You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Foto gosiri ndụ Buhari dịka onyeisiala n'ọchịchị ndịagha na ọchịchị onye kwuo uche ya
- Onye dere ya, Wedaeli Chibelushi
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Ndụ Muhammadu Buhari sochiri mgbanwe dị egwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Naịjirịa n'ime afọ iri ise gara aga.
Onye ahụ bụbu onyeisiala Naịjirịa, nwụrụ n'ụbọchị Sọnde oge ọ dị afọ 82, ọ bụ onye ọchịagha chịburu mba Naịjirịa ka akwaturu ọchịchị mana ndị ọchịchị ọhụrụ tụrụ ya mkpọrọ.
Ọ laghachitere ọtụtụ iri afọ iji nweta ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka nke ọchịchị onyekwuouche ya.
Foto esetere Buhari n'afọ 1977 ebe ya na onye bụbu Eze mba Sweden Carl XVI na Sheikh Ahmed Zaki Yamani nke mba Saudi Arabịa nọ n'afọ 1977 - ọ malitere ọrụ dịka onye otu ndịagha ka ọ gụchara ụlọakwụkwọ.
Mgbe obere oge gachara, n'afọ 1983, ndịagha kwaturu ọchịchị Shehu Shagari bụ onyeisiala.
Buhari nọ n'aka nri ebe osote ya na-ịzọ ọkwa onyeisiala bụ Chuba Okadigbo nọ n'aka ịkpe nakwa onyeisioche ọtụ ndọrọndọrọ ọchịchị ANPP bụ Don Etiebet
Olusegun Obasanjo meriri Buhari na ndọrọndọrọ ọchịchị afọ 2003 mana ọzọkwara ọchịchị ọzọ n'afọ 2007 na 2011 mana ọ dakwara
Buhari kacha ewu ewu na mpaghara ugwu Naịjirịa, ebe a muru ya.
N'ebe a, akara na-e osipụta n'obodo Kaduna n'oge ntuliaka 2015, na-agwa ndị na-agafe agafe na ndị obodo ga-atụnyere naanị "Baba" Buhari.
Emechara họpụta Buhari dịka onyeisiala n'afọ 2015, ma merie onyeisiala Goodluck Jonathan nọ n'ọchịchị.
Aha ya banyere n'akụkọ ihe mere eme, dịka ọ bụrụ onye mbụ nọ na pati mmegide meriri na ntuliaka dịka onyeisiala.
Ọ bụ ezie na Buhari weere ọrụ dịka ọchịagha, mana ọ gọrọ agọ na ya so kpaa nkata iweghara ọchịchị n'ike mana akụkọ ndị ọzọ kọwaara Buhari dịka onye gbara ezigbo mbọ iweghara ọchịchị n'ike.
Dịka e wepụrụ ya mgbe ọ chịrị afọ abụọ ma tinye ya n'ụlọmkpọrọ maka iji aka ike soro ndị nrụrụaka na imejọ ikike mmadụ, Buhari zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2003 site n'ọchịchị onyekwuouche ya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Nigerian Peoples patị (ANPP)
Ka o were ọrụ dịka onyeisiala, oge mbụ ya n'okwa butere nsogbu dịka akụnaụba Naịjirịa malitere ịla azụ oge mbụ kemgbe afọ iri.
Ihe gbasara nchekwa nke mba Naịjirịa malitere ịjọ njọ mana mgbe nwaanyị ya katọrọ gọọmenti ya, iwe were Buhari o jiri kwuo na nwannyi ya kwesiri ịno n'ime ụlọ ngwa nri bụ kichin.
N'agbanyeghị nsogbu o nwere n'oge ọchịchị ya mbụ, a họpụtara Buhari ọzọ n'afọ 2019. Dịka onyeisiala, ọ gara ụwa niile, na-aga nzukọ ndị dị elu ma zute ndị isiala ibe ya.
Ezenwaanyị Briten, Queen Elizabeth na-ekele Buhari n'ọgbakọ ndị isi Commonwealth na 2015.
N'afọ 2015, Onyeisiala Amerịka bụ Barack Obama nabatara Buhari n'obi ochịchị mba ahụ bụ White House.
N'afọ 2018, Buhari bụ onye ndu mbụ si na mpagahara Afrịka zutere onyeisiala Donald Trump n'isi obodo Washington.
Buhari na-akpọbata Christine Lagarde, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ nke International Monetary Fund
Nke a bụ onyeisiala Muhammadu Buhari mgbe ọ na-apụ n'ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 2023.
N'oge ọnwụ ya n'ụlọọgwụ dị na Lọndọn, ụfọdị ndị mmadụ na-echeta Buhari dịka nwoke imejupụtaghị nkwa o kwere ụmụafọ Naịjirịa, ndị ọzọ ga-echeta ya dịka onye gbara mbọ ka ike ya dị n'agbanyeghị ka ihe siri dị.
Jonathan kọwaara Buhari dịka onye "na-adịghị achọ ọdịmma nke onwe ya na-ọrụ ma jere obodo ya ozi n'ọdị ịhụ mba n'anya".
Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi.
Soro anyị na BBCIgbo.com maka akụkọ ndị ọzọ.
Sonyere anyị na Facebook BBC News Igbo, WhatsApp Chanelụ BBC News Igbo nakwa Instagram bbcnewsigbo