'Mụ na enyi m nwaanyị nwere mmekọ n'ụlọnkwari na Chaịna, mechaa chọpụta na e kesara ya n'intanet dịka ọ na-eme'

E sere Eric na Emily site n'azụ
Nkọwa foto, Eric na Emily anaghị apụapụ na-ejighị okpu n'ihi egwu na mmadụ nwere ike icheta ihu ha.
    • Onye dere ya, Wanqing Zhang
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Global China Unit and Eye Investigations
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Otu abalị na 2023, Eric na-ekiri vidio na soshal midia ebe ọ na-ekirikarị ndị na-edina onwe ha, n'oge adịghi anya, ọ kpọnwụrụ.

Ọ chọpụtara na nwoke na nwaanyị ọ na-ekiri dịka ha na-abanye ime ụlọ, dobe akpa ha ma malite idina onwe ha - bụ ya na na enyi ya nwaanyị.

Izuụka atọ gara aga, ha rahụrụ n'otu ụlọ oriri na nkwari dị na Shenzhen dị na mpaghara ndịda mba Chaịna, mana ha amaghị na ọ bụghị naanị ha nọ

Igwe kamera e zoro n'ime ụlọ oriri na nkwari ahụ, setere ha dịka ha na-enwe mmekọ nwoke na nwaanyị, ma kesaa ya nye puku kwuru puku ndị mmadụ banyere na chanelụ ahụ nke Eric ji ekiri ndị na-edina onwe ha.

Eric (nke a abụghị ezigbo aha ya) abụghịzi onye na-ekiri ndị na-edina onwe ha e setere na nzuzo na Chaịna, ọ bụrụla onye o metụtara.

Ihe a kpọrọ 'spy-cam porn' bụ ihe dị na mba Chaịna kemgbe afọ iri gara aga, na-agbanyeghị na ikesa vidio ndị na-edina onwe bụ ihe iwu mba ahụ kagburu.

Mana n'ime afọ ole na ole gara aga, okwu a abụrụla ihe a na-ekwu maka ya na soshal midia, ebe ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị - kwuru etu ndị mmadụ ga-esi chọpụta kamera n'agbanyeghị etu ọ ha. Ebe ụfọdụ chepụtara ụzọ nke ha iji gbochie ka a ghara ise ha na nzuzo.

N'ọnwa Eprel gara aga, atụmatụ ọhụrụ gọọmenti gbara mbọ ịmachi agwa a - nke gụnyere ka ndị nwe ụlọ oriri na ọṅụṅụ na-eme nnyocha iji chọpụta ka e nwere kamera e zoro ezo.

Mana ihe na-ebe ka na-ebe. BBC chọpụtara na ọtụtụ kamera nzuzo sere ndị na-edina onwe n'ụlọ oriri na nkwari n'ọtụtụ webụsaịt na Chaịna.

Foto e mepụtara iji gosi etu ime ụlọ oriri na nkwari. Igbe akwa ojii, ọkụ nakwa akwa e ji ehi ụra nakwa okwu REC e dere n'elu ọkụ ahụ.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụfọdụ n'ime ihe ndị ka e kesara n'akara e ji eziga ozi a kpọrọ Telegram. Kemgbe ọnwa 18 gara aga, achọpụtara m webụsait isii na-akwalite na na-ekesa, nke ihe ruru ụlọ oriri na nkwari 180 kwuru na ha nwere kamera nzuzo na-ese ma na-ekesa ndị na-edina onwe ha.

Emere m nnyocha n'ime ụlọ oriri na nkwari ndị a kwa mgbe kwa mgbe n'ime ọnwa asaa ma chọpụta ihe kamera 54 sere.

BBC chere na ihe nke pụtara bụ na o seela ọtụtụ puku ndị ọbịa nke a bụ site na etu o si arụ ọrụ. Ụfọdụ ndị amaghị na a na-ese ha.

Eric, si Hong Kong, malitere ikiri ndị na-edina onwe ha kemgbe ọ dị na nwata maka na vidio ndị ahụ bụ nke na-eto akpịrị.

"Ihe mere ka m malitere ikiri ya bụ maka na ndị ahụ amaghị na a na-ese ha".

