You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ọhụrụ Dave Umahi kwuru maka Nnamdi Kanu, Ipob, 'unknown gunmen'...
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola okwu ọhụrụ banyere tigbuo zọgbuo na-ada n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma rụọ ndị otu 'unknown gunmen' aka.
Ọ dụrụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra ndụmọdụ ka ha chegharịa echihe n’usoro ọchụchọ ha ma kwuo na ndị otu ji egbe na ndị ekperima ‘Unknown gunmen’ dị icheiche na-ezozi n’azụ atụmatụ nnwereonwe a, ọkachasị nke Nnamdi Kanu ma na-akpata tigbuo zuọgbuo n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
O kwuru na ndị ojiegbe anapụla Kanu ya bụ atụmatụ ma were ya eme he sọrọ ha.
Umahi kwuru okwu a n’emume ya ndị ụmụnwaanyị ajadu nakwa ndị okenye steeti ahụ mere n’ama ọgbakọ nke Ecumenical Centre, Abakaliki bụ isi obodo steeti ahụ taa bụ Tọọzde abalị 15 nke ọnwa Disemba, 2022.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ọ gara n’ihu kwuo na dịka onyeisioche otu ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na okwubuola ugboro ugboro na ọ kwadoghị atụmatụ achọchọ a ma kwuo na ọ dọrọ ndị na-achọ nnwereonwe a aka na ntị maka etu ya bụ ihe nwereike isi kpata ọgbaghara mgbe ahụ.
Umahi kwukwara na etu ihe siri agazị ugbua a na-ewute ya ọkachasị dịka ọtụtụ ndị mmadụ kwadoro atụmatụ a na mbido ya tupu ndị ojiegbe ewerezie ya na-eme ihe sọrọ ha.
O kwuru:
“Anyị na-aghọrọ mkpụrụ ihe anyị kụrụ. Mgbe ndị a malitere atụmatụ iji ọgbaghara n’okwu nnwerenwe a, ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa guzoro megide ya, mana ọtụtụ ndị mmadụ malitere na-akwado atụmatụ a. A gwara m ha na okwu a ga-agafee atụmatụ Nnamdi Kanu.”
Ọ gara n’ihu kwuo
“Ugbua, ọ gafeela atụmatụ Nnamdi Kanu, a na-ahụtazị ndị otu Ipob na ESN ọbụla dịka ndị omekome.”
Ugbua, anyị enwela otu ndị omekome ọzọ a na-akpọ ‘Ekpe’, Ọ bụ ihe a bụ Biafra anyị na-achọ? Anyị na-egbusi onwe anyị ugbua na-ata ndị ọzọ ụta”
Nke a mere anyị jiri kwusie ike mgbe ọgbaghara a na-adasi ike, na Ebonyi steeti agaghị esonye na Biafra, ọ bụrụ na Biafra ga-abụ ebe a na-egbu ndị na-emeghị ihe ọbụla ma bụrụkwa ebe a na-amanye iwu nọdụ n'ụlọ.”
“Ndị mmadụ ebibiela gburugburu Ọwụwa anyanwụ Naijirịa maka okwu na-anaghị amịta mkpụrụ.”
Umahi gwara ndị Ebonyi ka ha ghara ịla azụ n'ịkpọ akara ekwentị ndị ọrụ nchekwa ma ha hụ ihe ọbụla dị aṅaa, ka ha nwee ike na-anwụchi ndị na-akpa ike ndị a.
O kwukwara:
“Ana m adọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị bụ ndị n’ime ha na-eji ndị omekome a arụ ọrụ... ma na-akwadokwa ogbugbu ndị ọrụ nchekwa Ebubeagu”.
Cheta na ndị Ndị ojiegbe wakporo ahịa Nwakpu nke dị n’obodo Ndufu Alike okpuruọchịchị Ikwo n’Ebonyi steeti taa bụ ụbọchị Wenezde abalị 14 nke ọnwa Disemba, 2022.
Ndị ojiegbe ahụ gbagburu otu nwoke n'ahịa ahụ dịka otu n’ime ndị isi otu nchekwa nke Ebubeagu na steeti a bụ Maazị Friday Nnanna Ujor siri gbaa ama ma kwuo na ya bụ ihe mere n’ebe elekere 12 nke ehihe.
Ọnọdụ enweghi ezi nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa
Nsogbu enweghị ezi nchekwa ka bụ nnukwu okwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ruo ugbua. Ọnọdụ a maliter na-arị elu kemgbe afọ 2021. Nke a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa, ogbugbu ndị uweojii na ndị agha, ntọrọ mmadụ na ihe ndị ọzọ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'Indigenous People of Biafra', nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a.Mana Ipob ekwuola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha maka na ha abụghị otu na-achọ ọgbaaghara.
Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa boro Mazi Kanu ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu nakwa onye na-achọ ịkwatu ọchịchịonye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.