwatụ ọchịchị Naịjirịa, iyi ndụ egwu nakwa ihe ndị ọzọ.

Kanu ka nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.

Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.

Ikpe ya ka na-aga n’ihu n’ụlọikpe ugbua.