Mana ugbua, Eric ahụla na ọ bụghị ka ụda akụilu si ada na ntị ka o si atọ maka na ọ hụla vidio onwe ya na enyi ya nwaanyị "Emily" - nke mere ka ọ ghara inwe mmasị ikiri ndị na-edina onwe ha.

Oge ọ gwara Emily na ihe onyonyo gosiri ebe ha dinara onwe ha n'ụlọ oriri na nkwari agbaala n'anwụ, o chere na ọ bụ ihe njakịrị. Mana oge ọ hụrụ vidio ahụ, akpataoyi nwụrụ ya.

Emily malitere ịtụ egwu maka na ndị ọrụ ya na ezinaụlọ ya nwereike ịhụ ya. Nke a mere ka ya na Eric ghara ikwu okwu ruo ọtụtụ izuụka.

Mana ajụjụ a na-ajụ bụ, kedụ ndị aka ha dị n'ajọ agwa nakwa etu ha si atụ mgbere vidio ndị na-edina onwe ha?

Otu onye a ma ama na-atụ mgbere spy-cam na-ese ndị na-edina onwe ha m hụrụ bụ onye a maara dịka "AKA".

Abịara m dịka onye chọrọ ịzụ ya ahịa, akwụrụ m ụgwọ iji nweta ohere kirie otu webụsaịti na-egosi ndị na-edina onwe ha - akwụrụ ego Yuan 450 ($65, £47).

Ngwa ngwa m banyere, enwere m ohere íhóró otu n'ime ihe ngosi ise ,nke ọbụla n'ime ha bụ na-egosi ọnụ ụlọnkwarị dị iche iche- nke na-egosi ngwangwa onye biara ihi n'ụlọnkwarịrị gbanyere ọkụ latrik site itinye kaad e ji akpọpe ụzọ.

I nwere ohere ibidokwa ihe nkiri ahụ n'isi maọbụ miri ya.

Ọnụụlọ Ụlọnkwari abụọ gosiri oge dịka BBC debanyere aha na chanelụ ahụ, fO gosikwara ebe akwa abụọ dị.

A machiri Telegram na Chaina mana ọtụtụ ji ya akpa arụ- dịka onye ji ya ekesa ozi banyere ihe onyonyo ndị gba ọtọ.

Oge anyị na-eme nnyocha, anyị chọpụtara otu ọwara ozi dị na Telegram nwere ihe ruru mmadụ 10,000.

Ndekọ ihe onyonyo o nwere bụ ihe ọ na-ere na Telegram. Ahụrụ ihe onyonyo ruru 6,000, ụfọdụ n'ime ha bụ nke e sere n'afọ 2017.

Ndị na-eso AKA na-ekiri ihe onyonyo ndị a nke ndị nwe ha amaghị na a na-ese ha, ha jiri ha akọ akụkọ maọbụ agba asịrị banyere nkata ndị ahụ na-akpa, nakwa etu ha si mee mmekọ.

Ndị ahụ malite mmekọ, ha aṅụrịwa, ha gbanyụọ ọkụ, ha atamuwe.

Anyị chọrọ kamera ahụ gaa otu ụlọnkwarị dị na Zhengzhou, n'etiti Chaina site n'ozi anyị nwetara site na nchọpụta anyị mere.

Ndị nnyocha nọ ebe ahụ banyere n'ọnụụlọ ụlọ nkwari ahụ hụ kamera e doro ihu ya ebe akwa dị, zoo ya ezo ebe mpịọ ikuku si abata ,ebe e ji tara ya na waya ọkụ latrik.

Aha onyonyo, Watch: The moment the BBC finds a spy-cam hidden in a hotel room

Kamera e zoro ezo bụ nke a na-ere naintanet A hidden-camera detector, widely sold online as a "must-have" for hotel guests, gave no warning they were being spied on.

The team disabled the secret camera and word spread quickly on Telegram.

"Zhonghua [name of the camera] got taken down!" one subscriber wrote on the main channel managed by AKA.

"It's such a shame; that room has the best sound quality!" AKA responded in the chat.

But the complaints turned to celebration when, within hours, AKA posted that a replacement camera in a different hotel had been activated.

"This is the speed of… [our livestreaming platform]," AKA told his subscribers. "Impressive right?"

