You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebuka Obi, Odumeje, Mbaka, Jerry Eze na ndị ọzọ buru amụma banyere afọ 2025
- Onye dere ya, Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Kwa mbido afọ ọhụrụ ọbụla, otu ihe ndị ụka kraịst n'Afrịka gbaa gburugburu na-atụ anya ya bụ amụma dị iche iche ndị ụkọchukwu na-ewepụta.
Ekpere na ibu amụma bụ otu ihe a na-emekarị n'ụlọụka dị iche iche na ngwụcha afọ ọbụla na Naịjirịa, Ghana nakwa mpaghara Afrịka ndị ọzọ.
N'agbanyeghị na ndị ọchịchị adọọla aka na ntị banyere etu ụfọdụ ndị ụkọchukwu si ewepụta amụma ndị a, mana ihe ka dị etu ọ dị.
Afọ 2025 adịghịkwa iche dịka ọtụtụ ndị ụkọchụkwu wepụtara amụma dị iche iche banyere afọ 2025.
Fada Ejike Mbaka
Onyeisi ụlọụka Adoration Ministry Enugu Nigeria bụ Rev Fr. Ejike Mbaka buru amụma dịka o doro ụka n'abalị Tuzde 31 Disemba, 2024 n'ogige Adoration Ministry dị n'Enugwu.
Okwuru na afọ 2025 ga-abụ afọ siri ike mana agbanyeghị nke, ndị nke kraịst ga-enwe mmeri pụrụiche.
O kwuru n'ọtụtụ ezinaụlọ ga-abụ ndị ihuọma kpọrọ n'afọ a.
N'okwu ya "Ihe nwereike isi ike n'afọ a, mana chukwu ga-eme ka gị na ezịnaụlọ ụlọ gị turu ugo ma bụrụ nd mmeri.
Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere
Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere nke ụlọụka Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry dị n'Onitsha, Anambra, buru amụma ma kwuo na afọ 2025 bụ afọ mmeri nye ndị nke kraịst.
O kwuru na enweghị mgbọ maọbụ mkpagbu ọbụla nke ekwensu kpara nkata ya ga-abịa na mmezu.
Pastọ Enoch Adeboye
Pastọ ụlọụka Redeemed Christian Church of God, (RCCG) bụ Pastọ Enoch Adeboye onye e ji Daddy GO mara, buru amụma maka ndị mmadụ, mba Naịjirịa, ahụike nakwa ọnọdụ akụnaụba.
O kwuru na afọ 2025 ga-abụ afọ oziọma.
Ọ gbara ama na chukwu ga-aza ekpere ma mezuo ebumnobi ọtụtụ mmadụ n'afọ 2025.
Ọ gwara ndị bịara ọgbakọ ahụ e mere na Redemption City, chukwu ga-ahicha ha anya mmiri ma mee ihe ịrịbaama na ndụ ha.
Onye amụma Chukwuebuka Obi
Onye amụma Chukwuebuka Obi nke ụlọụka Zion Prayer Movement Outreach kwuru na afọ 2025 bụ afọ chukwu ga-eme ihe ịrịbaama na ndụ ndị kwenyere na ya.
O kwuru na chukwu ga-azụpụta ma nweta nwereonwe nye ọbụla e kwere agbụ.
Amụma ndị ọzọ o buru gụnyere inweta ihe zuru oke, ịmụta ụmụaka nye ndị na-achọ nwa, agamnihu ezịnaụlọ, azụmahịa nakwa amụma ndị ọzọ.
Pastọ Jerry Eze
Bishọpụ David Oyedepo
Onyeisi ụlọụka Living Faith Church bụ Bishọpụ David Oyedepo buru amụma ngozi n'isi ndị niile bịara ụka abalị e mere na Canaanland dị n'Ogun steeti.
O kwuru na ọ bụ okwukwe ndị nke kraịst ga-eme ka okwu niile chukwu kwuru n'isi ha mịta mkpụrụ,
Ọ gara n'ihu buo amụma si na afọ 2025 ga-abụ afọ nturu ugo. O kwuru na nkata ọbụla ndị ọjọ na-akpa, ga-aghasa ma bibie.
"Atụmatụ ọbụla chọrọ imegide ọdịmma gị ga-akpụ afọ n'ala, ihe inwere ga-amụbawanye", ka o kwuru.