Ihe mere m ji azọ ọkwa onyeisioche n'Abuja - Eze Onyebuchi
Ihe mere m ji azọ ọkwa onyeisioche n'Abuja - Eze Onyebuchi

- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Onyebuchi Eze ji pati APGA azọ ọkwa onyeisioche 'Abuja Municipal Council' (Amac) nke FCT na ntụlikaka a ga-eme na abalị iri abụọ na ọtụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026 akọwaala ihe mere oji azọ ọkwa na Abuja dịka onye Igbo.
O kwuru na obi na Abuja, ọ na-azụ ahịa nakwa na-eme ihe niile, nke mere ọchịchị Amac kwesịrị igbasa ya.
"A ma m na ọbụghị asụsụ, ọ bụghị ebe mmadụ si maọbụ ebe a na-ekpere chi bụ ihe bụ nsogbu anyị, nsogbu anyị bụ na ndị ọchịchị achọghị ime ihe ha kwesịrị ime"
Onyebuchi sị na ya banye ọchịchị ọ ga-eweta nlekọta ahụike n'efu nke ụmụnwaanyị iji beleta ma kwụsị ọnwụ ụmụnwaanyị n'anwụ ma ha ga ịmụ nwa.
O gara n'ihu kwuo na ọ ga-eweta agụmakwụkwọ n'efu maka ụmụakwụkwọ.



