Charles of Play: Ihe mere m ji arụgharị ejije ndị mgbe ochie ka ọ bụrụ nke ọgbara ọhụrụ
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Abuja
Charles Okpaleke a ma dịka Charles of Play bụ onye hiwere ụlọọrụ Play Network Studio akọwaala etuo si malite njem ime ihe ejije.
Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Okpaleke sị na ndị mmadụ na-akatọ ya kemgbe maka ụdịri ihe onyonyo ọ na-ewepụta bụ ịrụghari ndị ochie.
Mana ọ kọwara ihe kpalitere mmụọ ya ime nke a, na-ekwu na ọ bụ iji chekwaa ihe onyonyo ndị ahụ maka ndị ntọroọbia iji ya mụta ihe.

Ebe foto si, @CharlesofPlay/Instagram
Ọ kwukwara na ọ dị mkpa ịmepụta onyonyo gosiri akụkọ oge gboo ka ndị mmadụ nwee ike mara ebe ha si.
Ọzọ, ọ duru ndị mmadụ na-etolite chọrọ ị dị ka ya ndụmọdụ gbasara ihe ha ga-eme.
"Were nu egwu debe n'okpuru gi, ma gaa n'ihu gosi ụwa ihe ị nwere ike ime" ka ọ gwara ha.
Gee ihe ndị a na okwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ n'ihe onyonyo a n'uju;