N'ọnwa 18 anyị mere nnyocha anyị, anyị chọpụtara ọtụtụ dịka AKA

Ụdị nkata ha na ndị chọrọ ha -na-akpa gosiri na o nwere ndị ha na-arụrụ ọh bụ ndị ha na-akpọ "ndị nwe kamera."

Ndịa dịka ndị agenti si kwuo, bụ ha na-adọnye kamera n'ụlọnkwari.

Oge anyị na AKA na-akpa, na amaghị ama, o zitere anyị ozi si n'aka onye ọzọ bụ onye ọ sịrị na ya nwe kamera nke aha ya ya bụ "Brọda Chun"

AKA hichapụrụ ozi ahụ ozigbo ma jụ ikwu maka ya. Anyị gbalịrị kpọọ Broda Chun

Na-agbanyeghị ihe akaebe anyị nke gosiri na ọ bụ ya na-enye AKA ihe onyonyo ndị gba ọtọ ọ na-ekesa na websaịtị, Broda Chun kwuru na ya bụ onye ahịa na-ere ya ere, na ọ bụghị ya nwe ya.

Ihe doro anya bụ na ego dị na ya bụ ihe.

Ị gụkọọ ego idebanye ah, BBC na-eche na AKA na-enweta opekata mpe ego dị 163,200 Yuan ($22,000, £16,300) kemgbe ọnwa Eprelu.

Ego ndị mmadụ na-eri n'ụgwọọnwa na Cahina kwa year bụ 43,377 Yuan ($6,200, £4,600), dịka ụlọọrụ ngụkọ "China's "Bureau of Statistics".

Iwu jichiri ire kamera nzuzo mana anyị chọpụtara na ọ dị mfe ịzụta ya n'ahịa.na Huaqiangbei.

Blue Li, onye ụlọru na-abụghị nke gọọmentị a kpọrọ RainLily - bụnke na-enyere ndị e sere na nzuzo aka sị na inweta ihe akaebe siri ike.

Telegram azanubeghị oku RainLily ka e wepụ ihe onyonyo .

Li sịrị,"Anyị kwenyere n'ụlọọrụ teknụzụ bụ ndị ọdị n'aka ịigbo ọgụ na nsogbu a ọbaozi. Iwu naekwu ma ozi ewpụtara ọ ga-ekesa ka ọ gbaghị ekesa."

BBC gwara ụlọọrụ Telegram, na AKA na Brọda Chun - na otu ha na-achịkọta- na-ekesa ihe onyonyo ndị gba ọtọ n'ọbaozi ha mana o nweghị he ha sara nke ha na-eme ihe ọbụla.

Oge anyị zigara ha ozi ọzọ ka abalị iri gachara, Telegram gwara anyị sị, "Telegram machiri izirịta ihe onyonyo ndị gbatọ nke ndị nọ na ya enweghị nkwekọrịta ikesa ya. anyị na-enyocha ihe na-aga n'ọba ozi anyị ma na-anabata mkpesa ihe adịghị mma iji wepụ ha."

Anyị zigara Brother Chun na AKA ihe anyị chọpụtara banyere etu ha si jiri ndị ọbịa amaghị ihe ha na-eme akpara ego.

Ha enyeghị ọsịsa ọbụla mana ha hichapuru akara Telegram ha ji ama ekwe inyonyo ndị gba ọtọ ha na-ere.

Mana websait AKA bụ ndị resiri m ohere ịbanye Chanelụ ya ka naeme ihe ọ na-eme.

Eric na Emily si na ihe ha gabighara ka na-awụ ha akpataoyii. Mgbe ọbụla ha na-eyi okpu n'ọha a dị ama ama o nwee onye chetara ihu ha site n'ihe onyonyo ahụ.

Ha na-agbakwara ịga ụlọnkwari ọsọ. Eric anaghịzikwa eji Telegram ekiri ndị gba ọtọ dịka o siri kwuo.

Mana ọ nọ nọ, ọ ga nyoo ka ọ mara ma ihe onyonyo ya ọ pụtara ọzọ.

Akụkọ a gbakwụnyere si n'aka Cate Brown, Bridget Wing na Mengyu Dong